Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/13 p. 4-5
  • Otú Gị na Nwa Gị Ga-esi Na-ekwurịta Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Gị na Nwa Gị Ga-esi Na-ekwurịta Okwu
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE Ọ NAGHỊ ADỊ MFE
  • Otú I Kwesịrị Isi Na-agwa Nwa Gị Ihe Ọ Ga-eme na Ihe Ọ Na-agaghị Eme
    Teta!—2013
  • Nyere Nwa Gị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Aka Inwe Ọganihu
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Otú Gị na Nwa Gị Na-eto eto Ga-esi Na-ekwurịta Okwu n’Eseghị Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi
    Teta!—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 1/13 p. 4-5

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤAKA

Otú Gị na Nwa Gị Ga-esi Na-ekwurịta Okwu

IHE MERE Ọ NAGHỊ ADỊ MFE

[Foto dị na peeji nke 4]

Mgbe nwa gị dị obere, ọ na-agwa gị ihe niile. Ma ugbu a ọ ghọwara dimkpa, ọ naghị achọ ịkọrọ gị ihe ọ bụla. Ị jụọ ya ihe, ya agbachiere ụwa ya nkịtị. Ya jisie ike kwuo ekwuo, ya abụrụ okwu na ụka.

Ma, gị na ya nwere ike ikwurịta okwu n’udo. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe abụọ nwere ike ime ka ọ na-esiri ya ike ịkọrọ gị ihe ọ bụla.

IHE MERE O JI ESIRI YA IKE

Ọ chọrọ iji aka ya na-ekpebiri onwe ya ihe. Ọ bụ nwayọọ nwayọọ ka onye na-eto eto na-eji aghọ dimkpa ma nke a na-akọ, onye nwere ike iji aka ya na-ekpebi ihe ọ ga-eme. Ma, ụfọdụ ndị na-eto eto na-achọ ka a hapụ ha ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe niile ha chọrọ ime. Ndị nne na nna ụfọdụ anaghịkwa achọ ka ụmụ ha jiri aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ọ bụla. Ihe abụọ a nwechara ike ime ka ndị nne na nna na ụmụ ha na-ese okwu. Ezenwa,a bụ́ onye dị afọ iri na isii kwuru, sị: “Papa m na mama m anaghị ekwe m megharịa ahụ́. Ọ bụrụ na ha akwụsịghị ihe a ha na-eme, m ga-apụrụ ha ma m ruo afọ iri na asatọ.”

[Foto dị na peeji nke 4]

O bidola ichebara ihe echiche. A gwa nwatakịrị ihe, ọ na-ewere ya otú ahụ e si gwa ya. Ma, ọ bụrụ onye na-eto eto ka a gwara ihe ahụ, ọ gaghị ewere ya otú ahụ. Ọ ga-echebara ya echiche, mara ma ọ̀ bụ eziokwu. Nke a adịghị njọ n’ihi na ọ ga-enyere ya aka ịma otú ọ ga-esi na-ekpebi ihe ndị ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, otú ụmụaka si ele ihe e meziri emezi na ihe a na-emezighị emezi anya dị iche n’otú ndị na-eto eto si ele ya. Ọ bụrụ na mama ụmụaka abụọ anyawaa otu biskit, were otu nye onye nke a were otu nye onye nke ọzọ, obi ga-adị ha abụọ ụtọ na mama ha meziri ha emezi. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ndị na-eto eto si ele ihe e meziri emezi anya. Ị manụ na ọ bụghị mgbe niile ka ime mmadụ otú e mere ibe ya na-egosi na e meziri ihe emezi. Ichebara ihe echiche na-enyere onye na-eto eto aka ịmata mgbe e meziri ihe emezi na mgbe a na-emezighị ya. Ma, nke a nwekwara ike ime ka gị na ya na-ese okwu.

IHE Ị GA-EME

Gị na ya na-ekwurịta okwu mgbe ọ bụla o kwere omume. Gị na ya na-ekwurịta okwu mgbe ọ bụla ihe unu ga-eji kwurịta okwu mere. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwurịta okwu mgbe ha na-arụ ọrụ ndị dịịrị ha n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ha na ha nọ n’ụgbọala na-aga njem. Ha ma na ahụ́ na-aka eru ụmụ ha ala mgbe ha nọ ha n’akụkụ na-agwa ha okwu ọ bụghị mgbe ha guzo ha n’ihu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Diuterọnọmi 6:6, 7.

Ekwula ogologo okwu. Ọ bụghị ihe niile ga na-esere gị na nwa gị okwu. Ị chọọ ịgwa ya ihe ọ ga-eme, gwa ya ihe ahụ sere ọnụ. I nwere ike iche na ọ nụghị ihe i kwuru. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-emecha chebara ihe ahụ echiche mgbe naanị ya nọ. Hapụ ya ka o chebara ihe ị gwara ya echiche.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 1:1-4.

Na-ege ya ntị, esikwala ọnwụ na ọ ga-eme ihe i kwuru. Na-ege nwa gị ntị mgbe ọ na-ekwu okwu, anapụla ya okwu n’ọnụ. Nke a ga-eme ka ị ghọta ihe bụ́ nsogbu ya. Ị chọọ ịgwa ya okwu ma o kwuchaa, agwala ya okwu otú ọ bụla masịrị gị. Ọ bụrụ na ị na-achọ ka o metechaa ihe niile, ọ ga-achọ otu ihe ọ ga-eji megharịa gị anya ma o mee ihe ị sị ya emela. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere ndị na-eto eto kwuru na ọ bụrụ na a na-achọ ka ụmụaka metachaa ihe niile, ha ga-aghọ ndị ihu abụọ. Ha bịa n’ihu papa ha na mama ha, ha ekwuo ihe ha chọrọ ịnụ. Ma ha pụọ, ha emee ihe masịrị ha.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 4:5.

Ejila iwe agwa ya okwu. O nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Chinenye. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ mụ na mama m nwetụ nghọtahie, ihe ọ bụla m kwuziri na-agbakasị ya ahụ́. Ihe a ọ na-eme na-ewe m ezigbo iwe. Ọ na-eme ka m na-asa ya okwu.” Kama iji iwe na-agwa nwa gị okwu, mee ka ọ ghọta na ị ma ihe ya na ya na-alụ. Dị ka ihe atụ, e nwee ihe na-enye ya nsogbu n’obi, kama ịsị ya, ‘Ọ̀ bụ obere ihe a ka ị na-enyere onwe gị nsogbu?,’ sị ya, ‘Ama m na ihe a na-ewute gị.’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 10:19.

Gbalịa nyere ya aka ka o jiri aka ya kpebie ihe ọ ga-eme. Ọ bụrụ na nwa gị ana-echebara ihe ọ ga-eme echiche ma jiri aka ya na-ekpebi otú ọ ga-esi eme ya, ọ ga-enyere ya aka ugbu a ọ ka na-eto eto. E nwee ihe ọ na-amaghị otú ọ ga-esi eme ya, ekpebirila ya ihe ọ ga-eme. Hapụ ya ka o jiri aka ya kpebie otú ọ ga-esi eme ya. Gị na ya na-ekwu gbasara ihe ahụ, hapụ ya ka o jiri ọnụ ya kwuo otú ọ ga-esi mee ya. Ị gwagodị ya ụzọ ụfọdụ o nwere ike isi mee ihe ahụ, gwa ya ka ọ gaa chebara ha echiche ma bịaghachi ma otu abalị ma ọ bụ abalị abụọ gaa ka ị mara nke ọ họọrọ na ihe mere o ji họrọ ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Hibru 5:14.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’—Jems 1:19.

  • “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.”—Ilu 15:1.

  • “Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

IHE NDỊ NA-ETO ETO GA-EME

Ị̀ chọrọ ka papa gị na mama gị hapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ụfọdụ ị ga na-eme? Ị̀ chọrọ ka ha mata ihe gị na ya na-alụ? I nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe ime ihe abụọ a. Olee otú ị ga-esi eme ya? Na-akọrọ ha otú gị na ije si aga. Meda obi kọọrọ ha ihe ọ bụla na-enye gị nsogbu. Ọ bụrụ na ị naghị akọrọ ha ihe niile, ha ga na-enyo gị enyo. Marakwa na ọ bụrụ na ha atụkwasị gị obi, ha ga-ahapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ụfọdụ ị na-eme.

Ihe anyị na-ekwu bụ na ọ bụghị naanị papa gị na mama gị ga na-agwa gị okwu. Gịnwa kwesịkwara ịna-akọrọ ha ihe. Na-akọrọ ha otú ụbọchị si gaa. Jụọkwa ha otú nke hanwa si gaa. Ọ bụrụ na o nwere ihe ha mere gị, meda obi gwa ha ya. Ọ bụrụ na ị mụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu, ọ ga-abara gị uru ma i too. Ọ ga-adị mma ka ị gbalịa mụta ya ugbu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya