Ịgba Àmà Dị Mma N’ụlọ Akwụkwọ
Site n’aka onye edemede Teta! na Mexico
MGBE Daniel, bụ́ nwa okorobịa dị afọ 17, malitere afọ agụmakwụkwọ ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ ya, o kpebisiri ike ime ka ụmụ klas ọhụrụ ya mara na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ohere ime nke a dapụtara mgbe onye nkụzi na-akụziri ha asụsụ Bekee gwara ụmụ klas ya ka ha gbaa onye mbịarambịa, nke asụsụ Bekee bụ asụsụ ala nna ya, ajụjụ ọnụ. Ihe a chọrọ ka ha mee bụ ịga ebe ndị mmadụ na-agakarị eleta na Mexico City, gbaa ajụjụ ọnụ ahụ, tinye ihe ha gbatara na teepu, ma weta ya na klas.
Daniel kpebiri ịgba otu onye ozi ala ọzọ na-asụ asụsụ Bekee ajụjụ ọnụ, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico. N’otu mgbe ahụ, o sere alaka ụlọ ọrụ ahụ vidio dị mkpirikpi, bụ́ nke o ji asụsụ Bekee kọwaa ihe ndị o setere. Ọzọkwa, o wetara broshuọ dị iche iche e bipụtara n’asụsụ ndị a na-asụ na Mexico, tinyere Ụlọ Nche na Teta! e bipụtara n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Mgbe ahụ, Daniel rịọrọ onye nkụzi ha ka o nye ya ohere ịkọwa ihe dị na vidio ahụ na ihe ndị ọzọ ahụ o wetara.
Ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ na Mexico tụrụ ụmụ klas ya na onye nkụzi ya n’anya. Ihe kasị masị ndị gere Daniel ntị bụ mgbalị Ndịàmà na-eme iji hụ na ozi ọma ahụ ruru ndị bụ́ ụmụ amaala Mexico ntị.
Mgbe Daniel jisịrị minit 25 kọwasịa ihe ndị ahụ, bụ́ nke ọ gbara onye mbụ na ya, o nyere ndị nile gere ya ntị Ụlọ Nche na Teta! nakwa akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Ọtụtụ naara akwụkwọ ndị ahụ, nke a emewokwa ka ha nwee ike inwekwu mkparịta ụka dabeere na Bible. Daniel kwuru, sị: “Ana m ekele Jehova na m ji obere ihe omume e nyere m ime n’ụlọ akwụkwọ wetara aha ya otuto.”