Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ
    Teta!—2001 | Jenụwarị 8
    • Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ

      “N’ọha mmadụ nwere oké ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị nanị na ọtụtụ alụmdi na nwunye obi ụtọ kọrọ pụrụ itisa n’ịgba alụkwaghịm, kamakwa, ọtụtụ alụmdi na nwunye pụrụ ịghọ ndị obi ụtọ kọrọ.”—KANSỤL NA-AHỤ MAKA EZINỤLỌ N’AMERICA.

      E KWUWO na ihe ka ukwuu n’obi ụtọ na nhụsianya nke ndụ na-esite n’otu ebe—alụmdi na nwunye mmadụ. N’ezie, ọ bụ ihe ole na ole ná ndụ pụrụ ịkpata oké ọṅụ—ma ọ bụ nhụjuanya dị ka ya. Dị ka igbe dị n’isiokwu a na-egosi, ọtụtụ di na nwunye na-enwe nke ikpeazụ ahụ gabiga ókè.

      Ma ndekọ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-agba alụkwaghịm na-egosi nanị otu akụkụ nke nsogbu ahụ. Maka alụmdi na nwunye ọ bụla tisaranụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-etisaghị etisa ma nọrọ ná nsogbu. “Ezinụlọ anyị nweburu obi ụtọ, ma afọ 12 gara aga adịtụghị mma,” ka otu nwanyị lụrụ di eri ihe karịrị afọ 30 kọrọ. “Di m enweghị mmasị ná mmetụta m. N’ezie, ọ bụ ya kasị bụrụ onye iro m n’ụzọ mmetụta uche.” N’otu aka ahụ, otu onye bụworo di ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 25, kwara arịrị, sị: “Nwunye m agwawo m na ya ahụghịzi m n’anya. Ọ na-ekwu na ọ bụrụ nanị na anyị pụrụ ibikọ ọnụ n’otu ọnụ ụlọ, onye ọ bụla ana-agakwara onwe ya n’oge ntụrụndụ, a pụrụ ịnagide ọnọdụ a.”

      Otú ọ dị, ndị ụfọdụ bụ́ ndị nọ n’ajọ nsogbu dị otú ahụ, na-etisa alụmdi na nwunye ha. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ịgba alụkwaghịm abụtụghị ihe ha ga-eme. N’ihi gịnị? Dị ka Dr. Karen Kayser si kwuo, ihe ndị dị ka ụmụ, ihe ihere ọ bụ n’anya obodo, ego, ndị enyi, ndị ikwu, na nkwenkwe okpukpe pụrụ ime ka di na nwunye nọgide na-ebi, ọbụna n’ọnọdụ ịhụnanya kọrọ. “Ebe ọ na-eyighị ka ha ga-agba alụkwaghịm n’ụzọ iwu kwadoro,” ka ọ na-ekwu, “di ma ọ bụ nwunye ndị a na-ekwe ka ha na onye òtù ọlụlụ ha gbara alụkwaghịm n’obi ha, nọgide na-ebi.”

      Di na nwunye mmekọrịta ha mebiworo hà ga-anọrịrị na-ebi ndụ na-adịghị enye afọ ojuju? Alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ ọ̀ bụ nanị ihe a ga-eji dochie ịgba alụkwaghịm? Ahụmahụ na-egosi na a pụrụ ịzọpụta ọtụtụ alụmdi na nwunye nwere nsogbu—ọ bụghị nanị pụọ n’oké ihe mgbu nke nkewa kamakwa pụọ ná nhụsianya nke ụkọ ịhụnanya.

  • N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Ji Adalata?
    Teta!—2001 | Jenụwarị 8
    • N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Ji Adalata?

      “O yiri ka ọ ka nnọọ mfe ịmalite ịhụ n’anya karịa ịnọgide na-ahụ n’anya.”—DR. KAREN KAYSER.

      IKEKWE, mmụba nke alụmdi na nwunye ndị ịhụnanya kọrọ abụghị ihe ijuanya. Alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta na-esiri ndị mmadụ ike, ọtụtụ ndị adịghị adị njikere tupu ha abanye na ya. “A na-achọ ka anyị gosipụta na aka sitụrụ anyị ike mgbe anyị na-achọ inweta akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala,” ka Dr. Dean S. Edell, na-ekwu, “ma a pụrụ inweta akwụkwọ ikike alụmdi na nwunye site n’ịbịanye aka n’akwụkwọ.”

      N’ihi ya, ka ọtụtụ alụmdi na nwunye na-aga nke ọma ma na-enwe obi ụtọ n’ezie, ọtụtụ na-enwe nsogbu. Ikekwe otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ ji oké atụmanya banye n’alụmdi na nwunye ma ghara inwe nkà ndị dị mkpa maka inwe mmekọrịta na-adịte aka. “Mgbe mbụ ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ,” ka Dr. Harry Reis na-akọwa, “ha na-enwe nnọọ obi ike n’ebe ibe ha nọ.” Ọ na-adị ha ka onye òtù ọlụlụ ha ọ̀ bụ “nanị onye ọzọ na-ele ihe anya otú ha si ele. Mmetụta ahụ na-akwụsị mgbe ụfọdụ, mgbe nke ahụ mere, ọ pụkwara ịkpa nnọọ alụmdi na nwunye ahụ aka ọjọọ.”

      N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ezinụlọ adịghị eru n’ọnọdụ ahụ. Ma ka anyị tụlee ná nkenke ihe ole na ole meworo ka ịhụnanya dalata n’ọnọdụ ụfọdụ.

      Ndakpọ Olileanya —“Ihe A Abụghị Ihe M Tụrụ Anya Ya”

      “Mgbe m lụrụ Jim,” ka Rose na-ekwu, ‘echere m na alụmdi na nwunye anyị ga-atọgbu onwe ya n’ụtọ—na-enwe mmekọrịta ịhụnanya na mmeso dị nro na nchebara echiche maka ibe anyị.’ Ma, nwa obere oge, di ọma Rose abụghịzi nwoke ọma dị ka o chere. “Emesịrị m nwee oké ndakpọ olileanya n’ebe ọ nọ,” ka ọ na-ekwu.

      Ọtụtụ ihe nkiri sịnịma, akwụkwọ, na abụ ndị na-ewu ewu na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu banyere ịhụnanya. Mgbe ha na-eme mbedo, nwoke na nwanyị pụrụ iche na ha enwetawo ihe ha chọrọ; ma mgbe afọ ole na ole nke alụmdi na nwunye gasịrị, ha na-ekwubi na ọ ghaghị ịbụ nrọ ka ha na-arọ! Mmekọrịta ịhụnanya na-adịghị ka nke dị n’akwụkwọ akụkọ ifo nwere ike ime ka alụmdi na nwunye pụrụ ịga nke ọma yie ihe na-enweghị nnọọ isi.

      Otú ọ dị, ihe ụfọdụ a na-atụ anya ha n’alụmdi na nwunye kwesịrị nnọọ ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị mmadụ ịtụ anya ịhụnanya, nlebara anya, na nkwado nke onye òtù ọlụlụ ya. Otú ọ dị, e nwere ike ọbụna ghara inweta ihe ndị a a chọrọ. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ dị m ka alụbeghị m di,” ka Meena, bụ́ nwunye ọhụrụ na-akatabeghị ahụ n’India na-ekwu. “Owu na-ama m, ọ na-adịkwa m ka o leghaara m anya.”

      Ekwekọghị Ekwekọ —“Ọ Dịghị Ihe Na-amasị M Na-amasị Ya”

      “Ọ fọrọ nke nta ka ihe nile m na-eme dị iche na nke di m na-eme,” ka otu nwanyị na-ekwu. “M na-akwa ụta kwa ụbọchị maka mkpebi m mere ịlụ ya. Anyị ekwekọtụghị nnọọ ekwekọ.”

  • È Nwere Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya?
    Teta!—2001 | Jenụwarị 8
    • È Nwere Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya?

      “Otu ihe dị njọ n’alụmdi na nwunye ndị nwere nsogbu bụ nkweta a na-ekwetasi ike na ihe apụghị ịka mma. Nkweta dị otú ahụ na-egbochi mgbanwe n’ihi na ọ na-eme ka ị ghara ịchọ ịnwale ihe ọ bụla ga-enye aka.”—DR. AARON T. BECK.

      KA E were ya na i nwere ihe mgbu ma gaa hụ dọkịta ka o lee gị ahụ. Ị na-enwe nchegbu—nke ahụ kwekwara nghọta. E kwuwerị, ahụ ike gị—ọbụna ndụ gị kpọmkwem—pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ. Ma ka e were ya na mgbe o lesịrị gị ahụ, dọkịta ekpugheere gị akụkọ ọma bụ́ na ọ bụ ezie na nsogbu gị abụghị obere nsogbu, a pụrụ ịgwọta ya. N’eziokwu, dọkịta ahụ agwa gị na ọ bụrụ na i jiri nlezianya gbasoo otu usoro ihe oriri na mmega ahụ na-agabigaghị ókè, ị pụrụ ịtụ anya ịgbake kpam kpam. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi ga-eru gị nnọọ ala, ị ga-ejikwa obi ụtọ gbasoo ndụmọdụ ya!

      Jiri ọnọdụ a tụnyere ihe anyị na-atụle. Ị̀ na-enwe nsogbu n’alụmdi na nwunye gị? N’ezie, alụmdi na nwunye ọ bụla ga-enwe nsogbu na nghọtahie ndị nke ya. N’ihi ya, nanị inwetụ nsogbu ná mmekọrịta unu apụtaghị na ị nọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ ihe mgbu ahụ adịgide ruo ọtụtụ izu, ọtụtụ ọnwa, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ? Ọ bụrụ otú ahụ, nchegbu ị na-enwe kwesịrị ekwesị, n’ihi na nke a abụghị obere ihe. N’ezie, otú alụmdi na nwunye gị dị pụrụ imetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ gị—na nke ụmụ unu. Dị ka ihe atụ, e kwenyere na nsogbu alụmdi na nwunye pụrụ ịbụ ihe kasị akpata nsogbu ndị dị ka ịda mbà n’obi, arụpụtaghị ọrụ nke ọma, na ụmụaka emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ma ọ bụghị nanị nke ahụ. Ndị Kraịst na-aghọta na mmekọrịta nke ha na ndị òtù ọlụlụ ha pụrụ imetụta mmekọrịta ha na Chineke kpọmkwem.—1 Pita 3:7.

      Eziokwu ahụ bụ́ na gị na onye òtù ọlụlụ gị nwere nsogbu apụtaghị na olileanya adịghị n’ọnọdụ ahụ. Ikweta ihe ahụ bụ́ eziokwu banyere alụmdi na nwunye—na a ga-enwe ihe isi ike—pụrụ inyere di na nwunye aka ile nsogbu ha anya otú ọ dị n’ezie ma rụọ ọrụ iji dozie ya. Otu di aha ya bụ Isaac na-ekwu, sị: “Amaghị m na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ di na nwunye ịdị na-enwetụ obi ụtọ, na-enwetụkwa obi ilu n’oge alụmdi na nwunye ha. Echere m na ọ dị ihe na-eme anyị!”

      Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye gị adịwo njọ ruo n’ọnọdụ nke na ịhụnanya kọrọ na ya, a pụrụ ịzọpụta ya. N’eziokwu, mmejọ nke esemokwu na-akpata pụrụ ịdị ukwuu, karịsịa ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ adịgidewo ruo ọtụtụ afọ. Ma, e nwere ezi ihe mere a ga-eji nwee olileanya. Mkpali bụ ihe dị oké mkpa. Ọbụna mmadụ abụọ nwere nnukwu nsogbu alụmdi na nwunye pụrụ imeziwanye ihe ma ọ bụrụ na ọ dị ha abụọ mkpa.a

  • A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!
    Teta!—2001 | Jenụwarị 8
    • A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!

      Bible jupụtara na ndụmọdụ ndị dị irè pụrụ ịbara ndị di na ndị nwunye uru. Nke a abụtụghị ihe ijuanya, n’ihi na Onye nyere ike e ji dee Bible bụkwa Onye Mmalite nke ndokwa alụmdi na nwunye.

      BIBLE na-enye nkọwa bụ́ eziokwu banyere alụmdi na nwunye. Ọ na-ekweta na di na nwunye ga-enwe “mkpagbu” ma ọ bụ, dị ka New English Bible si kwuo ya, “ihe mgbu na iru újú.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Ma, Bible kwukwara na alụmdi na nwunye pụrụ ma kwesị inye ọṅụ, ọbụna oké obi ụtọ. (Ilu 5:18, 19) Echiche abụọ a adịghị emegiderịta onwe ha. Nanị ihe ha na-egosi bụ na n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike, di na nwunye pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya na nke ịhụnanya dị na ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya