Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g24 nke 1 p. 13-15
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Onwe Ha Ùgwù?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Onwe Ha Ùgwù?
  • Teta!—2024
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE MMADỤ ỊKWANYERE ONWE YA ÙGWÙ JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • IHE ANYỊ NA-EME
  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka
    Teta!—2020
  • Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Ndị Ezinụlọ Ha Ùgwù?
    Teta!—2024
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Otú M Ga-esi Na-elekwu Onwe M Anya Ka Onye Bara Uru?
    Teta!—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2024
g24 nke 1 p. 13-15
Ebe otu nwaanyị iwe ji na-ele onwe ya anya n’enyo.

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Onwe Ha Ùgwù?

IHE MERE MMADỤ ỊKWANYERE ONWE YA ÙGWÙ JI DỊ MKPA

Ndị na-akwanyere onwe ha ùgwù na-eji obi ike edi nsogbu ụwa. Ike ụwa anaghị agwụ ha ngwa ngwa.

  • Nchọpụta e mere gosiri na ndị na-ejighị onwe ha kpọrọ ihe na-echegbukarị onwe ha, obi na-adakarị ha mbà, ha anaghịkwa eri nri nke ọma. Ọ na-akakwa adịrị ha mfe ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.

  • Ndị na-akwanyere onwe ha ùgwù anaghị eji onwe ha atụnyere ndị ọzọ. Ihe a na-eme ka ọ dịkwuoro ha mfe ha na ndị mmadụ ịdị ná mma, na-emekwa ka ha nweta ndị enyi ha na ha ga-adị n’ezigbo mma. Ma, ndị na-ejichaghị onwe ha kpọrọ ihe na-akatọkarị ndị ọzọ, nke na-emebikarị mmekọrịta ha na ndị ọzọ.

  • Ọ bụrụgodị na nsogbu abịara ndị ji onwe ha kpọrọ ihe, ike anaghị agwụ ha ngwa ngwa. Ha anaghị ekwe ka nsogbu mee ka ha ghara imezu ihe ha bu n’obi ime. Ma, ndị na-anaghị akwanyere onwe ha ùgwù na-echekarị na nke ha na-eme agwụla ma ọ bụrụ na ihe agaghị otú ha chere. Ihe a nwere ike ime ka ike gwụ ha ngwa ngwa.

IHE I NWERE IKE IME

Meta ndị ga na-agba gị ume enyi. Ka ndị gị na ha ga na-akpa bụrụ ndị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ndị ihe gbasara gị na-emetụ n’obi, ndị ga na-agbakwa gị ume.

“Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na ị dị obiọma ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ma ndị na-agaghị akwụghachili gị, ị ga-enwe obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe. Ị ga-enwe obi ụtọ a ọ bụrụgodị na ndị ọzọ ekeleghị gị maka ihe ọma i mere.

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Nyere ụmụ gị aka ka ha na-akwanyere onwe ha ùgwù. Otu ụzọ i nwere ike isi mee ya bụ ikwe ka ha na-egboro onwe ha mkpa ha ndị nke ha ga-ejili aka ha gboo. Ime otú a na-eme ka ụmụaka mụta otú ha ga-esi na-emeri ma ọ bụ na-edi nsogbu na-abịara ha. Ọ na-emekwa ka ha jiri onwe ha kpọrọ ihe, ma mgbe ha ka na-eto eto ma mgbe ha torola.

“Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso. Ọ bụrụgodị na o mee okenye, ọ gaghị ahapụ ụzọ ahụ.”​—Ilu 22:6.

Ebe Onyeàmà Jehova na-akụziri otu nwaanyị Baịbụl n’ebe a na-ere kọfị.
Ebe Onyeàmà Jehova na-akụziri otu nwaanyị Baịbụl n’ebe a na-ere kọfị.

IHE ANYỊ NA-EME

Ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nakwa Baịbụl ha na-akụziri ndị mmadụ na-eme ka ndụ ndị mmadụ ka mma, na-emekwa ka ha jiri onwe ha kpọrọ ihe.

ỌMỤMỤ IHE ANYỊ NA-ENWE KWA IZU

N’ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu, obi na-adị anyị ụtọ ịnụ okwu e si na Baịbụl agwa anyị. Ọtụtụ mgbe, a na-atụrụ anyị aro otú anyị ga-esi na-akwanyere onwe anyị ùgwù. A naghị ana ndị mmadụ ego n’ọmụmụ ihe anyị, onye ọ bụla nwekwara ike ịbịa ya. Dị ka ihe atụ, n’ọmụmụ ihe anyị, ị ga-amụta . . .

  • ihe mere Chineke ji jiri gị kpọrọ ihe

  • ihe ị ga-eme ka ndụ gị nwee isi

  • otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’ezigbo mma

Ị ga-ahụkwa ezigbo ndị enyi ndị “na-enyerịtara ibe ha aka.”​—1 Ndị Kọrịnt 12:25, 26.

Ị chọọ ịmatakwu gbasara ọmụmụ ihe anyị, gaa na jw.org chọọ obere vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?

BAỊBỤL ANYỊ NA-AKỤZIRI NDỊ MMADỤ

Anyị na-eji akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Akwụkwọ a nwere amaokwu Baịbụl ndị dị ezigbo mkpa, ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chee echiche, ọmarịcha vidio, na foto ndị mara mma. A kọwakwara ihe ndị e dere na ya nke ọma. Baịbụl anyị na-akụziri ndị mmadụ na-eme ka ha na-akwanyere onwe ha ùgwù, na-emekwa ka ndụ ha ka mma.

Ị chọọ ịhụ otú gị na Ndịàmà Jehova ịmụ Baịbụl nwere ike isi baara gị uru, gaa na jw.org chọọ obere vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Israel Martínez.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

Otu nwoke aha ya bụ Israel Martínez na-eche na ndị ọzọ ka ya mma maka na ọ bụ ogbenye, ọ gụghịkwa oké akwụkwọ. Gaa na jw.org ka ị gụọ isiokwu bụ́ “Ihere Onwe M Anaghịzi Eme M” ka ị hụ otú ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na ịmụ Baịbụl si nyere ya aka iji onwe ya kpọrọ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya