Isi 9
Ọgbụgba Ndụ Chineke na “Enyi” Ya Abawororị Ọtụtụ Nde Mmadụ Uru
1, 2. (a) Mmekọrịta dị aṅaa nke enyi bụ nke malitewororịị ịrụpụtara ọtụtụ nde mmadụ abamuru? (b) N’ihi gịnị ka Abraham ji nwee ike ịghọ enyi Chineke?
IHE karịrị 1,950 afọ gara aga otu ezi enyi nke ihe a kpọrọ mmadụ kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Jisọs, bụ́ onye kwuru okwu a, bụ nwa nke otu nwoke a kpọrọ enyi nke Onye kasị pụta ìhè n’eluigwe na ala nile, bụ́ Jehova Chineke. Mmekọrịta enyi nke a amaliteworị ịrụpụta abamuru maka ọtụtụ nde mmadụ, ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ dalara n’otu akụkụ.
2 Onye bụ nwoke oge ochie ahụ riteere anyị ihe dị ukwuu n’ihi ọbụbụ enyi ya na Chineke? Ọ bụ Abraham, nwa nke nwoke ahụ bụ́ Shem, onye bụ́ otu n’ime ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị Noa. Abraham na Chineke banyere ná mmekọrịta, na-egosipụta àgwà dị iche iche nke ezi enyi. N’ịbụ onye ịhụnanya na okwukwe kpaliri, Abraham mere ihe kwekọrọ n’uche Chineke, n’ihi nke a kwa onye so dee Bible bụ́ Jemes na-ekwu, sị: “E wee mezuo ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ nke na-asị, Abraham wee kwere okwu Chineke, e wee gụọ ya nye ya n’ezi omume; e wee kpọọ ya enyi nke Chineke.”—Jemes 2:23.
3, 4. (a) Gịnị na-eme ihe atụ nke ụzọ Jehova si gụọ okwukwe na obi ike Abraham nwere n’ebe ọ nọ n’ihe dị ukwuu? (b) Okwu ndị dị aṅaa ka Jehova ji weta okwu ya dị na Aịsaịa 41:8 ná njedebe dị ebube?
3 Nwoke ahụ nke okwukwe na ọrụ sitere n’obodo Ua nke ndị Kaldea, ọ bụkwa ya bụ onye mbụ a kpọrọ onye Hibru. (Jenesis 14:13) E ji ọkpụkpọ aha nke a mee ihe n’ebe ụmụ ya nke mba Israel nọ. (Ndị Filipaị 3:5) N’ihi ime Abraham enyi ya, Jehova Chineke mekwara ka ọ mata ụfọdụ n’ime ihe ndị dịịrị nanị Ya. E gosipụtara nke a site n’ihe e dere na Jenesis 18:17-19.
4 Nke ahụ na-eme ihe atụ nke ụzọ dị ukwuu Jehova Chineke si lee okwukwe na obi ike Abraham nwere n’ebe ọ nọ anya, na-arụpụta nrubeisi ịrụ ụka na-adịghị na ya n’akụkụ nke Abraham. Ya mere, n’enweghị mmechu ihu ma ọ bụ ịrịọ biko, Jehova wetara okwu ọ gwara mba Israel ná njedebe site n’ịsị: “Ma gị onwe gị, Israel, ohu m, Jekọb onye m họpụtara, mkpụrụ Abraham, bụ́ onye na-ahụ m n’anya [“enyi m,” NW].”—Aịsaịa 41:8.
Ọgbụgba Ndụ Abraham Amalite Ịdị Irè
5, 6. (a) Ọgbụgba ndụ dị aṅaa ka Jehova na enyi ya bụ Abraham gbara? (b) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa na-emegide emegide ka Jehova kwere enyi ya nkwa banyere otu “mkpụrụ”?
5 Ruo ókè dị aṅaa njikọ dị n’etiti mmadụ na enyi ya na-ahụ n’anya ga-eduru mmadụ ka e mere ihe atụ ya n’eziokwu ahụ bụ na Ọkaaka nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova, sooro mmadụ nkịtị nke a bụ́ Abraham gbaa ndụ. Na Jenesis 15:18 anyị na-agụ, sị: “N’ụbọchị ahụ ka Jehova gbara ọgbụgba ndụ nye Abram [Abraham], sị, Mkpụrụ gị ka m nyeworo ala nke a, site n’osimiri Ijipt ruo osimiri ukwu ahụ, bụ́ osimiri Yufretis.”
6 Yufretis bụ osimiri nke Abraham na ezinụlọ ya gafere iji banye n’Ala Nkwa ahụ. Mgbe ha na-agafe, Abraham enweghị nwa ọ bụla, ọ bụ ezie na o ruwo afọ ndụ nke 75, nwunye ya agafewokwa afọ ndụ nke ịmụ nwa. (Jenesis 12:1-5) Ma, n’okpuru ọnọdụ ndị ahụ na-emegide emegide, Chineke gwara Abraham ahụ na-erube isi, sị: “Biko, legide anya n’ebe eluigwe dị, gụọ kpakpando, ọ bụrụ na ị pụrụ ịgụ ha: . . . otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.”—Jenesis 15:2-5.
7. (a) Gịnị ka a na-akpọ ọgbụgba ndụ nke a? (b) Olee afọ ọ malitere ịdị irè, sitekwa n’ihe omume dị aṅaa ná ndụ Abraham? (ch) Afọ ole ka ọ dịkwa tupu e soro mba Israel gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?
7 Ọgbụgba ndụ ahụ Jehova na “enyi” ya gbara ka anyị na-akpọ ọgbụgba ndụ Abraham. Ọgbụgba ndụ ahụ malitere ịdị irè na 1943 T.O.A. mgbe Abraham mere ihe kwekọrọ n’ihe ndị ọgbụgba ndụ Chineke ahụ chọrọ n’aka ya ma gafee Yufretis mgbe ọ na-aga Ala Nkwa ahụ. N’afọ ahụ Jehova Chineke banyere n’ibu ọrụ nke iji “mkpụrụ” gọzie Abraham ahụ na-enweghị nwa. Iwu ahụ nke dịịrị ọgbụgba ndụ ahụ e soro mba Israel gbaa n’Ugwu Saịnaị malitere ịdị adị 430 afọ n’ikpeazụ, na 1513 T.O.A.—Jenesis 12:1-7; Ọpụpụ 24:3-8.
A Gbakwụnye Ọgbụgba Ndụ Iwu n’Ọgbụgba Ndụ Abraham
8. (a) Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ? (b) Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ o mere ka ọgbụgba ndụ Abraham ghara ịdị iré?
8 N’oge ahụ, ụmụ Abraham site na nwa ya bụ Aịsak aghọwo ndị nweere onwe ha. A gbapụtawo mba Israel site n’Ijipt, e dujewokwa ha n’Ugwu Saịnaị nke dị n’Arebia. Site n’aka Mosis dị ka onye ogbugbo, n’ebe ahụ e mewo ka ha na Jehova Chineke banye n’ọgbụgba ndụ Iwu. Ebe ndị Israel ahụ bụwororị ụmụ anụ ahụ nke “enyi” Jehova, bụ́ Abraham, gịnị n’ezie bụ nzube nke ọgbụgba ndụ Iwu dị otú a? Ọ gaje ije ozi dị ka ihe nchebe nye ndị Jehova a họpụtara ahọpụta. Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ akagbughị ọgbụgba ndụ Abraham, ọ bụ ezie na o gosipụtara mba Israel ahụ dị ka ndị ikpe njehie mara n’ihi iwu zuru okè nke Chineke ya.—Ndị Galetia 3:19-23.
9, 10. (a) Olee otú ụmụ Abraham n’ozuzu ha si enwe mmetụta banyere “mkpụrụ” ahụ nke ọ bụ site na ya ka mba nile ga-agọzi onwe ha? (b) Echiche ha ọ̀ nwapụtawo onwe ya ịbụ nke ziri ezi?
9 N’ikwu ya n’ụzọ ihe atụ, ndị Israel ghọrọ “ụmụ” nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ha chere na n’ihi na ha bụ ụmụ anụ ahụ nke Abraham, ha ghọrọ ozugbo ahụ “mkpụrụ” ahụ nke mba nile ga-agọzi onwe ha site na ya. Nke a ọ̀ bụwo otú o si mee? Ee e! Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3,500 afọ mgbe nke ahụ gasịrị, anyị na-ahụ mba ụwa ahụ bụ́ Republic of Israel nke nweere onwe ya, ma ọ na-alụ ọgụ maka ndụ ya n’etiti ọtụtụ mba ndị iro.
10 Ya mere mmadụ ịghọ onye na-eso ụzọ ndị Juu taa na-eburu n’uche isi otú a ghọọ akụkụ nke “mkpụrụ” Abraham maka ngọzi nke ihe nile fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ abụghị ụzọ nke Jehova Chineke. Mgbe ahụ, gịnị werewooro ọnọdụ?
11. Olee otú Pọl onyeozi sị kọwaa ihe mere ụmụ Abraham nke anụ ahụ?
11 Pọl onyeozi na-akọwara anyị okwu ahụ, na-asị: “E dewo ya na Abraham nwere ụmụ ndị ikom abụọ, otu site n’ohu nwanyị ahụ [Hega], otu sitekwa na nwanyị ahụ nke nweere onwe ya [Sera]; ma ọ bụ n’ụzọ anụ ahụ ka a mụworo nwa nke sitere n’ohu nwanyị ahụ, ma e sitewo na nkwa mụọ nke ọzọ ahụ sitere na nwanyị ahụ nweere onwe ya. Ihe ndị a bụ ihe atụ; n’ihi na ndị inyom abụọ ndị a pụtara ọgbụgba ndụ abụọ, nke sitere n’Ugwu Saịnaị pụta, bụ nke na-amụ ụmụ nye n’ohu, nke bụkwa Hega. Ugbu a Hega nke a pụtara Saịnaị, ugwu dị n’Arebia, ya na Jerusalem nke dị ugbu a kwekọkwara, n’ihi na ọ nọ n’ohu, ya na ụmụ ya. Ma Jerusalem nke dị n’elu nweere onwe ya, ọ bụkwa nne anyị.”—Ndị Galetia 4:22-26, NW.
12. Ònye ka ohu nwanyị ahụ bụ Hega kwekọrọ na ya?
12 Jerusalem ahụ nke ya na ohu nwanyị ahụ bụ́ Hega kwekọrọ bụ nke elu ala, nke ndị Juu anụ ahụ bijupụtara. N’oge Jisọs Kraịst, ọ bụ isi obodo nke mba Israel, nọrọkwa n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Matiu 23:37, 38) Mgbe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke Mosis bụ onye ogbugbo ya ka na-arụ ọrụ, Israel anụ ahụ bụ akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ Jehova. Otú a, a pụrụ iji nwanyị see onyinyo ya, Hega bụ́ ohu nwanyị nke Sera.
Ezi Ụmụ nke Ọgbụgba Ndụ Abraham
13. (a) Gịnị kwekọrọ na nwunye Abraham, bụ́ Sera? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji sị na “Jerusalem nke dị n’elu” bụ nke “nweere onwe ya”?
13 N’aka nke ọzọ, “Jerusalem nke dị n’elu” bụ nzukọ eluigwe a na-adịghị ahụ anya nke Jehova. N’ụzọ kwekọrọ nnọọ ekwekọ, a pụrụ iji nwanyị see onyinyo ya, ya bụ Sera, ezi nwunye nke Abraham. E soroghị nzukọ nke a gbaa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ya mere “Jerusalem nke dị n’elu” nweere onwe ya, dị ka Sera nke oge ochie. Nke a bụ nzukọ ahụ wepụtara “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, ọ bụkwa n’ihi ya ka Pọl onyeozi pụrụ iji kpọọ ya “nne anyị.”
14. Ọgbụgba ndụ Abraham ò metụtara “Jerusalem nke dị n’elu,” gịnịkwa ka a pụrụ ịkpọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ?
14 N’ezie, mgbe ahụ, ọgbụgba ndụ Abraham metụtara ya dị ka nwanyị ihe atụ nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, ee, nzukọ eluigwe na ala nke Jehova n’ebe ahụ n’eluigwe. O si otú a bụrụ na ndị ahụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ, bụ ụmụ ndị ikom, ma ọ bụ ụmụ, nke ọgbụgba ndụ Abraham, dị ka Pọl onyeozi bụ. Pọl gara n’ihu iche echiche n’ụzọ dị otú ahụ, na-asị:
15. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Galetia 4:27-31 banyere “ụmụ” nke ọgbụgba ndụ Abraham?
15 “N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ka obi na-atọ gị ụtọ, nwanyị àgà nke na-adịghị amụ nwa; tiwaa mkpu ọṅụ, tiekwa mkpu, gị onye ime na-adịghị eme: n’ihi na ụmụ nke nwanyị a hapụrụ nanị ya dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị ahụ nwere di. Ma anyị onwe anyị, ụmụnna m, bụ ụmụ nke nkwa, dị ka Aịsak. Ma dị ka onye a mụrụ n’ụzọ anụ ahụ sogburu onye a mụrụ n’ụzọ mmụọ nsọ mgbe ahụ, ọbụna otú a ka ọ dị ugbu a. Otú ọ dị, gịnị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ na-ekwu? Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya nwoke: n’ihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa nke nwanyị ahụ nke nweere onwe ya keta ihe. N’ihi nke a, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke ohu nwanyị, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị ahụ nwere onwe ya.”—Ndị Galetia 4:27-31; Aịsaịa 54:1.
16. Gịnị ka ihe atụ oge ochie ndị ahụ kwuru ga-eme n’ọdịnihu banyere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, nke a na-eme ka gịnị fọdụ?
16 Otú a ihe atụ ahụ mere n’oge ochie buru amụma na n’ọdịnihu Jehova Chineke, bụ́ Abraham ahụ Ka Ukwuu, ga-ewezụga ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke a gaje isoro Israel gbaa n’Ugwu Saịnaị. N’ụzọ dị otú a, a ga-esepụ, ma ọ bụ wepụ ihe ahụ (ọgbụgba ndụ Iwu ahụ) a gbakwụnyere n’ọgbụgba ndụ Abraham ahụ, na-ahapụ nanị ọgbụgba ndụ Abraham ahụ ya na nkwa ya nke otu “mkpụrụ” nke ọ bụ site na ya ka ezinụlọ nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.
17. (a) Ruo ogologo oge dị aṅaa ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ gaje ịnọgide? (b) N’ihi gịnị ka Jisọs Kraịst ji bụrụ nwa bụ isi nke Abraham? (ch) Jisọs ịbụ Onye Isi nke Chineke doro maka ịgọzi ezinụlọ nile nke ụwa dabeere na gịnị?
17 Ya mere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ a gbakwụnyere agbakwụnye ga-anọgide ruo mgbe “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa bịarutere, nke a kwa mesịrị bụrụ Jisọs Kraịst. Site n’ọrụ ebube Chineke, ọ ghọrọ nwa anụ ahụ nke Abraham. Ọ ghọrọ nwa bụ isi nke nna ochie ahụ. Ọ bụghị nanị nwa anụ ahụ nke Abraham ka ọ bụ, kama ọ bụ Ọkpara Chineke, n’ihi ya kwa bụrụ mmadụ zuru okè, onye nọgidere bụrụ “onye dị ọcha n’obi, onye na-enweghị obi ọjọọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụworo n’etiti ndị mmehie.” (Ndị Hibru 7:26) Otú ọ dị, ya ịbụ Onye Isi nke Chineke doro maka ịgọzi ezinụlọ nile nke elu ala dabeere na ya ịchụ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà na itinye uru ya n’ọrụ maka ọdịmma nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Site n’àjà onwe onye dị otú a, ọ ga-eje ozi dị ka Onye Isi Nchụàjà ukwu nke Jehova, na-achụ àjà nke mezuru ihe nile nke Chineke chọrọ.
A Kpọgide Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ n’Osisi Ịta Ahụhụ nke Jisọs
18. (a) Olee ndị ka a ga-ebu ụzọ nye uru nke àjà mgbapụta ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka Jisọs ghọrọ?
18 A ga-ebu ụzọ nye uru dị iche iche nke àjà mgbapụta nke a n’ihi mba ndị Juu, nke Jisọs ghọworo onye òtù ya site n’ọmụmụ a mụrụ ya n’ụzọ ọrụ ebube site na Meri bụ́ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Nke a dị ezigbo mkpa n’ihi na ndị Juu ji ụzọ abụọ nọrọ n’okpuru ikpe ọmụma nke ọnwụ. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, ha bụ ụmụ nke onye mmehie ahụ bụ Adam, nke abụọkwa, n’ihi ezughị okè ha, ha abụwo ndị a bụrụ ọnụ n’ihi ọdịda ha dara ịdị ndụ kwekọrọ n’ọgbụgba ndụ Iwu nke ha na Chineke gbara. Otú ọ dị, Jisọs ghọrọ onye a bụrụ ọnụ n’ihi ha. Site n’ịbụ onye a kpọgidere n’elu osisi ịta ahụhụ ruo ọnwụ, o nwere ike iwepụ “atụrụ furu efu nke ụlọ Israel” n’ọbụbụọnụ ahụ. Na 33 O.A., a kpọgidere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’osisi ịta ahụhụ nke Jisọs, e mechikwara ogige atụrụ nke ndị Juu ahụ nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na-adị nwa oge, kpochapụ ya.—Matiu 15:24; Ndị Galetia 3:10-13; Ndị Kọlọsi 2:14.
19. (a) Ogige atụrụ ọhụrụ dị aṅaa ka a na-aghaghị imepe, gịnịkwa ga-adị n’ime ya? (b) N’ihi ya ndị ahụ a kpọbatara n’ogige atụrụ ọhụrụ ahụ ga-aghọ gịnị?
19 Ya mere a ghaghị imeghe ogige atụrụ ọhụrụ iji debe atụrụ ime mmụọ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ e si n’ọnwụ kpọlite, bụ́ Jisọs Kraịst. Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ na-achụ onwe ya n’àjà bụkwa ọnụ ụzọ ihe atụ ahụ nke ogige atụrụ ọhụrụ nke a. (Jọn 10:7) Ndị a kpọbatara n’ogige atụrụ ọhụrụ nke a n’okpuru Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ na-aghọ ụmụ nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, ndị e ji mmụọ nsọ mụọ, sikwa otú a bụrụ akụkụ nke “mkpụrụ” Ya. (Ndị Rom 2:28, 29) Dị ka ihe na-egosi ịbụ eziokwu nke okwu a, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a ihe fọdụrụnụ ná “mkpụrụ” ime mmụọ ahụ anọwo na-eje ozi dị ka ihe ngọzi nye ọtụtụ nde mmadụ na-aba ụba n’ihe karịrị 230 ala dị iche iche.
[Foto dị na peeji nke 80, 81]
Ọgbụgba ndụ Iwu Mosis ahụ e mere n’Ugwu Saịnaị bịara ná njedebe mgbe a kpọgidekọrọ ya na Jisọs n’elu osisi ịta ahụhụ