Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 5 p. 10-11
  • Nkume Dị́ Ịtụnanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkume Dị́ Ịtụnanya
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrụ Oké Ọhịa Na-arụ—Olee Otú Ọ Baruru Uru?
    Teta!—2004
Teta!—2016
g16 nke 5 p. 10-11

Nkume Dị́ Ịtụnanya

Irighiri kabọn

Otu akwụkwọ a na-akpọ Nature’s Building Blocks kwuru, sị: ‘Kabọn bara uru ná ndụ karịa ihe ọ bụla ọzọ.’ Otú kabọn dị na-eme ka ọ dị mfe ya na ihe ndị ọzọ ịgwakọta. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ ihe kabọn dị n’ime ya. A na-achọpụtakwa ọtụtụ ihe ọhụrụ ndị ọ dị na ha, na-ejikwa ya emepụta ọtụtụ ihe.

Ihe ndị a kọwara n’okpuru ebe a gosiri na irighiri kabọn nwekwara ike ịhazi onwe ha n’ụzọ dị iche iche. Ha nwere ike ịdị ogologo, gburugburu ma ọ bụkwanụ mbadamba. N’eziokwu, kabọn dị ịtụnanya.

DAYAMỌND

Dayamọnd

Ụmụ irighiri kabọn nwere otú ha nwere ike isi hazie onwe ha, ha esie ezigbo ike ghọzie dayamọnd. Dayamọnd bụ ihe kacha sie ike a chọpụtarala n’ụwa. Ezigbo dayamọnd na-enwe otu mọlekụl kabọn.

GRAFAỊT

Pensụl

Ọ bụrụ na ụmụ irighiri kabọn ahazie onwe ha ka ha dịrị mbadamba mbadamba, nke ọ bụla adịrị n’elu ibe ya, ọ na-aghọ grafaịt. A na-eji grafaịt emepụta mmanụ a na-atụ n’ígwè ọrụ, jirikwa ya emepụta pensụl.

GRAFỊN

Ihe e ji pensụl kaa

Ọ bụrụ na ụmụ irighiri kabọn ahazie onwe ha ka ha dị mbadamba, nwee akụkụ isii, ọ na-aghọ grafịn. Grafịn na-esi ezigbo ike karịa ígwè. A dọtịa grafịn na ígwè, ígwè na-ebu grafịn ụzọ adọbi. E jiri pensụl kaa ihe, ihe ahụ akara nwere ike inwe grafịn ole na ole n’ime ya.

FULARIN

Fularin

Ihe a bụ mọlekụl kabọn ndị nwere oghere n’ime ha. Ụfọdụ n’ime ha dị gburugburu, ndị ọzọ adịrị ogologo.

IHE NDỊ DỊ NDỤ

Mkpụrụ ndụ ndị kabọn dị n’ime ha

Kabọn dị ná mkpụrụ ndụ dị n’ime ihe niile dị ndụ, ma osisi, ma ụmụ anụmanụ ma ụmụ mmadụ. Kabọn dịkwa ná nri dị iche iche anyị na-eri.

“Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ . . . n’ihe ndị e kere eke.”​—⁠Ndị Rom 1:20.

Kpakpando

Ụzọ Dị Ịtụnanya Kpakpando Si Emepụta Kabọn

Ndị sayensị kwuru na irighiri helium atọ na-agwakọta ghọọ kabọn n’ime kpakpando ndị a na-akpọ red giants. Tupu helium enwee ike ịgwakọta, ihe ụfọdụ ga-adịrịrị otú ha kwesịrị ịdị. Otu onye sayensị aha ya bụ Paul Davies kwuru, sị: ‘A gbanwee ihe ọ bụla n’otú ihe ndị ahụ kwesịrị ịdị, ọ bụrụgodị obere ihe, o nweghịzị ihe ga-adị ndụ, eluigwe na ụwa agaghịkwa adị.’ Olee ihe ị ga-asị mere ihe ndị a ji dị nnọọ otú ha kwesịrị ịdị? Ụfọdụ ndị sịrị na ha ji aka ha dịrị otú ahụ, ndị ọzọ a sị na ọ na-egosi na e nwere Onye Okike. Olee nke dị gị ka ọ̀ bụ eziokwu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya