Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 2 p. 14-31
  • Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ MERE MGBE JEREMAYA NA-EBU AMỤMA
  • MGBANWE NDỊ E NWERE N’OKPUKPE NA JUDA
  • “DEE IHE NIILE M GWARA GỊ”
  • BABỊLỌN MALITERE ỊCHỊ
  • MGBE EZE IKPEAZỤ NKE SI N’EZINỤLỌ DEVID CHỊRỊ
  • ỌRỤ JEREMAYA RỤRỤ N’ETITI NDỊ FỌDỤRỤ NA JUDA
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Jehova Emewo Ihe O bu n’Obi”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 2 p. 14-31

ISI NKE ABỤỌ

Ije Ozi “n’Oge Ikpeazụ”

1, 2. (a) Olee ọhụụ Jeremaya hụrụ nke bụ́ isi ihe dị n’amụma ndị o buru? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’amụma Jeremaya?

CHINEKE jụrụ Jeremaya, bụ́ onye amụma ọ họpụtara ọhụrụ, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” Nwa okorobịa ahụ bụ́ Jeremaya zara ya, sị: “M na-ahụ ite e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara, nke a fụnwuru ọkụ n’okpuru ya, ọnụ ya echeghịkwa ihu n’ebe ugwu.” Ọhụụ ahụ mere ka a mata n’oge ụdị ozi Jeremaya ga na-ezi ndị mmadụ. (Gụọ Jeremaya 1:13-16.) Ihe mere e ji fụnwuo ọkụ n’okpuru ite isi nri ahụ e ji mee ihe atụ abụghị ka e mee ka ọ jụọ oyi, kama ọ bụ ka ọkụ ahụ na-enwusi ike. N’ezie, Jehova ji ya na-ebu amụma na a ga-esi n’ite ahụ wụpụta nsogbu dị ka mmiri dị ezigbo ọkụ. A ga-awụ ya ndị bi na Juda n’ihi na ha ekwesịghị ntụkwasị obi. Olee ihe i chere mere ọnụ ite ahụ ji chee ihu n’ebe ndịda? Ọ pụtara na nsogbu ga-esi n’ebe ugwu bịa, ya bụ na Babịlọn ga-esi n’ebe ahụ bịa buso ha agha. Ọ bụkwa ihe merenụ. N’afọ niile ahụ Jeremaya buru amụma, ọ hụrụ oge dị iche iche e si n’ite isi nri ahụ, nke mmiri dị na ya na-agbọ agbọ, wụsa Juda nsogbu dị ka mmiri dị ezigbo ọkụ. Nke ikpeazụ n’ime ha bụ mgbe e bibiri Jeruselem.

2 Babịlọn adịghịzi, ma i kwesịrị inwe mmasị n’amụma ndị ahụ Jeremaya buru. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị bi “n’oge ikpeazụ,” mgbe ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ Ndị Kraịst; ma Chineke anaghị ele ha na chọọchị ha anya ọma. (Jere. 23:20) Anyị na Ndịàmà ibe anyị adịghị ka ha. Kama anyị na-ekwusa ma ozi ikpe ma ozi olileanya dị ka Jeremaya.

Foto dị na peeji nke 14

3. (a) Olee otú e si hazie ihe e dere n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jeremaya? (b) Gịnị bụ isi ihe mere e ji dee Isi nke Abụọ nke akwụkwọ a?

3 O nwere ike ịbụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka Jeremaya rụchaa ọrụ ibu amụma ya ka ọ gwara odeakwụkwọ ya ihe ndị ọ ga-ede kama ide ihe ndị ahụ merenụ mgbe ha na-eme. (Jere. 25:1-3; 36:1, 4, 32) N’akwụkwọ Jeremaya, e deghị ihe ndị merenụ n’usoro n’usoro, otú ha si mee, n’ihi na Jeremaya haziri ọtụtụ ihe o dere dabere n’ihe ọ na-akọ. N’ihi ya, ọ ga-abara gị uru ịmụ banyere ihe ụfọdụ dị mkpa mere n’oge ahụ a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá, nakwa usoro ihe ndị ahụ si mee. Lee chaatị dị na peeji nke 19. Mgbe ị na-agụ ihe ọ bụla n’akwụkwọ ndị ahụ, ọ bụrụ na ị mata eze na-achị Juda mgbe ihe ahụ na-eme, nakwa mgbe ụfọdụ, ihe na-eme na Juda nakwa ná mba ndị gbara ya gburugburu, ọ ga-eme ka ị ghọtakwuo ihe Jeremaya kwuru ma ọ bụ ihe o mere. Ọ ga-eme ka i ritekwuo uru n’ozi Chineke si n’ọnụ Jeremaya zie ndị ya.

IHE NDỊ MERE MGBE JEREMAYA NA-EBU AMỤMA

4-6. Gịnị bụ ọnọdụ ndị Chineke ọtụtụ afọ tupu Jeremaya amalite ibu amụma?

4 Jeremaya buru amụma n’oge e nwere oké ọgba aghara. Ọ bụ oge ndị Asiria, ndị Babịlọn na ndị Ijipt na-azọ ndị bụ́ ọkaibe. Ihe dị ka afọ iri itoolu na atọ tupu Jeremaya amalite ibu amụma, ndị Asiria meriri alaeze ebo iri Izrel nke dị n’ebe ugwu ma dọrọ ọtụtụ ndị bi na ya laa n’obodo ha. N’oge ahụ, Jehova chebere Jeruselem na Hezekaya bụ́ eze ya kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ndị Asiria bịara ibuso ha agha. I nwere ike icheta otú Chineke si jiri otu mmụọ ozi gbuo otu narị puku ndị agha na iri puku asatọ na puku ise, bụ́ ndị iro. (2 Eze 19:32-36) Manase bụ otu n’ime ụmụ Hezekaya. Ọ ga-abụ na a mụrụ Jeremaya mgbe Manase chịrịla afọ iri ise na ise, bụ́ mgbe Asiria chịwara Juda.—2 Ihe 33:10, 11.

5 Ọ bụ Jeremaya dere akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ na nke Abụọ, bụ́ ebe kwuru na Manase wughachiri ebe ndị dị elu nna ya bibiri. Manase rụụrụ Bel na ìgwè ihe ndị dị n’eluigwe ebe ịchụàjà, ọbụna n’ụlọ nsọ Jehova. Manase kwafuru ọbara nke ọtụtụ ndị na-emeghị ihe ọjọọ, werekwa nwa ya nwoke chụọrọ arụsị àjà nsure ọkụ. E kwuo ya ná nkenke, “o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu.” N’ihi ihe ọjọọ niile ahụ o mere, Chineke kwuru na ọdachi ga-adakwasị Jeruselem na Juda otú ahụ ọ dakwasịrị Sameria na Izrel. (2 Eze 21:1-6, 12-16) Mgbe Manase nwụrụ, nwa ya nwoke bụ́ Emọn malitekwara ife arụsị dị ka nna ya fere. Ma ihe gbanwere n’oge na-adịghị anya. Mgbe afọ abụọ gachara, e gburu Emọn. Nwa ya nwoke dị afọ asatọ bụ́ Josaya malitekwara ịchị n’afọ 659 T.O.A.

6 Mgbe Josaya chịrị afọ iri atọ na otu, Babịlọn malitere ịkpa ike karịa Asiria. Josaya chọpụtara na oge eruola ka ọ napụta Juda n’aka ndị mba ọzọ na-achị ya. Josaya emeghị ka nna ya na nna nna ya. O jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ma maliteghachi ofufe dị ọcha. (2 Eze 21:19–22:2) Mgbe Josaya chịrị afọ iri na abụọ, o kpochapụrụ ebe ndị dị elu, ogwe osisi dị nsọ na arụsị a pịrị apị n’ebe niile ọ na-achị ma mechaa nye iwu ka a rụzie ụlọ nsọ Jehova. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:1-8.) Buru n’obi na ọ bụ n’afọ nke iri na atọ nke ọchịchị Josaya (n’afọ 647 T.O.A.) ka Chineke họpụtara Jeremaya ịbụ onye amụma ya.

Olee otú ọ gaara adị gị ma a sị na ị bụ onye amụma n’oge ahụ Jeremaya buru amụma?

7, 8. (a) Olee otú ọchịchị Eze Josaya si dị iche na nke Manase na Emọn, bụ́ ndị bu ya ụzọ chịa? (b) Olee ụdị mmadụ Josaya bụ? (Gụọ igbe dị na peeji nke 20.)

7 Ka a nọ na-arụzi ụlọ nsọ ahụ n’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị eze ọma bụ́ Josaya, nnukwu onye nchụàjà hụrụ “akwụkwọ iwu” Jehova. Odeakwụkwọ eze gụpụtaara ya ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. Josaya chọpụtara na ndị obodo ya emehiela, ya agwazie Họlda bụ́ onye amụma nwaanyị ka ọ gwa ya ihe Jehova chọrọ ka o mee. Eze gwara ndị ọ na-achị ka ha na-edebe iwu Chineke. Họlda gwara Josaya na Jehova ga-eme ka “ọdachi” dakwasị ndị Juda n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha. Ma ebe ọ bụ na Josaya hụrụ ofufe dị ọcha n’anya, anya ya agaghị ahụ ọdachi ahụ.—2 Eze 22:8, 14-20.

Chaatị dị na peeji nke 19

8 Eze Josaya maliteghachiri ọrụ ya, nke bụ́ ibibi ihe ọ bụla gbasara ikpere arụsị. Ịnụ ọkụ n’obi ya mere ka ọ gaa n’ebe bụbu ókèala alaeze ebe ugwu nke Izrel ma kwatuo ebe dị elu nakwa ebe ịchụàjà dị na Betel. O nyekwara iwu ka e mee Ememme Ngabiga pụrụ iche. (2 Eze 23:4-25) Chetụgodị ụdị obi ụtọ Jeremaya nwere n’ihi ihe a niile Josaya mere! Ma o siiri ndị ọ na-achị ike ịgbanwe omume ọjọọ ha. Manase na Emọn kụziiri ha ife arụsị. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha hapụrụ ezi ofufe. N’agbanyeghị ihe niile Josaya mere iji kwụsị ikpere arụsị, Chineke mere ka Jeremaya kwuo na chi ndị bi na Juda na-efe dị ọtụtụ dị ka obodo ha. Ndị obodo Jeremaya yiri nwaanyị hapụrụ di ya gakwuru nwoke ọzọ, nke pụtara na ha hapụrụ Jehova gaa fewe chi ọzọ. Jeremaya kwuru, sị: “Unu arụworo ihe ihere ọtụtụ ebe ịchụàjà dị ka e nwere ọtụtụ okporo ámá na Jeruselem, bụ́ ebe ịchụàjà maka isurere Bel ihe nsure ọkụ.”—Gụọ Jeremaya 11:1-3, 13.

9. Olee ihe ndị mere ná mba ndị ha na Juda gbara agbata obi mgbe ọ fọrọ afọ ole na ole ka Josaya chịchaa?

9 Ozi Jeremaya emeghị ka ndị Juu ahụ gbanwee omume ọjọọ ha, o meghịkwa ka mba ndị gbara ha gburugburu kwụsị ịna-azọ ndị bụ́ ọkaibe. N’afọ 632 T.O.A., ndị agha Babịlọn na ndị agha Midia jikọrọ aka merie Ninive, bụ́ isi obodo Asiria. Mgbe afọ atọ gachara, Fero Niko bụ́ eze Ijipt kpọọrọ ndị agha ya gawa ebe ugwu ịga nyere ndị Asiria aka, bụ́ ndị a na-ebuso agha n’oge ahụ. Ma n’ihi ihe ụfọdụ Baịbụl na-agwaghị anyị, Josaya gbalịrị ime ka ndị agha Ijipt si na Megido pụọ. Ma, a gbarụrụ ya ahụ́, o wee nwụọ. (2 Ihe 35:20-24) Olee mgbanwe ọnwụ Josaya ga-eme ka e nwee n’ọchịchị Juda nakwa n’okpukpe ya? Oleekwa nsogbu ndị ọ ga-eme ka Jeremaya nwee?

MGBANWE NDỊ E NWERE N’OKPUKPE NA JUDA

10. (a) Olee otú ihe ndị mere mgbe Josaya nwụchara si yie ihe ndị na-eme n’oge anyị a? (b) Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị atụlee otú Jeremaya si kpaa àgwà?

10 Chetụgodị otú obi dị Jeremaya mgbe ọ nụrụ na Josaya anwụọla! O wutere ya. Ọ bụ ya mere o ji bụọrọ eze ahụ abụ iru uju. (2 Ihe 35:25) Obi ebula ụzọ koro ndị Juda n’elu. Mgbanwe ndị e nwere n’ọchịchị mba ndị gbara ha gburugburu mekwara ka ihe sikwuoro ha ike. Mba atọ na-asọrịta mpi bụ́ Ijipt, Asiria, na Babịlọn nọ na-azọ ndị ga na-achị Juda. Ọnwụ Josaya mekwara ka e nwee mgbanwe n’okpukpe Juda. Ọchịchị Josaya mere ka ọ dịrị Jeremaya mfe ịrụ ọrụ ya. Mgbe ọ nwụrụ, eze na-achị Juda mere ka o siere Jeremaya ike ịrụ ọrụ ya. Ọtụtụ ụmụnna anyị n’oge anyị a ahụla ụdị mgbanwe ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-ekwetụ ka ha nwere onwe ha ife Chineke, ma na mberede, a malite ịkpagbu ha ma machibido ọrụ ha iwu. Ònye ma mmadụ ole n’ime anyị ụdị ihe ahụ nwere ike ime n’ọdịnihu? Olee otú nke a nwere ike isi metụta anyị? Gịnị ka anyị ga-eme iji nọsie ike n’ofufe Chineke? Ọ bụrụ na anyị eburu ajụjụ ndị ahụ n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịmata nsogbu ndị Jeremaya meriri.

JOSAYA BỤ EZE ỌMA IKPEAZỤ CHỊRỊ JUDA

Foto dị na peeji nke 20

Josaya ghọrọ eze Juda mgbe Emọn bụ́ nna ya nwụrụ. Ọ dị afọ asatọ mgbe ahụ. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ malitere ịchọ Chineke ma ‘na-eje ije n’ụzọ dum Devid bụ́ nna nna ya jere.’ Mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, ọ malitere ikpochapụ ebe a na-anọ efe arụsị na Juda nakwa n’Izrel na ịkụrisị arụsị ha. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise, ọ malitere ịrụzi ụlọ nsọ Jehova.—2 Eze 21:19–22:2; 2 Ihe 34:2-8.

A hụrụ akwụkwọ Iwu Mozis mgbe a na-arụzi ụlọ nsọ ahụ ma gụọrọ ya Josaya. Ma eleghị anya, akwụkwọ Iwu ahụ bụ nke ahụ Mozis ji aka ya dee. Josaya wedara onwe ya ala, dọwaa uwe ya ma kwaa ákwá. O mere ndokwa ka a gụọrọ ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ndị niile ọ na-achị, ma ndị ukwu ma ndị nta, akwụkwọ Iwu ahụ. Baịbụl kwuru na eze ṅụrụ iyi “na ha ga na-eso Jehova, na ha ga-ejikwa obi ha dum na mkpụrụ obi ha dum na-edebe ihe o nyere n’iwu.” Mgbe e mechara, Eze Josaya kpochapụrụ ofufe arụsị n’ala niile nke ụmụ Izrel, mekwaara Jehova nnukwu Ememme Ngabiga, nke a na-emetụbeghị ụdị ya kemgbe ụbọchị Samuel.—2 Ihe 34:14–35:19.

11. Gịnị mere na Juda mgbe Josaya nwụchara?

11 Ndị bi na Juda mere ka nwa Josaya bụ́ Jehoahaz bụrụ eze na Jeruselem. Jehoahaz, onye a kpọkwara Shalọm, chịrị naanị ọnwa atọ. Mgbe Fero Niko lụsochara ndị Babịlọn agha ma gaghachi n’ebe ndịda, ọ chụturu eze ọhụrụ ahụ, kpụrụ ya laa Ijipt. Jeremaya kwukwara na Jehoahaz ‘agaghị alọta ọzọ.’ (Jere. 22:10-12; 2 Ihe 36:1-4) Niko mere Jehoyakim, bụ́kwa nwa Josaya, eze nọchiri Jehoahaz. Jehoyakim eṅomighị àgwà ọma nna ya. Kama ịmalite ebe nna ya kwụsịrị n’ikpochapụ arụsị, o kpeere arụsị.—Gụọ 2 Eze 23:36, 37.

12, 13. (a) Olee otú ndị mmadụ sizi na-efe Chineke mgbe Jehoyakim malitere ọchịchị ya? (b) Gịnị ka ndị ndú okpukpe Juu mere Jeremaya?

12 Ná mmalite ọchịchị Jehoyakim, Jehova gwara Jeremaya ka ọ gaa n’ụlọ nsọ ma gwa ndị bi na Juda hoo haa na ihe ha na-eme jọgburu onwe ya. Ha chere na ụlọ nsọ Jehova bụ ọtụmọkpọ ga na-echebe ha. Ma ọ bụrụ na ha ahapụghị ‘ohi ha na-ezu, ọchụ ha na-egbu, iko ha na-akwa, iyi ụgha ha na-aṅụ, isurere Bel ihe nsure ọkụ, na iso chi ọzọ dị iche iche,’ Jehova ga-ahapụ ụlọ nsọ ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ ga-agbahapụ ndị ihu abụọ na-anọ na ya efe ofufe otú ahụ ọ gbahapụrụ ụlọikwuu ahụ dị na Shaịlo n’oge Ilaị bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà. Ala Juda “ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.” (Jere. 7:1-15, 34; 26:1-6)a Chegodị ụdị obi ike Jeremaya kwesịrị inwe iji zie ha ozi a! Ma eleghị anya, o ziri ozi ahụ n’ihu ọha n’ebe ndị ukwu na ndị a ma ama nọ. Ụfọdụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị taa achọpụtala na ha kwesịrị inwe obi ike iji gbaa àmà n’okporo ámá ma ọ bụ iji gwa ndị aka ji akụ̀ na ndị ukwu okwu. Ma obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-enyere anyị aka otú ahụ o nyeere Jeremaya.—Hib. 10:39; 13:6.

Foto dị na peeji nke 22

13 Gịnị ka ndị ndú okpukpe ga-eme mgbe ha nụrụ okwu Jeremaya ebe ọ bụ na e nweela mgbanwe ma n’okpukpe ma n’ọchịchị na Juda? Onye amụma ahụ kwuru na ‘ndị nchụàjà na ndị amụma na mmadụ niile ahụ jidere ya, sị ya, “Ị ga-anwụrịrị.”’ Ezigbo iwe ji ha. Ha wee sị: “E kwesịrị ịma nwoke a ikpe ọnwụ.” (Gụọ Jeremaya 26:8-11.) Ma ndị na-emegide Jeremaya egbughị ya. Jehova nọnyeere onye amụma ya ma napụta ya. Ma Jeremaya atụghị ndị na-emegide ya egwu n’agbanyeghị na ha dị ọtụtụ ma ka ya ike. I kwesịrị iṅomi Jeremaya.

Olee ihe i chere dị iche n’ọchịchị Manase, Emọn, na Josaya? Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’otú Jeremaya si rụọ ọrụ siri ike e nyere ya?

“DEE IHE NIILE M GWARA GỊ”

14, 15. (a) Olee ọrụ Jeremaya na odeakwụkwọ ya bụ́ Barọk malitere ịrụ n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim? (b) Olee ụdị onye Jehoyakim bụ? (Gụọ igbe dị na peeji nke 25.)

14 N’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim, Jehova gwara Jeremaya ka o dee ihe niile ọ gwara ya malite n’ụbọchị Josaya. N’ihi ya, Jeremaya gwara odeakwụkwọ ya bụ́ Barọk ihe ọ ga-ede, bụ́ ihe niile Chineke gwara Jeremaya kemgbe iri afọ abụọ na atọ. O ziri ihe dị ka alaeze iri abụọ nakwa ndị eze ha ozi ikpe Chineke. Jeremaya nyere Barọk iwu ka o jiri olu dara ụda gụpụta akwụkwọ mpịakọta ahụ n’ụlọ Jehova. Gịnị mere ọ ga-eji gụpụta ya? Jehova kwuru, sị: “Ikekwe, ndị ụlọ Juda ga-ege ntị nụrụ ọdachi niile m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ha, onye nke ọ bụla ewee hapụ ụzọ ọjọọ ya, ka m wee gbaghara ha njehie ha na mmehie ha.”—Jere. 25:1-3; 36:1-3.

15 Mgbe onye na-eje ozi n’obí Eze Jehoyakim gụụrụ ya akwụkwọ mpịakọta ahụ, eze chabiri ya ma kpọọ ya ọkụ. O nyeziri iwu ka a kpọtara ya Jeremaya na Barọk. “Ma Jehova zoro ha.” (Gụọ Jeremaya 36:21-26.) N’ihi otú àgwà Jehoyakim si jọgbuo onwe ya, Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo na “a ga-eli ya dị ka oké ịnyịnya ibu.” ‘A ga-akpụrụ ya n’ala gaa tụfuo ná mpụga ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.’ (Jere. 22:13-19) Ì chere na amụma a a kọwara nke ọma agaghị emezu, na Jeremaya tinyere ya nnu na ose?

16. Olee ozi olileanya Jeremaya ziri ndị mmadụ?

16 Jeremaya ziri ndị mmadụ ozi ikpe Chineke. Ma, o bughị amụma naanị banyere mbibi. O zikwara ndị mmadụ ozi olileanya, nke bụ́ na Jehova ga-anapụta ndị Izrel fọdụrụnụ n’aka ndị iro ha ma kpọlata ha n’ala ha, bụ́ ebe ha ga-ebi, obi eruo ha ala. Chineke na ndị ya ‘ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.’ Ọ ga-edekwa iwu ya n’obi ha. Ọ ga-agbaghara ha njehie ha, ọ gaghịkwa echeta mmehie ha. Ihe ọzọ bụ na nwa Devid ‘ga-eme ihe n’ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume n’ala ahụ.’ (Jere. 31:7-9; 32:37-41; 33:15) Ụfọdụ n’ime amụma ndị ahụ ga-emezu ma ọtụtụ iri afọ gachaa. Ndị ọzọ ga-emezukwa mgbe ọtụtụ narị afọ gachara. Mmezu ha na-emetụtakwa ndụ anyị ma mee ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma n’oge Jeremaya, ndị iro Juda ka nọkwa na-azọ ndị ga na-achị Juda.—Gụọ Jeremaya 31:31, 33, 34; Ndị Hibru 8:7-9; 10:14-18.

BABỊLỌN MALITERE ỊCHỊ

17, 18. N’afọ ndị ikpeazụ nke ọchịchị Jehoyakim na nke Zedekaya, olee ihe ndị mere ná mba ndị ha na Juda gbara agbata obi?

17 N’afọ 625 T.O.A., ndị Babịlọn na ndị Ijipt lụrụ agha kpụ ọkụ n’ọnụ na Kakemish, nke dị n’akụkụ Osimiri Yufretis, n’ebe ugwu Jeruselem. Isi na Kakemish ruo Jeruselem dị ihe dị ka narị kilomita isii. Eze Nebukadneza meriri ndị agha Fero Niko, nke mere ka Ijipt kwụsị ịchị ebe ahụ niile. (Jere. 46:2) Juda nọ n’okpuru Nebukadneza n’oge ahụ. Nebukadneza mekwara ka Jehoyakim bụrụ ohu ya. Ma mgbe Jehoyakim chịrị afọ atọ n’okpuru ya, o nupụụrụ ya isi. (2 Eze 24:1, 2) N’ihi ya, Nebukadneza na ndị agha ya batara na Juda n’afọ 618 T.O.A. ma gbaa Jeruselem gburugburu. Jirigodị anya nke uche gị hụ ụdị ihe isi ike e nwere mgbe ahụ. Ihe sikwaara Jeremaya bụ́ onye amụma Chineke ike. O nwere ike ịbụ mgbe ahụ a nọchibidoro Jeruselem ka Jehoyakim nwụrụ.b Nwa ya bụ́ Jehoyakin chịliiri ndị Babịlọn aka elu mgbe ọ chịchara Juda naanị ọnwa atọ. Nebukadneza bukọọrọ akụ̀ dị na Jeruselem ma dọrọ Jehoyakin, ndị ezinụlọ ya, ndị ezinụlọ nke ndị a ma ama na Juda, ndị dike n’obodo ahụ, na ndị omenkà ya n’agha laa Babịlọn. Daniel, Hananaya, Mishel, na Azaraya so ná ndị ahụ a dọọrọ n’agha.—2 Eze 24:10-16; Dan. 1:1-7.

18 Nebukadneza meziri Zedekaya bụ́kwa nwa Josaya eze Juda. Ọ bụ ya bụ eze ikpeazụ nke ga-esi n’agbụrụ Devid chịa na Jeruselem. Ọchịchị ya kwụsịrị n’afọ 607 T.O.A., bụ́ mgbe e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya. (2 Eze 24:17) Ma n’afọ iri na otu ahụ Zedekaya chịrị, obi kooro ndị mmadụ n’elu na Juda, ma ndị na-achị achị ma ndị ha na-achị. O doro anya na Jeremaya kwesịrị ịtụkwasị Onye ahụ nyere ya ọrụ ibu amụma obi kpamkpam.

JEHOYAKIM BỤ EZE GBURU ONYE AMỤMA JEHOVA

Foto dị na peeji nke 25

Jehoyakim dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ malitere ịchị Juda. Ọ chịkwara afọ iri na otu. Ihe E Mere nke Abụọ 36:5-8 chịkọtara ihe niile o mere ma kwuo na ọ bụghị naanị na ihe o mere jọrọ njọ, kama ọ bụ “ihe arụ.” Jehoyakim leghaara aka ná ntị Jeremaya dọrọ ya anya. Mgbe ọ na-achị, o kpere ikpe na-ezighị ezi, pụnara ndị mmadụ ihe ha, gbuokwa ọchụ. Mgbe Yuraịja onye amụma kwusara ụdị ozi ahụ Jeremaya kwusara, Jehoyakim gburu ya. Ọ dị ka ọ̀ bụ mgbe ahụ ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem ka Jehoyakim nwụrụ.—Jere. 22:17-19; 26:20-23.

19. Olee ihe ndị obodo Jeremaya mere mgbe ọ na-ezi ha ozi, gịnịkwa mere i ji kwesị inwe mmasị n’akụkọ ahụ?

19 Weregodị ya na ị bụ Jeremaya. Kemgbe oge Josaya, Jeremaya ahụla ọtụtụ mgbe e nwere mgbanwe ọchịchị nakwa mgbe ndị Chineke hapụrụ ife ya. Ma ọ ma na ihe ga-aka njọ. Ndị obodo ya gwara ya, sị: “Ebula amụma n’aha Jehova, ka ị ghara ịnwụ n’aka anyị.” (Jere. 11:21) Ọbụna mgbe amụma ndị Jeremaya buru mezuru, ndị Juu kwuru, sị: “Anyị agaghị ege ntị n’okwu ị gwara anyị n’aha Jehova.” (Jere. 44:16) Ma n’oge ahụ, a ga-ebibi ndị na-egeghị ntị n’okwu Jehova. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị taa. Ozi ị na-ekwusa yiri ozi Jeremaya kwusara n’ihi na o si n’aka Jehova. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị tụlee otú Jehova si chebe onye amụma ya bụ́ Jeremaya tupu e bibie Jeruselem, ọ ga-eme ka ị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi gị.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’àgwà Jeremaya kpara n’oge Jehoyakim na-achị? Olee amụma pụrụ iche Jeremaya buru nke na-emezu n’oge anyị a?

MGBE EZE IKPEAZỤ NKE SI N’EZINỤLỌ DEVID CHỊRỊ

20. Gịnị mere ihe ji kacha siere Jeremaya ike mgbe Zedekaya na-achị? (Gụọ igbe dị na peeji nke 29.)

20 Ikekwe, ọ bụ mgbe Zedekaya na-achị ka ọ kacha siere Jeremaya ike ịrụ ọrụ ibu amụma ya. Zedekaya kpara àgwà ka ndị bu ya ụzọ chịa, ya bụ, ọ nọgidere “na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.” (Jere. 52:1, 2) Ọ nọ n’okpuru ọchịchị ndị Babịlọn. Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn mekwara ka o jiri aha Jehova ṅụọ iyi na ọ ga na-erubere ya isi. Ma, Zedekaya mechara nupụrụ ya isi. N’oge ahụ, ndị iro Jeremaya gbalịsiri ike ime ka Jeremaya soro ha ná nnupụisi ahụ.—2 Ihe 36:13; Ezik. 17:12, 13.

21-23. (a) Olee òtù abụọ na-emegide ibe ha e nwere na Juda mgbe Zedekaya na-achị? (b) Gịnị ka ndị Juda mere Jeremaya n’ihi ihe ọ gwara ha, gịnịkwa mere i ji kwesị inwe mmasị n’akụkọ ahụ?

21 O doro anya na ọ bụ mgbe Zedekaya malitere ọchịchị ya ka eze Idọm, eze Moab, eze Amọn, eze Taya, na eze Saịdọn zitere ndị ozi ha na Jeruselem. Ọ ga-abụ na ndị ozi ahụ bịara ime ka Zedekaya soro lụso Nebukadneza agha. Ma, Jeremaya gwasiri Zedekaya ike ka o rubere Babịlọn isi. N’ihi ya, Jeremaya nyere ndị ozi ahụ osisi yok iji gosi na mba ndị ahụ dunyere ha ozi kwesịkwara ife Babịlọn. (Jere. 27:1-3, 14)c Ihe ahụ Jeremaya kwuru adịghị ndị mmadụ mma. Hananaya mekwara ka o siere Jeremaya ike ikwu ihe Chineke gwara ya kwuo, nke ha na-achọghị ịnụ. Hananaya bụ onye amụma ụgha nke ji aha Chineke na-agwa ndị Juda na a ga-emeri Babịlọn. Ma, Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo na onye nduhie ahụ bụ́ Hananaya ga-anwụ n’otu afọ ahụ. Ihe ahụ o kwuru mezuru.—Jere. 28:1-3, 16, 17.

22 E nweziri òtù abụọ na-emegide ibe ha na Juda, ya bụ, ndị kwuru ka a na-erubere ndị Babịlọn isi na ndị kwuru ka a na-enupụrụ ha isi. N’afọ 609 T.O.A., Zedekaya nupụrụ isi, ziga ozi ka ndị agha Ijipt bịa nyere ha aka. Nsogbu Jeremaya nweziri bụ ndị ahụ kwadoro ka e nupụrụ ndị Babịlọn isi, bụ́ ndị ịhụnanya ha hụrụ obodo ha na-agba ara. (Jere. 52:3; Ezik. 17:15) Nebukadneza na ndị agha ya laghachiri Juda ịga kwụsị ọgba aghara ahụ. O merikwara obodo niile dị na Juda ma nọchibido Jeruselem. Ihe Jeremaya gwara Zedekaya na ndị ọ na-achị n’oge ahụ ihe siri ike bụ na ndị Babịlọn ga-emeri Jeruselem. Ndị na-esighị n’obodo ahụ gbapụ ga-anwụ. Ndị gbakwuuru ndị Kaldia ga-adị ndụ.—Gụọ Jeremaya 21:8-10; 52:4.

23 Ndị isi Juda kwuru na Jeremaya na-akwado ndị iro ha bụ́ ndị Babịlọn. Mgbe o kwuru nke bụ́ eziokwu, ndị isi Juda tiri ya ihe ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. (Jere. 37:13-15) Jeremaya agaghị ahapụ izi ha ozi ikpe Jehova. N’ihi ya, ndị isi ahụ gwara Zedekaya ka o gbuo Jeremaya. Ha tụbara onye amụma ahụ n’olulu mmiri na-adịghị, nke apịtị dị na ya, bụ́ ebe ọ gaara anọ nwụọ. Ma Ibed-melek, bụ́ onye Itiopia nke na-eje ozi n’ụlọ eze, napụtara ya. (Jere. 38:4-13) Ndị Jehova n’oge anyị a ataakwala ahụhụ n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ọ na-akpata! O doro anya na akụkọ banyere Jeremaya nwere ike ime ka obi sie gị ike imeri ọnwụnwa ndị na-abịara gị.

ZEDEKAYA BỤ EZE IKPEAZỤ NKE CHỊRỊ JUDA N’OGE OCHIE

Foto dị na peeji nke 29

Eze Zedekaya bụ onye ụjọ nke na-anaghị akwụ otu ebe. Ọ na-eji ụjọ eme ihe ọ bụla ndị isi obodo ya gwara ya. Na nke ikpeazụ ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, Zedekaya gwara Jeremaya ka ọ jụọrọ ya Chineke ase. Ma, mgbe a gwara ya ka ọ chịliere ndị Babịlọn aka elu, o kweghị eme otú ahụ. Ebe ọ bụ na ihe Jeremaya kwuru adịghị Zedekaya mma, ọ tụrụ ya mkpọrọ. (Jere. 21:1-9; 32:1-5) N’agbanyeghị nke ahụ, eze ahụ ka nọkwa na-ajụ Jeremaya ase na nzuzo ka ọ ghara ịkpasu ndị isi Juda iwe. Mgbe ha chọrọ ka e gbuo Jeremaya, Zedekaya kwetara, jiri ụjọ sị: “Ọ nọ n’aka unu. N’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla eze pụrụ igbochi unu ime.” Mgbe a napụtara Jeremaya n’aka ọnwụ, eze jụrụ ya ase ọzọ ma kwuo na ya tụrụ ụjọ na ọ bụrụ na ya emee ihe Chineke kwuru, ndị Juda ga-emesi ya ike.—Jere. 37:15-17; 38:4, 5, 14-19, 24-26.

N’agbanyeghị na Zedekaya jụrụ Jeremaya ase, ‘o wedaghị onwe ya ala n’ihu Jeremaya. O kwesiri olu ike, kpọchiekwa obi ya wee ghara ịlọghachikwute Jehova.’—2 Ihe 36:12, 13; Ezik. 21:25.

24. Kọọ ihe ndị mere n’afọ 607 T.O.A.

24 N’afọ 607 T.O.A., ndị Babịlọn mechara kwatuo mgbidi Jeruselem ma bibie obodo ahụ. Ndị agha Nebukadneza gbara ụlọ nsọ Jehova ọkụ, kụrisịa mgbidi obodo ahụ ma gbuo ndị niile a ma ama na Juda. Zedekaya malitere ịgba ọsọ. Ma e jidere ya ma kpụrụ ya bịakwute onye meriri obodo ya. A nọ n’ihu Zedekaya gbuo ụmụ ya. Nebukadneza rụkpọsịkwara ya anya, tụọ ya ịgà, ma kpụrụ ya laa Babịlọn. (Jere. 39:1-7) N’ezie, ihe ahụ Jeremaya kwuru ga-eme Juda na Jeruselem mezuru. Kama ịṅụrịwa ọṅụ, onye amụma Chineke ruru uju n’ihi ọdachi ahụ dakwasịrị ndị obodo ya. Anyị nwere ike ịhụ otú obi dị ya ma anyị gụọ akwụkwọ Abụ Ákwá. Mgbe anyị na-agụ ya, o kwesịrị imetụ anyị n’obi nke ukwuu.

ỌRỤ JEREMAYA RỤRỤ N’ETITI NDỊ FỌDỤRỤ NA JUDA

25, 26. (a) Olee ihe ndị mere mgbe e merichara Jeruselem? (b) Mgbe e merichara Jeruselem, gịnị ka ndị obodo Jeremaya mere mgbe o ziri ha ozi?

25 Gịnị ka e mere Jeremaya mgbe ihe ndị a na-eme? Ndị isi Jeruselem tụrụ ya mkpọrọ, ma ndị Babịlọn, bụ́ ndị meriri obodo ahụ, mesoro ya omume obiọma ma tọhapụ ya. E mechara mee ka Jeremaya soro ụfọdụ ndị Juu a chị na-ala Babịlọn. Ma, ha mechara sị ya lawa. A ka nwere ihe ọ ga-arụ n’ozi Chineke; a ka nwere ọrụ ọ ga-arụ n’etiti ndị ahụ ndị Babịlọn hapụrụ na Juda. Nebukadneza mere Gedalaya gọvanọ na-achị ala ahụ. Eze Babịlọn kwere ndị ahụ ọ hapụrụ na Juda nkwa na ha ga-enwe udo ma ọ bụrụhaala na ha ana-erubere ya isi. Ma ụfọdụ ndị Juu iwe ji gara gbuo Gedalaya. (Jere. 39:13, 14; 40:1-7; 41:2) Jeremaya gwara ndị ahụ a hapụrụ na Juda ka ha biri n’ala ahụ ma ghara ịtụ eze Babịlọn egwu. Ma ndị ndú n’etiti ha kpọrọ Jeremaya onye ụgha ma gbaga n’Ijipt. Ha kpụkwa ma Jeremaya ma Barọk gaa. N’agbanyeghị nke ahụ, Jeremaya buru amụma na Nebukadneza ga-abịa buso Ijipt agha ma merie ya, meekwa ka ọdachi dakwasị ndị Juda gbagara ọsọ ndụ n’ebe ahụ.—Jere. 42:9-11; 43:1-11; 44:11-13.

26 Ọzọkwa, ndị obodo Jeremaya egeghị ntị n’ihe ezi onye amụma Chineke kwuru. N’ihi gịnị? Ha kwuru, sị: “Kemgbe anyị kwụsịrị isurere ‘eze nwaanyị nke eluigwe’ ihe nsure ọkụ na ịwụsara ya àjà ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọọla anyị, mma agha na ụnwụ egbuchawo anyị.” (Jere. 44:16, 18) Nke ahụ gosiri na o nweghịzi ihe ndị obodo Jeremaya ji ofufe Chineke kpọrọ! Ma o kwesịrị ịgba anyị ume n’ihi na o mere ka anyị mata na mmadụ na-ezughị okè nwere ike ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ n’agbanyeghị na ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi gbara ya gburugburu!

27. Gịnị ka Baịbụl gwara anyị mere mgbe ọ fọrọ afọ ole na ole ka Jeremaya rụchaa ọrụ ibu amụma ya?

27 Ihe ikpeazụ Jeremaya dere n’akwụkwọ ya bụ na Ivil-merodak, bụ́ eze nke nọchiri Nebukadneza, kpọpụtara Jehoyakin n’ụlọ mkpọrọ n’afọ 580 T.O.A. (Jere. 52:31-34) O nwere ike ịbụ na Jeremaya dị ihe dị ka afọ iri itoolu mgbe ahụ. O nweghị ihe bụ́ eziokwu anyị ma banyere ọnwụ ya. Ọ dị ka ò bi n’Ijipt ruo mgbe ọ nwụrụ, mgbe o jechaara Jehova ozi pụrụ iche n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ihe dị ka afọ iri isii na asaa. O jere ozi mgbe a na-efe ezi ofufe nakwa n’ọtụtụ afọ mgbe ndị hapụrụ ofufe Jehova gbara ya gburugburu. Ụfọdụ ndị na-atụ egwu Chineke gere ya ntị. Ma ọtụtụ ndị anabataghị ozi ya. Ha megidekwara ya. Ò mere ka ozi Jeremaya bụrụ ihe efu? Mbanụ! Jehova gwara ya ná mmalite, sị: “Ha ga-alụsokwa gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihi na ‘anọnyeere m gị.’” (Jere. 1:19) Ọrụ anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụ taa yiri ọrụ Jeremaya rụrụ. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịtụ anya na a ga-eme anyị ụdị ihe ahụ e mere Jeremaya. (Gụọ Matiu 10:16-22.) N’ihi ya, olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-eje ozi anyị? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a.

Gịnị mere Zedekaya na ndị ọ na-achị, bụ́ ndị jụrụ ozi Jeremaya? Olee ihe i chere banyere Jeremaya?

a Otú Jeremaya 7:1-15 na 26:1-6 si yie emeela ka ụfọdụ ndị kwuo na ebe abụọ ahụ na-akọ otu ihe.

b Daniel 1:1, 2 kwuru na Jehova nyefere Jehoyakim n’aka Nebukadneza n’afọ nke atọ nke ọchịchị Jehoyakim, nke nwere ike ịbụ n’afọ nke atọ ọ nọ n’okpuru Nebukadneza. Ma eleghị anya, nke ahụ pụtara na eze ahụ nwụrụ n’oge ahụ a nọchibidoro Jeruselem ma mechaa merie ya. Josifọs kwuru na Nebukadneza gburu Jehoyakim ma tụfuo ozu ya n’azụ mgbidi Jeruselem n’elighị ya eli. Ma Baịbụl ekwughị ihe ọ bụla gosiri na ọ bụ eziokwu.—Jere. 22:18, 19; 36:30.

c O nwere ike ịbụ na aha a kpọrọ Jehoyakim na Jeremaya 27:1 bụ ndehie ihe ebe ọ bụ na amaokwu nke 3 na nke 12 na-ekwu banyere Zedekaya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya