-
Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 5
Olee Uru Ị Ga-erite ma Ị Bịa Ọmụmụ Ihe Anyị?
Ajentina
Siera Liọn
Beljọm
Maleshia
Ọtụtụ ndị akwụsịla ịga chọọchị n’ihi na o nweghị ihe ha mụtara ná ndị nke ha garala aga, o nweghịkwa onye na-agba ha ume. Ma, olee ihe mere o ji dị mma ka ị na-abịa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova? Oleekwa uru ị ga-erite ma ị na-abịa ya?
Obi ga-adị gị ụtọ na gị na ndị hụrụ ibe ha n’anya nọ. N’oge ochie, Onye Kraịst ọ bụla nwere ọgbakọ ọ na-eso amụ ihe. N’ọmụmụ ihe ndị ahụ, ha na-efe Chineke, na-amụ Akwụkwọ Nsọ, ma na-agba ibe ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ha gaa ọmụmụ ihe, obi na-eru ha ala na ha na ndị enyi ha nọ. (2 Ndị Tesalonaịka 1:3; 3 Jọn 14) Anyị na-amụ ihe otú ahụ Ndị Kraịst oge ochie si amụ, obi na-adịkwa anyị ụtọ ka ha.
Ị ga-amụta otú e si eme ihe Baịbụl kwuru. N’oge ochie, ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka na-anọkọ mụọ Okwu Chineke. Otú ahụkwa ka anyị na-eme. Ndị ma akụzi ihe na-eji Baịbụl eme ka anyị ghọta otú anyị ga-esi na-eme ihe Okwu Chineke kwuru. (Diuterọnọmi 31:12; Nehemaya 8:8) Onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nwere ike itinye ọnụ ma e nwee okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, o nwekwara ike soro bụọ abụ. Ha so n’ụzọ ndị anyị si ekwupụta olileanya anyị nwere na Chineke.—Ndị Hibru 10:23.
A ga-eme ka okwukwe i nwere na Chineke sikwuo ike. Mgbe Pọl onyeozi nọ n’ụwa, ọ gwara otu ọgbakọ, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, . . . ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Ndị Rom 1:11, 12) Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị na-akparịta. Nke a na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike, obi esiekwa anyị ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru.
Gbalịa bịa ọmụmụ ihe ọzọ anyị ga-enwe ka ị hụ na ihe ndị a anyị kwuru bụ eziokwu. Anyị ga-eji obi anyị niile nabata gị. Anyị anaghị ana ndị bịara ọmụmụ ihe anyị ụtụ ọ bụla.
Olee ndị anyị na-amụ ihe ka ha?
Olee uru ị ga-erite ma ị bịa ọmụmụ ihe anyị?
-
-
Olee Uru Anyị Na-erite ma Anyị na Ụmụnna Anyị Na-akpakọrịta?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 6
Olee Uru Anyị Na-erite ma Anyị na Ụmụnna Anyị Na-akpakọrịta?
Madagaska
Nọọwee
Lebanọn
Ịtali
Anyị anaghị ahapụ ịga ọmụmụ ihe anyị ọ sọkwa ya ya bụrụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị ezigbo anya ma ọ bụkwanụ na ụzọ anyị ga-esi aga ya bụ oké ọhịa. Ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha, anyị na-aga ọmụmụ ihe. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji agba ụdị mbọ a a sịgodị na ike gwụrụ ha ma ọ bụkwanụ na ha nwere nsogbu n’ụbọchị ahụ?
Ọ na-enyere anyị aka imeri nsogbu anyị. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ, ọ sịrị: ‘Na-echebaranụ ibe unu echiche.’ (Ndị Hibru 10:24) Ihe ọ na-ekwu ebe a bụ na anyị kwesịrị ịma ibe anyị nke ọma, marakwa ihe ha na ha na-alụ. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị na-akpa nkata. N’oge ahụ, anyị na-achọpụta na ụfọdụ n’ime ha enwetụla ụdị nsogbu ndị anyị nwere. Ha na-ejikwa oge ahụ gwa anyị otú anyị ga-esi merie nsogbu anyị otú hanwa meriri nke ha.
Ọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị bụrụ ezigbo enyi. Anyị na ụmụnna anyị dị ná mma, ha bụkwa ezigbo ndị enyi anyị. Ọ bụghị naanị mgbe anyị gara ọmụmụ ihe ka anyị na ha na-akpakọrịta, anyị na-ewepụtakwa oge ka anyị na ha nọkọọ tụrụ ndụ. Olee uru anyị na-erite n’oge ahụ? Anyị na-achọpụtakwu àgwà ọma onye nke ọ bụla nwere, ya emee ka anyị hụkwuo ibe anyị n’anya. E nwezie onye n’ime anyị nwere nsogbu, anyị agbatara ya ọsọ enyemaka ozugbo. (Ilu 17:17) Ebe ọ bụ na anyị na ndị niile nọ n’ọgbakọ anyị na-akpa, o gosiri na anyị ‘na-elekọta ibe anyị.’—1 Ndị Kọrịnt 12:25, 26.
Gbalịa mete ndị na-eme uche Chineke enyi. Ebe ị ga-ahụ ụdị ndị enyi a bụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Biko, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịna-abịa ọmụmụ ihe anyị.
Olee uru ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị?
Olee ụbọchị ị ga-achọ ịbịa ọmụmụ ihe anyị?
-
-
Olee Otú Anyị Si Amụ Ihe?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 7
Olee Otú Anyị Si Amụ Ihe?
Niu Ziland
Japan
Yuganda
Lituenia
N’oge ochie, Ndị Kraịst na-eji abụ na ekpere amalite ọmụmụ ihe. Ha na-agụkwa Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya. Ha anaghị eme ụmụ ememme ndị a na-emegasị na chọọchị taa. (1 Ndị Kọrịnt 14:26) Anyịnwa na-amụkwa ihe otú ahụ.
A na-eji Baịbụl akụziri anyị ihe ndị na-abara anyị uru. Ná ngwụcha izu ọ bụla, a na-enwe onye ga-eji nkeji iri atọ gwa ndị bịara ọmụmụ ihe okwu si na Baịbụl. A na-akpọ okwu ahụ ọ na-ekwu Okwu Ihu Ọha. Ọkà okwu ahụ ga-akọwa otú Chineke chọrọ ka anyị si na-akpa àgwà, kọwaakwa otú ihe Baịbụl kwuru si na-emezu n’oge anyị a. Ọ gụwa Baịbụl, ọ na-agwa mmadụ niile ka ha sapeta Baịbụl nke ha ma na-ele anya ebe ọ na-agụ. E kwuchaa okwu ihu ọha, anyị na-enwe ọmụmụ ihe ọzọ na-ewe otu awa. A na-akpọ ya Ọmụmụ Ihe “Ụlọ Nche.” Anyị na-amụ otu isiokwu dị n’Ụlọ Nche anyị nke a na-amụ amụ. Ọ na-abụ ajụjụ na azịza, onye ọ bụla nwekwara ike welie aka zaa ajụjụ. Ihe anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe a na-enyere anyị aka ime ihe Baịbụl kwuru. N’ụwa niile, ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị otu narị puku na puku iri. Isiokwu a mụrụ n’ebe a ka a ga-amụ n’ụwa niile.
Anyị na-amụ otú e si akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Tupu ngwụcha izu, anyị na-enwe ọmụmụ ihe a na-akpọ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. E kere ọmụmụ ihe a ụzọ atọ. Ọ bụ n’akwụkwọ anyị bụ́ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ka e si enweta ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe a. A na-ebipụta akwụkwọ a kwa ọnwa. Ihe a na-akpọ omụmụ ihe nke mbụ bụ, Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Ọ na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndị e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a gwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ gụọ n’ụlọ ha. Ọmụmụ ihe nke abụọ bụ, Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. A na-eme ihe ngosi ndị na-enyere anyị aka ịmata otú anyị nwere ike isi kụziere ndị mmadụ Baịbụl nke ọma. Onyeisi oche ga-ekwu ihe ndị ọ chọpụtara ga-enyere mmadụ niile aka imekwu nke ọma ma ha na-agụ ihe ma ọ bụ na-akụziri ndị mmadụ ihe. (1 Timoti 4:13) Ihe a na-akpọ ọmụmụ ihe nke atọ bụ, Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ. Ọ na-enyere anyị aka ịmata otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ anyị kwa ụbọchị. A na-enwekwa ajụjụ na azịza ndị na-enyere anyị aka ịghọtakwu Baịbụl.
Ọ bụrụ na ị bịa ọmụmụ ihe anyị, otú a ga-esi akụziri gị Baịbụl ga-amasị gị.—Aịzaya 54:13.
Gịnị na gịnị ka anyị na-amụ n’ọmụmụ ihe anyị?
Olee ọmụmụ ihe nke ị ga-achọ ịbịa n’izu a?
-
-
Gịnị Mere Anyị Ji Eji Ejiji Dị Mma Aga Ọmụmụ Ihe Anyị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 8
Gịnị Mere Anyị Ji Eji Ejiji Dị Mma Aga Ọmụmụ Ihe Anyị?
Aịsland
Meksiko
Gini-Bisaụ
Filipinz
Lerugodị anya na foto Ndịàmà Jehova e sere na broshọ a. Ị̀ chọpụtara na ha jiri ejiji dị mma n’ebe niile ha nọ n’ọmụmụ ihe ha? Ị̀ ma ihe mere anyị ji eji ejiji dị mma otú ahụ?
Ọ bụ maka na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù. Ọ bụ eziokwu na mkpa Chineke anaghị abụcha ụdị ejiji anyị ji bịa ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị iji ejiji otú ga-egosi na anyị na-akwanyere ma yanwa ma ụmụnna anyị ùgwù. (1 Samuel 16:7) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga hụ onyeisi ala anyị, anyị ga-eji ejiji dị mma n’ihi ùgwù anyị na-akwanyere ya. Anyị kwesịkwara ịna-eme otú ahụ mgbe anyị na-aga ọmụmụ ihe. Otú anyị si jie ejiji ga-egosi ma ànyị na-akwanyere Jehova ùgwù, bụ́ onye Baịbụl kpọrọ “Eze mba niile.” (Jeremaya 10:7) Ọ ga-egosikwa ma ànyị ji ebe anyị na-anọ efe ya kpọrọ ihe.
Ọ bụ maka na anyị na-eme ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-eji ejiji ga-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè, bụrụkwa ndị uche ha zuru okè. (1 Timoti 2:9, 10) Mmadụ iji ejiji nke ga-egosi na ‘ọ na-emeru ihe n’ókè’ pụtara na ọ gaghị eyi efe tapaara ya n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ nke ndị mmadụ ga na-ahụ ihe o yi n’ime. Inwe “uche zuru okè” ga-enyekwara onye ahụ aka ịna-eyi efe dị mma n’anya. Ma, ihe a na-ekwu ebe a abụghị na anyị enweghị ike iyi efe masịrị anyị. Ọ bụrụ na anyị ejie ejiji dị mma, o nwere ike ‘chọọ ozizi Onye Nzọpụta anyị mma,’ nyekwa ya otuto. (Taịtọs 2:10; 1 Pita 2:12) Anyị jie ejiji dị mma gaa ọmụmụ ihe, anyị na-eme ka ndị ọzọ ghara ileda ofufe anyị na-efe Jehova anya.
Ekwela ka okwu gbasara efe mee ka ị ghara ịbịa ọmụmụ ihe anyị. Ihe na-ekpebi ma efe ọ̀ dị mma iji bịa ọmụmụ ihe abụghị otú ọ maruru ná mma ma ọ bụkwanụ ego ole a zụrụ ya. Ọ bụrụhaala na ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya, i nwere ike iyi ya bịa.
Gịnị mere anyị ji eji ejiji dị mma aga ọmụmụ ihe anyị?
Gịnị ka Baịbụl kwuru, nke ga-enyere anyị aka ịma ụdị ejiji anyị kwesịrị ịna-eji?
-
-
Olee Otú Kacha Mma Anyị Ga-esi Na-akwadebe Ọmụmụ Ihe?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 9
Olee Otú Kacha Mma Anyị Ga-esi Na-akwadebe Ọmụmụ Ihe?
Kambodia
Yukren
Ọ bụrụ na gị na Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl, anyị ma na ị na-ebu ụzọ mụọ ihe unu chọrọ ịmụ. Ka i nwee ike ịghọta ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe anyị, ọ dịkwa mma ka ị na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu anyị agawa, ọ ga-abara anyị ezigbote uru.
Kpebie mgbe ị ga-amụ ihe na ebe ị ga-anọ amụ ya. Olee mgbe obi gị na-aka adị n’ihe ị na-amụ? Ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ tupu ị gawa ọrụ ka ọ̀ bụ n’abalị mgbe ụmụ gị labara? Ọ bụrụgodị na ọ na-esiri gị ike ịmụte ihe aka, kpebie nkeji ole ị ga-eji na-amụ ihe, hụkwa na i ji nkeji ole ahụ na-amụ ya. Nọrọ ebe ụzụ na-adịghị, gbanyụọkwa redio, televishọn, na ekwentị gị ka ha ghara ịdọpụ gị uche. Ọ bụrụ na i kpee ekpere tupu ị mụwa ihe, ọ ga-eme ka obi gị dịrị n’ihe ị na-amụ. Ị gaghịkwa na-eche gbasara nsogbu dịịrị gị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Kaa ihe n’azịza ya, jikerekwa ịza ajụjụ. Buru ụzọ ghọta ihe isiokwu ị chọrọ ịmụ na-ekwu. Chebara ya echiche. Chọpụta ihe jikọrọ isiokwu ahụ na isiokwu nta ndị dị na ya. Leruo foto ndị e sere na ya anya. Chebarakwa ajụjụ ndị a jụrụ ná ngwụcha isiokwu ahụ echiche. I mechazie, gụọ paragraf nke ọ bụla, leekwa ma ị̀ ga-azali ajụjụ paragraf ahụ. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya, chebakwara otú ha si daba n’isiokwu ị na-amụ echiche. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Ọ bụrụ na ị chọta ebe azịza ajụjụ paragraf ahụ dị, kaa ya ihe. I nwere ike kaa okwu ole na ole dị ebe ahụ ihe, ka ọ ga-abụ i lee ya anya, gị echeta azịza ahụ. I ruzie n’ọmụmụ ihe, i nwere ike welie aka ma a jụọ ajụjụ ahụ. A kpọzie gị, gị azaa ya ná nkenke.
Ọ bụrụ na ị na-amụ isiokwu a ga-amụ n’izu ọ bụla, a ga-enwe ihe ọhụrụ ị ga-amụta na Baịbụl. Nwayọọ nwayọọ otú ahụ, ị ga-eji Okwu Chineke kwajuo ‘ụlọ akụ̀’ gị.—Matiu 13:51, 52.
Olee otú ị ga-esi na-akwadebe ọmụmụ ihe tupu ị gawa?
Gịnị ka i nwere ike ime iji hụ na ị zara ajụjụ n’ọmụmụ ihe?
-
-
Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 10
Gịnị Bụ Ofufe Ezinụlọ?
Saụt Koria
Brazil
Ọstrelia
Gini
Kemgbe ụwa, Jehova chọrọ ka ezinụlọ ọ bụla na-anọkọ na-ekwurịta gbasara ya. Ha na-eme otú ahụ, ya na ha ga-adịkwu ná mma, udo adịrịkwa n’ezinụlọ ahụ. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ọ bụ ya mere ezinụlọ Ndịàmà Jehova ọ bụla ji ewepụta otu mgbede n’izu ọ bụla iji nọkọọ fee Chineke. N’oge ahụ, ha na-ekwurịta gbasara otú ezinụlọ ha ga-esi na-emekwu uche Chineke. Ọ naghịkwa abụ oge ha ji akpasu ibe ha iwe. Ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị gị bi, ị ga-eji oge ahụ na-amụ ihe ọ bụla ị chọrọ ịmụ gbasara Chineke.
Ọ bụ oge anyị ji abịarukwu Jehova nso. Baịbụl kwuru, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Anyị na-amatakwu ụdị onye Jehova bụ ma anyị gụọ Baịbụl gụta otú o si mesoo ndị mmadụ n’oge ochie. Ụzọ dị mfe i nwere ike isi malite ofufe ezinụlọ bụ gị na ndị ezinụlọ unu ịnọkọ gụọ Baịbụl, onye gụọ ibe ya agụọ. Unu nwedịrị ike gụọ ebe e kwuru ka a gụọ n’Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ahụ. E nwere ike gwa onye nke ọ bụla ebe ọ ga-agụ tupu ụbọchị ahụ unu ga-enwe ofufe ezinụlọ. Ụbọchị ahụ ruzie, unu gụchaa ebe ahụ unu chọrọ ịgụ, onye ọ bụla ekwuo ihe ọ mụtara.
Ọ bụ oge na-eme ka ndị ezinụlọ na ibe ha na-adịkwu ná mma. Ofufe ezinụlọ na-eme ka di na nwunye ma ọ bụkwanụ nne na nna na ụmụ ha na-adịkwu ná mma. Oge ahụ kwesịrị ịbụ oge na-eme onye ọ bụla obi ụtọ n’ezinụlọ, nke na ha ga na-atụ anya ka o ruwe eru. Mgbe ndị nne na nna na-ekpebi ihe a ga-amụ, ha kwesịrị iburu afọ ole ụmụ ha dị n’obi. Ha nwere ike si n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta! ma ọ bụkwanụ na jw.org/ig họrọ isiokwu ga-abara ụmụ ha uru. Unu na ụmụ unu nwere ike kwurịta nsogbu ha nwere n’ụlọ akwụkwọ na otú ha ga-esi merie ya. Unu nwekwara ike ile otu n’ime ihe ndị e gosiri n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehovah dị na tv.jw.org. Unu lechaa ya, unu ekwurịta ihe ndị unu mụtara na ya. Unu nwere ike mụọ abụ a ga-abụ n’ọmụmụ ihe. Ọ ga-adịkwa mma ma unu chọrọ ihe ụfọdụ unu ga-eji megharịa ọnụ ma unu nwechaa ofufe ezinụlọ.
Ọ bụrụ na ezinụlọ unu ejiri oge a pụrụ iche na-efe Jehova kwa izu, ịmụ Okwu Chineke ga na-atọ unu ụtọ. Chineke ga-agọzikwa mbọ unu na-agba.—Abụ Ọma 1:1-3.
Gịnị mere anyị ji ewepụta oge anyị ji enwe ofufe ezinụlọ?
Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime ka ofufe ezinụlọ na-atọ ndị ezinụlọ ha ụtọ?
-
-
Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 11
Gịnị Mere Anyị Ji Aga Mgbakọ?
Meksiko
Jamanị
Bọtswana
Nikaragua
Ịtali
Olee ihe mere ihu ji bụrụ ndị e sere na peeji a ọchị ọchị? Ha nọ mgbakọ Ndịàmà Jehova. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha na-aga mgbakọ ugboro atọ n’afọ. Obi na-adị ha ụtọ ịga mgbakọ ndị ahụ. Taa, ọ na-adịkwa anyị ka oge anyị ga-aga mgbakọ mee ruwe eru. (Diuterọnọmi 16:16) Anyị na-enwe mgbakọ atọ n’afọ. Otu bụ mgbakọ ukwu. Ọ na-ewe abalị atọ. Mgbakọ abụọ ndị ọzọ bụ mgbakọ sekit. Ọ na-ewe otu ụbọchị, ma a na-enwe ya ugboro abụọ n’afọ. Olee uru ịga mgbakọ ndị a na-abara anyị?
Ha na-eme ka anyị matakwuo ụmụnna anyị. Aṅụrị na-eju ụmụ Izrel obi ma ha nọrọ “n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ” na-eto Jehova. Anyịnwa na-enwekwa obi ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị zukọta ná mgbakọ na-efe Jehova. (Abụ Ọma 26:12; 111:1) Anyị bịa mgbakọ ndị a, anyị na ụmụnna anyị ndị si ọgbakọ dị iche iche ma ọ bụ ndị si mba ndị ọzọ na-akpakọrịta. Ihe ọzọ na-eme anyị obi ụtọ bụ na anyị na ụmụnna anyị na-erikọ nri ma a gbasaa nnọkọ nke ụtụtụ. (Ọrụ Ndịozi 2:42) Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, anyị na-ahụ ihe na-eme ka obi sikwuo anyị ike na anyị hụrụ ‘ụmụnna anyị dum n’anya.’—1 Pita 2:17.
Ha na-enyere anyị aka ime uche Chineke. Uru ọzọ ụmụ Izrel na-erite ma ha gaa mgbakọ bụ na a na-akọwara ha Okwu Chineke nke ọma, ha aghọta ya. (Nehemaya 8:8, 12) Anyịnwa na-ejikwa ihe ndị a na-akụziri anyị ma anyị gaa mgbakọ akpọrọ ihe. Ihe a na-atụle ná mgbakọ nke ọ bụla na-abụ ihe si na Baịbụl. A na-ekwu okwu dị iche iche, ndị mmadụ na-apụtakwa kọọ otú ha si merie nsogbu ha nwere, mgbe ụfọdụkwa ha egosi ndị bịaranụ otú ihe ahụ si mee. Ihe a niile na-enyere anyị aka ịna-eme uche Chineke. A na-akọkwara anyị otú ụmụnna anyị si na-agba mbọ ife Chineke n’oge a ihe siri ezigbo ike. Nke a na-emekwa ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme uche Chineke. Anyị gaa mgbakọ ukwu, a na-enwe ndị na-apụta mee ihe anyị na-akpọ Ihe Nkiri. Ọ na-abụkarị akụkọ si na Baịbụl. Ihe nkiri ahụ na-enyere ndị bịara mgbakọ ahụ aka ịghọtakwu otú ihe ahụ a kọrọ na Baịbụl si mee na ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya. Ná mgbakọ ọ bụla anyị gara, a na-eme ndị nyeferela Chineke onwe ha baptizim.
Gịnị mere aṅụrị ji eju anyị obi ma anyị gaa mgbakọ?
Olee uru ị ga-erite ma ị bịa mgbakọ anyị?
-
-
Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 12
Olee Otú E Si Hazie Ozi Ọma Anyị Na-ekwusa?
Spen
Belarus
Họng Kọng
Peruu
Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Ma, olee otú a ga-esi kwusaa ozi ọma ahụ n’ụwa niile? Ọ bụ ma e kwusaa ya otú ahụ Jizọs si kwusaa ya mgbe ọ nọ n’ụwa.—Luk 8:1.
Anyị na-agba mbọ gakwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Matiu 10:11-13; Ọrụ Ndịozi 5:42; 20:20) A gwara Ndị Kraịst oge ochie ebe ha ga-aga zie ozi ọma. (Matiu 10:5, 6; 2 Ndị Kọrịnt 10:13) N’otu aka ahụ taa, a haziri otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ahazi. Ọgbakọ ọ bụla nwekwara ebe ha na-ekwusa ozi ọma. Nke a na-enyere anyị aka ‘ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgbara ha àmà nke ọma’ otú ahụ Jizọs gwara anyị mee.—Ọrụ Ndịozi 10:42.
Anyị na-agbalị gakwuru ndị mmadụ ebe ọ bụla anyị nwere ike ihu ha. Jizọs ziri ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ha. O nwedịrị ndị ọ nọ n’ikpere mmiri zie ozi ọma, nweekwa onye nke o ziri ozi ọma mgbe ọ bịara isere mmiri n’olulu mmiri. (Mak 4:1; Jọn 4:5-15) Anyịnwakwa na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha, ma ọ̀ bụ n’okporo ámá ma ọ̀ bụ n’ebe ha na-anọ achụ afọ ha ma ọ̀ bụkwanụ n’ebe ha na-anọkarị atụrụ ndụ. Anyị na-ejidị ekwentị ezi ndị mmadụ ozi ọma. Anyị anaghịkwa agbachi nkịtị ghara izi ndị agbata obi anyị na ndị ọrụ ibe anyị ozi ọma ma ihe a ga-eji zie ha ozi ọma mee. Anyị na-agbakwa mbọ zie ụmụ akwụkwọ ibe anyị ozi ọma n’ụlọ akwụkwọ. Anyị esila ụzọ ndị a niile kwusaara ọtụtụ ndị n’ụwa “ozi ọma banyere nzọpụta.”—Abụ Ọma 96:2.
Ò nwere onye i chetara i nwere ike izi ozi ọma, kọọrọ ya ihe Alaeze Chineke ga-emere ya n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na e nwere, gakwuru ya ozugbo.
Olee “ozi ọma” e kwesịrị ikwusa?
Olee otú o si bụrụ na Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs si kwusaa ya?
-
-
Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 13
Ònye Bụ Ọsụ Ụzọ?
Kanada
Ọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ
Ọ na-amụrụ mmadụ ihe
Ọ na-amụ ihe
Jizọs bụ ọsụ ụzọ n’ụdị nke ya, n’ihi na Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ bịa zie ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na ha anabata ozi ọma ahụ, a ga-azọpụta ha. (Matiu 20:28) Taa, ndị na-eso ụzọ ya na-eme ụdị ihe ahụ o mere. Ha na-aga ‘na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ’ Jizọs. (Matiu 28:19, 20) Ụfọdụ n’ime ha aghọọla ndị anyị na-akpọ ndị ọsụ ụzọ oge niile.
Ọsụ ụzọ bụ onye na-ekwusa ozi ọma mgbe niile. Ndịàmà Jehova niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ụfọdụ n’ime ha ahaziela oge ha ka ha nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ha na-eji awa iri asaa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ọtụtụ n’ime ha anaghị eji ụbọchị niile dị n’izu achụ afọ ha, ka ha nwee ike na-aga ozi ọma otú ha chọrọ. A na-ahọrọ ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. A họrọ ha, e ziga ha n’ebe a na-enwechaghị ndị na-ekwusa ozi ọma. Ha na-eji otu narị awa na iri atọ ma ọ bụ karịa aga ozi ọma kwa ọnwa. Ndị ọsụ ụzọ anaghị achụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ. Ihe ọ bụla ha nwere na-eju ha afọ. Obi na-esikwa ha ike na Jehova ga-egboro ha mkpa ha. (Matiu 6:31-33; 1 Timoti 6:6-8) Ndị na-enweghị ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwere ike bụrụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Ha na-eji iri awa atọ ma ọ bụ iri awa ise aga ozi ọma n’ọnwa.
Ọsụ ụzọ hụrụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ chọpụtara na e nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịma banyere Jehova na nzube ya. Anyị chọpụtakwara otu ihe ahụ taa. (Mak 6:34) Ma, Jehova akụzierela anyị otú anyị ga-esi na-enyere ha aka ka ha nwee nchekwube na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ bụ otú ọsụ ụzọ si hụ ndị agbata obi ya n’anya mere o ji eji oge ya na ike ya ekwusara ha ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 22:39; 1 Ndị Tesalonaịka 2:8) Ihe a niile ọ na-eme na-enye aka eme ka okwukwe ya sikwuo ike, ya na Chineke adịrịkwuo ná mma. Ọ na-emekwa ka obi na-adị ya ụtọ.—Ọrụ Ndịozi 20:35.
Ònye bụ ọsụ ụzọ?
Olee ihe na-eme ka mmadụ kpebie na ya ga-abụ ọsụ ụzọ oge niile?
-
-
Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
-
-
ISI NKE 14
Olee Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-agagasị?
Amerịka
Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ọ dị na Patasịn, Niu Yọk
Panama
Ihe e ji mara Ndịàmà Jehova kemgbe ụwa bụ na a na-azụ ha ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma. E nwere ụfọdụ ụlọ akwụkwọ pụrụ iche ndị ọsụ ụzọ na-aga ka ha nwee ike ‘jezuo ozi ha.’—2 Timoti 4:5.
Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ. Ọ na-abụ o ruo otu afọ mmadụ malitere ịsụ ụzọ oge niile, ya agaa ụlọ akwụkwọ a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ya nso. Abalị isii ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ na-enyere ọsụ ụzọ aka ịbịarukwu Jehova nso, ịmata otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma nakwa ịnọgidesi ike n’ozi ya.
Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ọ bụ ndị bụterela ọsụ ụzọ aka na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ọ bụ ọnwa abụọ ka a na-aga ya. Ha na-abụ ndị dị njikere ịhapụ obodo ha gaa ebe ọ bụla a ga-eziga ha. Ha na-ekwu ihe ahụ Aịzaya kwuru. Ọ sịrị, “Lee m! Ziga m.” Ha sikwa otú ahụ na-eṅomi Jizọs Kraịst bụ́ onye kacha zie ozi ọma n’ụwa. (Aịzaya 6:8; Jọn 7:29) Ịkwaga ebe ọzọ nwere ike ịpụta na onye ahụ ga-agbanwe otú o si ebi ndụ. Omenala na nri ndị obodo ebe ọ na-aga nwekwara ike ịdị ezigbo iche na nke ha. O nwekwara ike ịbụ na ọ ga-amụ asụsụ ọhụrụ ka o nwee ike izi ndị obodo ahụ ozi ọma. Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka ịmụta ihe ndị ga-abara ha uru n’ebe a ga-eziga ha, nyekwara ha aka inwe nkà ndị ga-eme ka ha baara Jehova na ọgbakọ ya uru. Ndị na-aga ya bụ ụmụnna nwoke ndị lụrụla nwaanyị na ndị nwunye ha, ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwaanyị nakwa ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di. Ha na-abụkwa ndị nọ n’agbata iri afọ abụọ na atọ na iri afọ isii na ise.
Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Gilied bụ okwu Hibru. A sụgharịa ya, ọ pụtara “Nnukwute Ihe Àmà.” Kemgbe a malitere ụlọ akwụkwọ a n’afọ 1943, ihe karịrị puku mmadụ asatọ gụrụla akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied agbaala nnukwute àmà “ruo nsọtụ ụwa.” Àmà ndị ha gbara rụpụtakwara ọtụtụ ihe ọma. (Ọrụ Ndịozi 13:47) O nweghị ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Peruu mgbe mbụ e zigara ndị ozi ala ọzọ ebe ahụ. Ma ugbu a, e nweela ihe karịrị otu puku ọgbakọ n’ebe ahụ. Mgbe mbụ ndị ozi ala ọzọ rutere Japan, Ndịàmà Jehova erughị mmadụ iri n’ebe ahụ. Ma ugbu a, ha akarịala narị puku abụọ. Ọnwa ise ka a na-aga ụlọ akwụkwọ a. Ndị gara ya na-eji ọnwa ise ahụ amụ Baịbụl nke ọma. Ndị na-aga ụlọ akwụkwọ a bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị na-eje ozi n’ala ọzọ, ndị na-eje ozi na Betel nakwa ndị nlekọta sekit. Ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ a bụ ihe ga-enyere ha aka ime ka ọrụ ikwusa ozi ọma na-aga n’ihu.
Olee uru Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ bara?
Olee ndị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze?
-