Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 1

      Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?

      Onyeàmà Jehova na Denmak

      Denmak

      Ndịàmà Jehova na Taịwan

      Taịwan

      Ndịàmà Jehova na Venezuwela

      Venezuwela

      Ndịàmà Jehova n’India

      India

      Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịbụ ndị agbata obi gị, ndị gị na ha na-arụ ọrụ ma ọ bụ ụmụ klas unu. O nwekwara ike ịbụ na o nweela mgbe anyị na gị kwurịtara ihe dị na Baịbụl. Ànyị bụ ndị ole? Gịnị mere anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma?

      Anyị bụ mmadụ ibe gị. E nwere ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị ọgaranya, nwee ndị na-enweghị ego, nweekwa ndị gụrụ akwụkwọ na ndị na-agụghị akwụkwọ. Ụfọdụ n’ime anyị nọbu n’okpukpe dị iche iche. E nwedịrị ndị nke na-ekwebughị na Chineke dị. Ma, tupu anyị aghọọ Ndịàmà Jehova, anyị wepụtara oge mụọ Baịbụl nke ọma. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Anyị nabatara ihe anyị mụtara, jirikwa aka anyị kpebie na anyị ga-efe Jehova.

      Ịmụ Baịbụl na-abara anyị uru. Anyị ezughị okè otú ahụ mmadụ niile na-ezughị okè, o nwekwara ihe ndị anyị na-anaghị emetacha. Ma, mbọ anyị na-agba kwa ụbọchị ịmụ Baịbụl emeela ka àgwà anyị dịkwuo mma. (Abụ Ọma 128:​1, 2) Ọ bụ ya bụ otu n’ime ihe mere anyị ji agwa ndị mmadụ ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl.

      Anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-akpa àgwà. Ihe ndị ọ na-akụziri anyị na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ma na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ na-emekwa ka anyị na-ekwu eziokwu ma na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ihe Baịbụl na-akụziri anyị na-eme ka anyị baara obodo anyị uru. Ọ na-emekwa ka udo dịrị n’ezinụlọ anyị dị iche iche. Ebe anyị ma na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu,” anyị na ụmụnna anyị dị n’otu n’ụwa niile. Anyị hụrụ ha niile n’anya n’agbanyeghị agbụrụ ha si, anyị anaghịkwa ese okwu n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ eziokwu na o nweghị onye n’ime anyị zuru okè, anyị dị iche.​—⁠Ọrụ Ndịozi 4:13; 10:​34, 35.

      • Olee ihe gosiri na Ndịàmà Jehova dị ka ndị ọzọ?

      • Olee ihe Ndịàmà Jehova mụtarala na Baịbụl?

  • Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 2

      Gịnị Mere Anyị Ji Na-aza Ndịàmà Jehova?

      Noa

      Noa

      Ebreham na Sera

      Ebreham na Sera

      Mozis

      Mozis

      Jizọs Kraịst

      Jizọs Kraịst

      Ọtụtụ ndị na-eche na okpukpe Ndịàmà Jehova bụ okpukpe ọhụrụ. Ma, kemgbe ihe karịrị puku afọ abụọ na narị asaa gara aga, Chineke kpọrọ ndị na-efe ya “ndị àmà” ya. (Aịzaya 43:​10-12) Tupu afọ 1931, ihe a na-akpọ anyị bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Gịnịzi mere anyị ji malite ịza Ndịàmà Jehova?

      E ji ya mara Chi anyị na-efe. N’Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie, aha Chineke bụ́ Jehova pụtara ihe karịrị ugboro puku asaa. N’ọtụtụ Baịbụl ndị e nwere taa, e jirila utu aha ndị dị ka Onyenwe Anyị ma ọ bụ Chineke dochie ya. Ma, mgbe Chineke gwara Mozis na aha ya bụ Jehova, ọ sịrị ya: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọpụpụ 3:15) O ji nke a gosi na ya dị iche na chi ụgha niile ndị mmadụ na-efe. Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ Ndịàmà Jehova.

      E ji ya ama ọrụ anyị na-arụ. Ọtụtụ ndị fere Chineke n’oge ochie gbaara ndị ọzọ àmà gbasara okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ. Onye mbụ n’ime ha bụ Ebel, onye ezi omume. Ka oge na-aga, Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Devid na ndị ọzọ bịara soro ná ndị Baịbụl kpọrọ “oké ìgwè ndị àmà.” (Ndị Hibru 11:4–12:⁠1) Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-eme ka ndị mmadụ mara nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke anyị otú ahụ mmadụ nwere ike kpebie na ya ga-aga n’ụlọikpe gbaara onye aka ya dị ọcha akaebe.

      O gosiri na anyị na-eme ka Jizọs. Baịbụl kwuru na Jizọs bụ “ezi onye àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi.” (Mkpughe 3:14) Jizọs ji ọnụ ya kwuo na ya mere ‘ka a mara aha Chineke’ nakwa na ya ‘gbaara eziokwu gbasara Chineke àmà.’ (Jọn 17:26; 18:37) N’ihi ya, ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-abụrịrị ndị a kpọkwasịrị aha Jehova. Ha kwesịkwara ime ka ndị ọzọ mara aha ahụ. Ọ bụ ya ka Ndịàmà Jehova na-agba mbọ na-eme.

      • Gịnị mere Ndị Mmụta Baịbụl ji zawa Ndịàmà Jehova?

      • Olee mgbe Jehova bidoro inwe ndị àmà n’ụwa?

      • Olee Onyeàmà kacha ndị àmà niile Jehova nwerela?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Ị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova, gbalịa matakwuo ha. Onye nke ọ bụla gị na ya kpawara nkata, jụọ ya ihe mere o ji ghọọ Onyeàmà Jehova.

  • Olee Otú E Si Maliteghachi Ịkụzi Eziokwu Dị na Baịbụl?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 3

      Olee Otú E Si Maliteghachi Ịkụzi Eziokwu Dị na Baịbụl?

      Ụmụ nwoke ndị na-amụ Baịbụl n’ihe dị ka afọ 1870

      Ndị Mmụta Baịbụl e nwere malite n’afọ 1870

      Nwoke na-agụ Ụlọ Nche mbụ e bipụtara

      Ụlọ Nche mbụ e bipụtara n’asụsụ Bekee n’afọ 1879

      Nwaanyị ji Ụlọ Nche na Teta!

      Otú Ụlọ Nche na-adị ugbu a

      Baịbụl kwuru na mgbe Kraịst nwụchara, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-aghọ ndị ozizi ụgha. Ha ga-agwagbukwa eziokwu dị na Baịbụl. (Ọrụ Ndịozi 20:​29, 30) Ka oge na-aga, ihe ahụ Baịbụl kwuru mere. Ha weere ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya gwaa ya ozizi ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụ otú ahụ ka Ndị Kraịst ụgha si malite. (2 Timoti 4:​3, 4) Oleezi otú anyị si mara na ihe anyị na-akụzi taa bụ eziokwu dị na Baịbụl?

      Jehova mere ka a mata eziokwu dị na Baịbụl mgbe oge ya ruru. Chineke kwuru na ‘n’oge ikpeazụ, ezi ihe ọmụma ga-aba ụba.’ (Daniel 12:⁠4) N’afọ 1870, mmadụ ole na ole ndị chọrọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi chọpụtara na ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị dị iche iche adịghị na Baịbụl. N’ihi ya, ha malitere isi imi n’ala ka ha mara nke bụ́ eziokwu. Jehova nyekwaara ha aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi.

      Ndị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu sara anya ná mmiri mụọ Baịbụl. Aha e ji mara ha bụ Ndị Mmụta Baịbụl, otú ha sikwa na-amụ Baịbụl n’oge ahụ bụ otú anyịnwa si na-amụ ya taa. Ọ na-abụ ha welite otu ihe a na-akụzi n’okpukpe, ha achọwa ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ya. Ọ bụrụ na ha agụọ otu amaokwu Baịbụl gụta ihe siiri ha ike nghọta, ha na-agụ amaokwu ndị ọzọ ka o nyere ha aka ịghọta nke ahụ. Mgbe ọ bụla ihe ha ghọtara dabara n’ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl, ha edee ya n’akwụkwọ. Otú a ha si na-amụ Baịbụl mere ka ha mata ihe bụ́ aha Chineke na eziokwu gbasara Alaeze ya. Ha chọpụtakwara ihe Chineke bu n’obi kee ma mmadụ ma ụwa anyị a. Ha mụtakwara ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ, mụtakwa na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọdịnihu. Otú a ha si saa anya ná mmiri na-amụ Baịbụl mere ka ha ghara ịkụzi ihe na-abụghị eziokwu. O mekwara ka ha ghara ime ihe Chineke kpọrọ asị.​—⁠Jọn 8:​31, 32.

      Tupu afọ 1879, Ndị Mmụta Baịbụl chọpụtara na oge eruola ka ha mee ka onye ukwu na onye nta mara ihe Baịbụl na-akụzi. N’ihi ya, n’afọ ahụ, ha bidoro ibipụta Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova, bụ́ akwụkwọ anyị ka na-ebipụta ruo taa. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ. Anyị na-ebipụtakwa akwụkwọ anyị dị iche iche n’ihe dị ka narị asụsụ assa na iri ise. O nwetụbeghị mgbe ezi ihe ọmụma bara ụba otú ọ bara ugbu a.

      • Mgbe Kraịst nwụchara, gịnị mere eziokwu dị na Baịbụl?

      • Gịnị nyeere anyị aka ịmaliteghachi ịkụzi eziokwu dị na Baịbụl?

  • Gịnị Mere Anyị Ji Bipụta Baịbụl A Na-akpọ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
    • ISI NKE 4

      Gịnị Mere Anyị Ji Bipụta Baịbụl A Na-akpọ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

      Ígwè e ji ebi akwụkwọ n’oge ochie
      Nke mbụ ya e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na Bekee
      Mgbe e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na Kongo Kinshasa

      Kongo Kinshasa

      Mgbe e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na Ruwanda

      Ruwanda

      Mpempe akwụkwọ si na Baịbụl Symmachus. E dere aha Chineke na ya

      Ihe a bụ mpempe akwụkwọ si na Baịbụl Symmachus sụgharịrị n’ihe dị ka otu puku na narị afọ isii ma ọ bụ asaa gara aga. N’Abụ Ọma 69:​31, o dere aha Chineke bụ́ Jehova n’asụsụ Grik

      Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova nọ na-agụ nsụgharị Baịbụl dị iche iche. Anyị nọkwa na-ebipụta ha ma na-ekesara ha ndị mmadụ. Ka oge na-aga, anyị chọpụtara na ọ dị mma ka e nwee nsụgharị Baịbụl nke ga-enyere ndị mmadụ aka inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” bụ́kwanụ ihe Chineke chọrọ ka mmadụ niile nweta. (1 Timoti 2:​3, 4) N’ihi ya, anyị malitere ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Bekee. N’afọ 1950 kwa, anyị bidoro iwepụta akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. E ji asụsụ Bekee a na-asụ n’oge a dee ya. Ndị sụgharịrị ya etinyeghị okwu nke ha ma ọ bụkwanụ gbanwee ihe ọ bụla dị n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Taa, a sụgharịala Baịbụl a n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ.

      Ọ dị mma ka e nwee Baịbụl ga-adị mfe nghọta. Asụsụ ọ bụla na-eto eto. E jikwa asụsụ Bekee mgbe ochie siri ike nghọta dee ọtụtụ Baịbụl Bekee. Ihe ọzọ bụ na e nwetara ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’oge ochie. Ndị sụgharịrị ha agbanweghị oké ihe na ha mgbe ha si n’asụsụ Hibru, Arameik na Grik e ji dee Baịbụl ná mbụ sụgharịa ha. Nke a mere ka a ghọtakwuo ihe e kwuru na Baịbụl.

      Ọ dị mma ka e nwee Baịbụl ndị sụgharịrị ya na-agbanweghị ihe ọ bụla. Ndị nsụgharị Baịbụl kwesịrị ịsụgharị Okwu Chineke otú e si dee ya ná mbụ kama itinye okwu nke ha. Ma, n’ọtụtụ Baịbụl e nwere taa, ị gaghị ahụ aha Chineke, bụ́ Jehova.

      Ọ dị mma ka e nwee nsụgharị ga-akwanyere Chineke ùgwù, bụ́ onye e dere uche ya na Baịbụl. (2 Samuel 23:⁠2) N’Akwụkwọ Nsọ ndị kacha mee ochie, aha Jehova pụtara ihe ruru ugboro puku asaa. Ihe e sere n’okpuru ebe a bụ otu n’ime ebe aha Chineke gbara n’Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ. Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, e dere aha Jehova n’ebe niile ahụ ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ ochie ndị ahụ. (Abụ Ọma 83:18) Tupu anyị ebipụta Baịbụl a, anyị sara anya ná mmiri meere ya nchọnchọ ọtụtụ afọ. N’ihi ya, e dere uche Chineke otú ọ ga-ekwe onye ọ bụla nghọta, ịgụ ya na-atọkwa ndị mmadụ ezigbo ụtọ. Ma è nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ ị na-asụ ma ọ bụ na e nweghị, gbalịa na-agụ Baịbụl, bụ́ Okwu Jehova, kwa ụbọchị.​—⁠Jọshụa 1:8; Abụ Ọma 1:​2, 3.

      • Gịnị mere anyị ji kpebie iwepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

      • Olee ihe onye chọrọ ịmata uche Chineke kwesịrị ịna-eme kwa ụbọchị?

      IHE ỌZỌ Ị GA-EME

      Gụọ okwu mmalite dị ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ị gụchaa ya, zaa ajụjụ a: “Olee otú kọmitii sụgharịrị Baịbụl bụ́ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si were ọrụ ahụ ha rụrụ?” Gụzie Jenesis 25:29; Aịzaya 14:23; Matiu 5:3; 11:12; 1 Ndị Kọrịnt 10:​24, 25; na Ndị Filipaị 1:⁠8. Jiri otú e si sụgharịa ha ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ tụnyere otú e si sụgharịa ha na Baịbụl ọ bụla ọzọ i nwere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya