Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 2 p. 14-15
  • Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta Ịna-akpa Àgwà Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta Ịna-akpa Àgwà Ọma
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ BỤ ÀGWÀ ỌMA?
  • GỊNỊ MERE ÀGWÀ ỌMA JI DỊ MKPA?
  • OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE NWA GỊ ỊNA-AKPA ÀGWÀ ỌMA
  • 7 Kụziere Ụmụ Gị Ịna-akpa Àgwà Ọma
    Teta!—2018
  • Ụwa nke Na-enweghị Otu Ụkpụrụ Na-achịkwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Àgwà Ndị Na-abara Anyị Uru
    Teta!—2014
  • Ndị Ụkpụrụ Ndị Oge Ha Na-adịghị Agafe Agafe Na-eduzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 2 p. 14-15
Ebe otu nwatakịrị nwaanyị na-ahụ ka mama ya na-enyeghachi mmadụ akpa ya furu efu

IHE NKE 6

Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta Ịna-akpa Àgwà Ọma

GỊNỊ BỤ ÀGWÀ ỌMA?

Ndị na-akpa àgwà ọma na-ama ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ihe ha ji ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi abụghị otú obi dị ha. Kama, e nwere ụkpụrụ ma ọ bụ iwu ndị na-ekpebi otú ha si akpa àgwà, ma mgbe naanị ha nọ ma mgbe ha na ndị ọzọ nọ.

GỊNỊ MERE ÀGWÀ ỌMA JI DỊ MKPA?

E nwere ọtụtụ ihe na-ezighị ezi a na-agwa ndị na-eto eto taa banyere ihe bụ́ àgwà ọma. Ebe ha si anụ ihe ndị a bụ n’ọnụ ụmụ akwụkwọ ibe ha, n’egwú, na fim, nakwa na tiivi. Ihe ndị a nwere ike ime ka ha nwewe obi abụọ banyere ihe ndị a kụziiri ha na ha bụ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.

Ihe a na-emekarị ndị nọ n’afọ iri na ụma. Otu akwụkwọ aha ya bụ Beyond the Big Talk kwuru na n’oge a ụmụaka ndị a na-eto eto, “ha kwesịrị ịghọta na ndị ọgbọ ha na ndị ha na-ahụ na tiivi nakwa n’Ịntanet na-achọ ime ka ha bụrụ ndị a ma ama. Ha kwesịkwara ịmụta ịna-eji ezigbo ihe ndị a kụziiri ha eme mkpebi, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe ndị enyi ha chọrọ ka ha mee.” N’eziokwu, ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ihe ndị a tupu ha eruo afọ iri na ụma.

OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE NWA GỊ ỊNA-AKPA ÀGWÀ ỌMA

Mee ka ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi doo ya anya.

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ndị tozuru okè . . . zuru ikike nghọta ha azụ . . . ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’—Ndị Hibru 5:14.

  • Na-akpọrọ nwa gị aha ihe ndị ziri ezi na ihe ndị na-ezighị ezi. Jiri ihe ndị na-eme kwa ụbọchị na-eme ya. Dị ka ihe atụ, na-agwa ya, sị: “Ihe a bụ ikwu eziokwu; ihe a bụ ịgha ụgha.” “Ihe a bụ irube isi; ihe a bụ inupụ isi.” “Ihe a bụ inwe obiọma; ihe a bụ inwe obi ọjọọ.” Ọ ga-eme ka nwa gị mata ihe ndị o kwesịrị ime na ihe ndị ọ na-ekwesịghị ime.

  • Na-agwa ya ihe mere ihe ji zie ezi ma ọ bụ ghara izi ezi. Dị ka ihe atụ, na-ajụ ya ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere o ji akacha mma ikwu eziokwu? Olee otú ụgha si ekewa enyi na enyi? Gịnị mere izu ohi ji dị njọ? Kụziere ya iche echiche nke ọma ka ọ na-amata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.

  • Mee ka ọ mata uru dị n’ịkpa àgwà ọma. I nwere ike ịgwa ya, sị: “Ị na-ekwu eziokwu, ndị mmadụ ga na-atụkwasị gị obi” ma ọ bụkwanụ “Ị dị obiọma, ndị mmadụ ga na-akpa gị nso.”

Gbalịa mee ka ndị ezinụlọ unu niile na-akpa àgwà ọma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.”—2 Ndị Kọrịnt 13:5.

  • Ndị ezinụlọ unu kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ka i nwee ike ikwu n’eziokwu, sị:

    • “Ndị ezinụlọ anyị anaghị agha ụgha.”

    • “Anyị anaghị alụ ọgụ ma ọ bụ aba mba.”

    • “Anyị anaghị agwa mmadụ okwu ọjọọ.”

Ọ ga-eme ka nwa gị mata na ọ bụghị naanị na unu chọrọ ka ndị ezinụlọ unu na-akpa àgwà ọma, kama na unu chọrọ ka e jiri ya mara ezinụlọ unu.

  • Gị na nwa gị na-ekwụrịta àgwà ndị ị chọrọ ka ndị ezinụlọ unu na-akpa. Jiri ihe ndị na-eme kwa ụbọchị na-akụziri ya ihe. I nwere ike ime ka ọ mata ihe mere àgwà ndị ị chọrọ ka ọ na-akpa ji dị iche ná ndị nke a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na tiivi. Jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: “Ọ bụrụ gị ka ihe a mere, gịnị ka ị gaara eme?” “Olee ihe ezinụlọ anyị gaara eme?”

Mee ka obi sie ya ike ịna-eme ihe ziri ezi.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Nweenụ ezi akọ na uche.”—1 Pita 3:16.

  • Jaa nwa gị mma ma o mee ihe ziri ezi. Nwa gị kpaa àgwà ọma, jaa ya mma, meekwa ka ọ mata ihe mere ihe ahụ o mere ji dị mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “I kwuru eziokwu n’ihe a. Eji m gị eme ọnụ.” Nwa gị gwa gị ihe ọjọọ o mere, buru ụzọ jaa ya mma maka ikwu ihe ahụ o mere tupu gị enyewa ya ndụmọdụ.

  • Gbazie nwa gị ma ọ kpaa àgwà ọjọọ. Nwa gị mejọọ ihe, nyere ya aka ikweta na o mejọrọ. E kwesịrị ịna-eme ka ụmụaka mata ihe ha mejọrọ na otú o si dị iche n’ihe e ji mara ezinụlọ unu. Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị achọ ịgwa nwa ha banyere ihe o mejọrọ ka obi ghara ịjọwa ya njọ. Ma, gị na nwa gị kwurịta banyere ihe o mejọrọ, ọ ga-enyere ya aka ịzụ akọnuche ya ka ọ na-amata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.

Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe ga-enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha, gaa na jw.org/ig.

Ebe otu nwatakịrị nwaanyị na-ahụ ka mama ya na-enyeghachi mmadụ akpa ya furu efu

BIDO UGBU A KỤZIWERE NWA GỊ IHE

Ọ na-adịrị ụmụaka ndị chọpụtara na ndị nne na nna ha na-ekwu eziokwu mfe ịna-ekwu eziokwu, ma mgbe ndị ọzọ na-anaghị ahụ ha

Na-eme Ihe Ndị Ị Na-akụziri Nwa Gị

  • Okwu ọnụ m na àgwà m hà na-eme ka ụmụ m mata na m na-akpa àgwà ọma m na-akụziri ha?

  • Mụ na di m ma ọ bụ nwunye m ànyị na-akpa àgwà anyị na-akụziri ụmụ anyị ka ha na-akpa?

  • Ọ̀ na-abụ m mejọọ ihe, mụ asị na o nweghị ihe o mere ebe ọ bụ na abụghị m nwata?

Ihe Anyị Mere . . .

“Anyị na-akọrọ ụmụ anyị banyere ndị kpara àgwà ọma na uru ọ baara ha, nakwa ndị kpara àgwà ọjọọ na nsogbu ọ kpataara ha. Ha kọọrọ anyị banyere onye ọgbọ ha mere ihe na-adịghị mma, anyị na ha na-ekwurịta banyere ya ka ha ghara ime ụdị ihe ahụ.”—Nicole.

“Mgbe nwa anyị nwaanyị ka dị ntakịrị, anyị na-agwa ya na o nwere ihe abụọ o nwere ike ime. Otu bụ ihe ọma, nke ọzọ bụ ihe ọjọọ. Anyị na-akọwakwara ya uru na ọghọm dị na nke ọ bụla. Ihe a nyeere ya aka ịma otú ọ ga-esi na-eme mkpebi. Ọ baara ya ezigbo uru n’ihi na onye ọ bụla ga na-eme mkpebi ná ndụ ya n’agbanyeghị afọ ole onye ahụ dị.”—Yolanda.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya