Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Ndụ Ùgwù?
IHE MERE ỊKWANYERE NDỤ ÙGWÙ JI DỊ MKPA
Ọ bụrụ na anyị anaghị akwanyere ndụ ùgwù, anyị nwere ike ime ihe ga-akpatara anyịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ ọrịa ma ọ bụ ọnwụ.
Ọ bụghị naanị na ise sịga na-akpata ọrịa kansa, kama ọ na-emekwa ka ahụ́ mmadụ ghara inwe ike ịlụso ọrịa a ọgụ. E kwuru na ọ bụ ise sịga ma ọ bụ ikuru anwụrụ ọkụ sịga na-egbu ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa kansa akpa ume.
Égbè a na-agba ndị mmadụ n’ebe ìgwè mmadụ zukọtara na-akpatara ọtụtụ ndị obi mgbawa kwa afọ. Otu akụkọ Mahadum Stanfọd dị n’Amerịka wepụtara kwuru, sị: “Nchọpụta e mere gosiri na ndị na-emerụghịdị ahụ́ [n’oge ndị a gbara égbè n’ụlọ akwụkwọ] ka na-echeta ihe ahụ merenụ, ọ ka nwekwara ike ịna-akpaghasị ha uche ruo ọtụtụ afọ.”
Ndị na-akwọ ụgbọala mgbe ha ṅụchara mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ na-etinye ndụ ndị ọzọ, ma nke ndị ji ụkwụ aga, n’ihe ize ndụ. Mgbe ndị mmadụ na-egosi na ha ejighị ndụ kpọrọ ihe, ọ na-abụkarị ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ ya.
IHE I NWERE IKE IME
Emela ihe ga-akpatara gị ọrịa. Mmadụ ekwesịghị iche na oge aganahụla ya ịkwụsị ihe na-adịghị mma ọ na-eme, dị ka ise sịga nkịtị, ise sịga nke eletrọnik, ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ihe ndị a na-emebi ndụ mmadụ, ọ na-egosikwa na mmadụ ejighị ndụ ndị ya na ha nọ, ma nke ndị ezinụlọ ya, kpọrọ ihe.
Na-ezere ihe ọghọm. Iji zere ihe ọghọm, rụzie ihe niile e kwesịrị ịrụzi arụzi n’ụlọ gị. Kpachapụ anya mgbe ị na-akwọ ụgbọala, rụziekwa ihe niile i kwesịrị ịrụzi n’ụgbọala gị. Ekwela ka nsogbu ndị ọzọ na-enye gị mee ka i mee ihe nwere ike ịmerụ gị ahụ́ ma ọ bụ kpatara gị ọnwụ.
Na-enwere ndị ọzọ obiọma. Anyị na-akwanyere ndụ ùgwù ma ọ bụrụ na anyị na-enwere ndị si n’ebo niile na mba niile, ma ndị ogbenye ma ndị ọgaranya, obiọma. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ịkpọasị na iburu ndị mmadụ ihe ọjọọ n’obi na-akpata ọtụtụ tigbuo zọgbuo na agha a na-alụ n’ụwa.
IHE ANYỊ NA-EME
Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-ebi ndụ dị mma ma na-eme ihe ga-eme ka ahụ́ sie ha ike. Baịbụl anyị na-akụziri ndị mmadụ enyerela ọtụtụ ndị aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị riri ha ahụ́, kwụsịkwa ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.
Anyị rụwa ụlọ, anyị na-eso ntụziaka ndị ga-eme ka onye ọ bụla ghara imerụ ahụ́. A na-azụ ụmụnna anyị ndị wepụtara onwe ha iso rụọ ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe nakwa ebe ndị ọzọ a na-anọ arụ ọrụ gbasara ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl azụ ka ha ghara imerụ ahụ́ mgbe ha na-arụ ọrụ. A na-eleru ụlọ anyị dị iche iche anya ugboro ugboro iji hụ na e nweghị ihe dị na ha ga-emerụ mmadụ ahụ́ otú iwu obodo kwuru ka a na-eme.
Anyị na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. N’oge na-adịbeghị anya, anyị gbataara ndị ọdachi ruru narị abụọ (200) dakwasịrị n’ebe dị iche iche n’ụwa niile ọsọ enyemaka n’ime ọnwa iri na abụọ. Anyị mefukwaara ha ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde dọla iri na abụọ ụmụnna anyị nyere n’onyinye.
Mgbe ọrịa Ebola bidoro ịkpa mkpamkpa n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka (n’afọ 2014) nakwa na Kongo Kinshasa (n’afọ 2018), anyị kụziiri ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ọrịa ọjọọ ahụ ghara ịna-agbasa. Anyị zipụrụ ndị nnọchiteanya anyị ka ha gaa gwa ìgwè mmadụ dị iche iche okwu n’isiokwu bụ́ “Nrubeisi Na-azọ Ndụ.” Anyị rụrụ ebe ndị a na-akwọ aka n’ebe e si abata n’ụlọ nzukọ anyị dị iche iche, meekwa ka onye ọ bụla mata na ọ dị mkpa ịna-akwọ aka na ịna-eme ihe ndị ọzọ ga-eme ka ha ghara ibute ọrịa.
Na Siera Lion, a mara ọkwa na redio jaa Ndịàmà Jehova mma maka inyere Ndịàmà Jehova na ndị ọzọ nọ n’obodo ha aka ka ha ghara ibute ọrịa Ebola.
Ebe a na-akwọ aka n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge ọrịa Ebola kpara mkpamkpa na Laịberịa n’afọ 2014
a N’Izrel nakwa ná mba ndị gbara ya gburugburu, ntụziaka a e nyere gosiri na Jehova achọghị ka ndị nọ n’ezinụlọ ma ọ bụ ndị ọzọ merụọ ahụ́.