Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/15 p. 3
  • Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị E Dere na Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Àgwà Ndị Na-abara Anyị Uru
    Teta!—2014
  • Okwu Mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 3/15 p. 3
Baịbụl a sapere asape

ISIOKWU TETA! A

Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru?

“M bịara nwee ụdị obi ụtọ m na-enwetụbeghị ná ndụ.”

ỊKỤ ọkpọ na-atọ Hilton ụtọ. Mgbe ọ dị afọ asaa, ọ na-aga akụ ọkpọ ma n’ebe a na-anọ akụ ọkpọ ma n’ebe ndị ọzọ. Mgbe ọ nọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ya na ndị enyi ya na-agagharị na-achọ ndị ha ga-egbu ilu. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, m na-ezu ohi, na-agba chaa chaa, na-ele ndị gba ọtọ, na-emesi ụmụ nwaanyị ike, na-akpọkwa papa m na mama m iyi. Otú m si akpa àgwà mere ka papa m na mama m chee na o nweghị ihe ga-eme ka m gbanwee. Mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, agara m biri nke m.”

Mgbe afọ iri na abụọ gachara, Hilton lọtara. O siiri nne na nna ya ike ikweta na onye a bụ nwa ha n’ihi na ọ gbanweela. Ọ dịzi nwayọọ, na-ejide onwe ya, na-akwanyekwara ndị ọzọ ùgwù. Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe? Mgbe ahụ ọ gara biri nke ya, o chebaara onwe ya echiche. Ọ malitekwara ịgụ Baịbụl ka ọ mara ma ọ̀ ga-enyere ya aka ịgbanwe. O kwuru, sị: “M malitere ime ihe m na-agụta na Baịbụl. M kwụsịrị ịkpa àgwà ọjọọ ma malite ịsọpụrụ nne m na nna m otú ahụ Baịbụl kwuru ná Ndị Efesọs 6:2, 3. M bịara nwee ụdị obi ụtọ m na-enwetụbeghị ná ndụ. Emekwara m ka obi na-adị papa m na mama m mma kama ime ihe ndị ga na-agbawa ha obi.”

Otú Hilton si mechaa gbanwee gosiri na ihe e kwuru na Baịbụl bara uru, na-agbanwekwa ndụ ndị mmadụ. (Ndị Hibru 4:12) Na Teta! a, anyị ga-atụle ihe Baịbụl kwuru gbasara mmadụ ịkwụwa aka ọtọ, otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị, ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara ịgba n’èzí, na otú anyị ga-esi na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Anyị ga-ahụkwa otú ihe a niile ga-esi baara anyị uru.

OGE BAỊBỤL Ọ̀ GAFEELA?

Bọket e kponyere ngwongwo kọmputa a na-enweghịzi ihe e ji ha eme

E nwere ndị na-ekwu na oge Baịbụl agafeela. Ha sị na Baịbụl yiri akwụkwọ e ji akọwa otú kọmputa merela ochie a na-enweghịzi ihe e ji ya eme si arụ ọrụ. Ihe a ha kwuru erijughị afọ. Ọ dị ka iji okwuchi karama ekwuchi ite. Ọ na-abụ a na-emepụta kọmputa ndị ọhụrụ, akwụkwọ e ji akọwa otú ndị nke ochie si arụ ọrụ abụrụzie ihe mgbe ochie. Ma, ụmụ mmadụ adịghị otú ahụ. Ihe ụfọdụ ndị nna nna anyị hà mere ka anyị ka na-eme. Dị ka ihe atụ, otú e si lee ihe anya n’oge ahụ ka e sikwa ele ya taa ma a bịa n’ihe ndị dị ka ịhụnanya, ịkpọasị, ịgba n’èzí, obiọma, na imekpọ mmadụ ọnụ. N’ihi ya, a bịa n’ihe e ji mara ụmụ mmadụ, ‘ọ dịghị ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’okpuru anyanwụ.’—Ekliziastis 1:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya