Ajụjụ Ndị Ụmụ Mmadụ Chọrọ Ka A Zaa
‘Ebe ọ bụ na anyị amatala ‘otú’ anyị ga-esi na-enweta ihe anyị na-eri, ebe ọ bụkwa na anyị enwetala ọtụtụ ihe ndị na-eme ka ndụ dị ụtọ, bụ́ ndị na-adịghị ná mbụ, dị ka ntụ oyi, ngwá egwú CD ndị na-ewepụta ụda dị mma, na ụgbọala ọgbara ọhụrụ, ihe anyị chọziri ịmata bụ ‘ihe mere’ anyị ji dịrị ndụ. Gịnị mere anyị ji adọgbu onwe anyị? Oleekwanụ isi ya?’—David G. Myers, ọkà mmụta banyere akparamàgwà ụmụ mmadụ na Hope College, Holland, Michigan, U.S.A.
OLEE ihe ị ga-aza n’ajụjụ ndị a ọkà mmụta a jụrụ? Ụfọdụ ndị na-eche ma ọ̀ badịrị uru igbuwe oge chọwa azịza ha. Ma, ileghara ụdị ajụjụ ndị ahụ anya yiri mmadụ iyiri akpụkpọ ụkwụ obere okwute dị n’ime ya na-aga ije—onye ahụ nwere ike na-aga, ma ahụ́ agaghị eru ya ala.
Ọ bụrụ na ọ dịtụla mgbe ị nọ na-eche ihe mere anyị ji dịrị ndụ, mara na ọ bụghị naanị gị chetụrụla ya. Òtù na-achọpụta ihe kacha ụmụ mmadụ mkpa n’ụwa, kwuru na otu nchọpụta kachanụ e metụrụla banyere ihe ndị dị ụmụ mmadụ mkpa gosiri na ọtụtụ ndị bi n’ọtụtụ mba na-eche echiche banyere “ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ.”
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka obi ruo gị nnọọ ala, i kwesịrị ịmata azịza nke ajụjụ atọ dị mkpa.
Olee ebe anyị si bịa?
Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ?
Gịnị ga-eme n’ọdịnihu?
Olee ebe ị ga-enweta azịza nke ajụjụ ndị a dị mkpa, ya bụ, azịza ị pụrụ ịtụkwasị obi? Ihe peeji ndị na-esonụ ga-aza gị abụghị ihe mmadụ chepụtara ma ọ bụ ihe ndị ọkà ihe ọmụma kwuru, kama, ọ bụ ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru. Biko, saghee Baịbụl gị ka i jiri anya gị hụrụ ihe o kwuru.