Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 6/15 p. 19
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Na-ekpughe “Ihe Ndị Na-aghaghị Ime N’oge Na-adịghị Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ndị Kwe na Ndị Ekweghị A Na-enwe na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ọ̀ Na-emezu Amụma Baịbụl?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Mbili na Ọdịda nke Otu Onyinyo Dị Ukwuu
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Mụta Ihe n’Amụma Ndị E Dere na Baịbụl
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 6/15 p. 19

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe Briten na Amerịka ghọrọ ọchịchị nke asaa Baịbụl kwuru ga-achị ụwa?

▪ Nnukwu ihe oyiyi ahụ e ji ọla na ígwè kpụọ, nke Eze Nebukadneza hụrụ ná nrọ, anọchighị anya alaeze niile chịrị ụwa. (Dan. 2:31-45) Ọ nọchiri anya naanị alaeze ise ndị lụsoro ndị Chineke ọgụ malite n’oge Daniel ruo taa.

Ihe Daniel kọwara banyere ihe oyiyi ahụ gosiri na Briten na Amerịka Bụ́ Mba Abụọ Jikọrọ Aka Na-achị Ụwa ga-esi na Rom pụta, na ha agaghị emeri Rom. N’ihe oyiyi ahụ, Daniel hụrụ na ígwè dị n’ogwe ụkwụ ihe oyiyi ahụ ruru n’ala ala ụkwụ ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ya. (A gwakọtara ígwè na ụrọ n’ala ala ụkwụ ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ya.)a Ọ pụtara na Briten na Amerịka ga-esi na Rom pụta, nke bụ́ ogwe ụkwụ e ji ígwè kpụọ. Ihe ndị mere eme gosiri na ihe a bụ eziokwu. Briten so n’ebe Alaeze Ukwu Rom chịrị, ma ha malitere ịkpa ike ná ngwụcha narị afọ nke iri na asaa. Amerịka mechara ghọọkwa mba siri ike. Ma n’oge ahụ, Briten na Amerịka aghọbeghị alaeze nke asaa ahụ Baịbụl kwuru okwu ya. N’ihi gịnị? N’ihi na Briten na Amerịka ejikọbeghị aka mee ihe ọ bụla pụrụ iche. Ọ bụ mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ ka ha jikọrọ aka mee ihe pụrụ iche.

N’oge ahụ, ọ bụ n’Amerịka ka a kacha nwee “ụmụ nke alaeze.” Isi ụlọ ọrụ ha dịkwa na Bruklin, Niu Yọk. (Mat. 13:36-43) Ndị so ná ndị e tere mmanụ nọkwa na-ekwusa ozi ọma ná mba dị iche iche Alaeze Ukwu Briten na-achị. Mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ, Briten na Amerịka ghọrọ enyi. Ha gbakọrọ aka lụso ndị iro ha ọgụ. Ebe ọ bụ na agha ahụ mere ka ha hụkwuo mba ha n’anya, ha lụsoro ndị so ná mkpụrụ “nwaanyị ahụ” ọgụ. Ha machibidoro ụfọdụ akwụkwọ ha iwu, tụọkwa ndị na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma ha mkpọrọ.—Mkpu. 12:17.

Amụma Baịbụl gosiri na ọchịchị nke asaa ahụ chịrị ụwa amaliteghị ịchị ụwa ná ngwụcha narị afọ nke iri na asatọ, bụ́ mgbe Briten ghọrọ alaeze a ma ama. Kama, ọ malitere ịchị ụwa mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere.b

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụrọ ahụ a gwakọtara ya na ígwè nọchiri anya ndị nọ n’ebe Briten na Amerịka na-achị. Kemgbe ọtụtụ afọ, ụrọ ahụ na-eme ka o siere ha ike ịkpa ike otú ha chọrọ.

b Ihe a kọwara n’ebe a ga-anọchi ihe e kwuru na peeji nke 57, paragraf nke 24 n’akwụkwọ Amụma Daniel nakwa ihe dị na chaatị ndị dị na peeji ya nke 56 na nke 139.

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụmụnna asatọ ndị si n’isi ụlọ ọrụ Watchtower, bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ na Jun 1918

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya