Ị̀ Maara?
Ole ndị bụ “ndị ezinụlọ Siza” bụ́ ndị si n’aka Pọl kelee Ndị Kraịst ibe ha nọ na Filipaị?
▪ Pọl onyeozi si na Rom degara ọgbakọ Filipaị akwụkwọ n’ihe dị ka n’agbata afọ 60 na 61 Oge Anyị, Siza o kwukwara banyere ya bụ Eze Ukwu Nero. Ma, ole ndị n’ezinụlọ Nero ga-ezigara Ndị Kraịst nọ na Filipaị ozi ekele?—Ndị Filipaị 4:22.
O zighị ezi iche na okwu ahụ bụ́ “ndị ezinụlọ Siza” bụ ezigbo ndị ikwu eze ukwu ahụ. Kama nke ahụ, ndị so na ha bụ ndị niile na-arụrụ eze ukwu ahụ ọrụ, ma ndị ohu ma ndị nweere onwe ha nọ na Rom na n’obodo dị iche iche Rom na-achị. N’ihi ya, ndị so ná “ndị ezinụlọ Siza” ga-abụ ọtụtụ puku ndị ohu ya. Ha na-arụrụ eze ukwu ahụ ọrụ dị iche iche, ma ọrụ nlekọta ma ọrụ ndị dị ala, n’obí ya nakwa n’ebe ndị ọzọ o nwere ala na ụlọ. Ụfọdụ na-esodị arụ ọrụ n’ọchịchị eze ukwu ahụ.
O doro anya na ụfọdụ ndị na-ejere eze ukwu ahụ ozi na Rom ghọrọ Ndị Kraịst. Anyị amaghị ma ọ̀ bụ ozi ọma Pọl kwusara na Rom kpatara ya. Otú o sina dị, o doro anya na ha nwere mmasị pụrụ iche n’ọgbakọ Filipaị. Ebe Filipaị bụ ógbè ndị Rom nke ọtụtụ ndị agha na ndị ọrụ gọọmenti larala ezumike nká bi, ọ ga-abụ na ụfọdụ Ndị Kraịst bi n’ebe ahụ bụ ndị enyi nke ndị ahụ Pọl zitere ozi ekele ha.
Olee ihe bụ́ ikuchi nwaanyị di ya nwụrụ nke e kwuru okwu ya n’Iwu Mozis?
▪ N’Izrel oge ochie, ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, a na-atụ anya na nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwunye ya ka o wee mụtara ya nwa iji mee ka ezinụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ ghara ichi. (Jenesis 38:8) A na-akpọ ndokwa ahụ e mechara tinye n’Iwu Mozis mmadụ ikuchi nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ. (Diuterọnọmi 25:5, 6) Ihe Boaz mere, nke a kọwara n’akwụkwọ Rut, gosiri na otu n’ime ndị ikom ndị ọzọ bụ́ ndị ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ nwekwara ike ikuchi nwunye ya ma ọ bụrụ na o nweghị nwanne ya nwoke dị ndụ.—Rut 1:3, 4; 2:19, 20; 4:1-6.
Ihe ndị Sadusii kwuru banyere nke a, bụ́ nke e dere na Mak 12:20-22, gosiri na a ka na-ekuchi nwaanyị di ya nwụrụ anwụ n’oge Jizọs nọ n’ụwa. Onye Juu bụ́ Flavius Josephus, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ, kwuru na ikuchi nwaanyị di ya nwụrụ na-eme ka aha ezinụlọ ghara ifu, mee ka ala na ihe onwunwe ghara ịbanye n’aka ndị ọzọ, meekwa ka ụwa dịrị nwaanyị di ya nwụrụ ná mma. N’oge ahụ, nwaanyị enweghị ikike iketa ihe onwunwe di ya. Ma, nwa nwoke onye kuchiri ya mụtara ga-eketa ihe onwunwe nke nwoke ahụ nwụrụ anwụ.
Iwu ahụ nyere onye ikwu nke onye ahụ nwụrụ anwụ ohere ịjụ ikuchi nwaanyị di ya nwụrụ. Ma, a na-ewere mmadụ ịjụ ‘iwulite ezinụlọ nwanne ya nwoke’ dị ka ihe mmechuihu.—Diuterọnọmi 25:7-10; Rut 4:7, 8.