Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/13 p. 14-15
  • Mmanya Na-aba n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmanya Na-aba n’Anya
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ dị njọ?
  • Baịbụl ò kwuru ókè anyị ga-aṅụru mmanya?
  • Olee mgbe anyị na-ekwesịghị ịṅụ mmanya?
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Iji Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya Eme Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ọ̀ Dị Njọ Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya?
    Teta!—2007
  • Na-ele Mmanya Na-aba n’Anya Anya Otú Chineke Si Ele Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 9/13 p. 14-15

IHE BAỊBỤL KWURU

Mmanya Na-aba n’Anya

Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ dị njọ?

“Mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ, iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ, nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.”—Abụ Ọma 104:15.

OTÚ NDỊ MMADỤ SI ELE MMANYA ANYA

N’ebe ụfọdụ, ọ na-abụ e bupụta nri e bupụta mmanya.a Ma, ụfọdụ ndị anaghị akpa mmanya aka. Gịnị mere ndị mmadụ ji ele ya anya otú dị iche iche? Ụfọdụ n’ime ihe kpatara ya bụ omenala, ụka mmadụ na-aga ma ọ bụ otú mmanya na-adị mmadụ n’ahụ́.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ịṅụ oké mmanya adịghị mma nakwa na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya ruo otú ọ ga-egbuwe ya egbu. Ma, o kwughị na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị fere Chineke n’oge ochie na-aṅụ mmanya. Baịbụl kpọkwara mmanya aha ihe karịrị narị ugboro abụọ. (Jenesis 27:25) Ekliziastis 9:7 kwuru, sị: “Jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa obi aṅụrị ṅụọ mmanya gị.” N’oge ochie, a na-aṅụ mmanya n’ebe a na-eme ememme, dị ka n’ebe a na-agba akwụkwọ n’ihi na mmanya na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ bụ n’ebe a na-eme oriri alụmdi na nwunye ka Jizọs Kraịst mere mmiri ka ọ ghọọ “mmanya dị mma.” Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ. (Jọn 2:1-11) E jikwa mmanya agwọ ọrịa n’oge ochie.—Luk 10:34; 1 Timoti 5:23.

Baịbụl ò kwuru ókè anyị ga-aṅụru mmanya?

‘Aṅụbigala mmanya oke.’​—Taịtọs 2:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA ÓKÈ A GA-AṄỤRU MMANYA?

Kwa afọ, ọtụtụ ezinụlọ na-ata ahụhụ n’ihi na nne ha ma ọ bụ nna ha na-aṅụ oké mmanya. Ọtụtụ ndị na-ada n’ụzọ n’ihi na ha ṅụbigara mmanya ókè. Ihe na-akpata ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ bụ na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala na-aṅụbiga mmanya ókè. Ịṅụ oké mmanya na-emekwa ka isi ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. Ọ na-akpatakwa ọrịa obi, na-emebikwa imejụ na afọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kwuru na anyị ekwesịghị ịna-eribiga nri ókè ma ọ bụ na-aṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20; 1 Timoti 3:2, 3, 8) Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe a o kwuru, anyị na ya agaghị adị ná mma. Baịbụl sịrị: “Onye na-akwa emo ka mmanya bụ, ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu bụ onye mkpọtụ, onye ọ bụla nke ọ na-eme ka ọ kpafuo amaghị ihe.”—Ilu 20:1.

Otu n’ime ụzọ mmanya si eme ka mmadụ kpafuo bụ ime ka onye ọ na-egbu mee ihe ọ garaghị eme. Hosia 4:11 sịrị: “Mmanya ochie na mmanya ọhụrụ na-anapụ ezi uche.” Ihe mere otu nwoke aha ya bụ Ginikanwa mere ka ọ ghọta ihe mmanya na-eme mmadụ.b O nwere otu ụbọchị ya na nwunye ya sere okwu, ya ejiri iwe gaa zụrụ mmanya ṅụwa. O mechara kwaa iko ụbọchị ahụ n’ihi na ọ ṅụbigara mmanya ókè. Mgbe anya doro ya, ihe ahụ o mere wutere ya, o kpebikwara na ya agaghị eme ụdị ihe a ọzọ. Ịṅụ oké mmanya nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. Ọ na-emekwa ka mmadụ mee ihe na-adịghị mma. O nwekwara ike ime ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Baịbụl kwukwara na onye na-aṅụbiga mmanya ókè agaghị eketa Alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

Olee mgbe anyị na-ekwesịghị ịṅụ mmanya?

“Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”​—Ilu 22:3.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA MGBE ANYỊ NA-EKWESỊGHỊ ỊṄỤ MMANYA?

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na mmanya na-aba n’anya na-akpa ike. N’ihi ya, e nwere oge anyị na-ekwesịghịdị idetụ ya ọnụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ụfọdụ ndị na-abanye ná nsogbu n’ihi na ha ṅụrụ mmanya n’oge ha na-ekwesịghị ịṅụ ya. Baịbụl kwuru na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” N’ihi ya, e nwere oge mmadụ na-ekwesịghị ịṅụ mmanya. (Ekliziastis 3:1) Dị ka ihe atụ, n’obodo ụfọdụ, e nwere afọ ole mmadụ ga-eru tupu ya aṅụwa mmanya. Ma onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ oké mmanya ma onye na-aṅụ ọgwụ na-asọ mmanya ekwesịghị imetụ mmanya ọnụ. Onye na-arụ ọrụ ekwesịghịkwa ịṅụ mmanya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na o ji ihe dị ka ígwè na-akwọbi ihe arụ ọrụ. N’eziokwu, ndị ma ihe ejighị ndụ ha na ahụ́ ike ha egwu egwu n’ihi na ha ma na ndụ si n’aka Chineke. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụrụ na anyị anaghị aṅụbiga mmanya ókè, ọ na-egosi na anyị na-ele ndụ anya otú Chineke si ele ya.

a Mmanya anyị na-ekwu banyere ya n’isiokwu a bụ mmanya na-aba n’anya.

b Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya