Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 7/1 p. 13
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 7/1 p. 13

Ị̀ MAARA?

Gịnị ka ndị na-arụ ụgbọ mmiri n’oge ochie na-eme ka mmiri ghara ịba n’ụgbọ ha?

E nwere otu nwoke aha ya bụ Lionel Casson. Ọ bụ ọkachamara n’ihe gbasara ụgbọ mmiri ndị a rụrụ n’oge ochie. O kwuru na ọ na-abụ ndị na-arụ ụgbọ mmiri na Rom rụchaa ụgbọ mmiri, ha na-eji ihe techie ebe a kụkọtara osisi abụọ ọnụ. Ha na-ejikarị “bitumen, [ya bụ, korota] ma ọ bụ bitumen na mgbá ete n’ebe dị iche iche a kụkọtara osisi abụọ ọnụ ma ọ bụkwanụ ha etee ya n’okpuru ụgbọ nakwa n’akụkụ ya abụọ. Ha na-etekwa korota n’ime ya.” Tupu oge ndị Rom, ndị Akad oge ochie na ndị Babịlọn na-eji bitumen ete ụgbọ ha ka mmiri ghara ịba na ya.

Bitumen dị mmiri mmiri

Ụdị bitumen a dị mmiri mmiri juru eju n’ebe dị iche iche a kpọrọ aha na Baịbụl

Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuru banyere ụdị ihe a e ji etechi ụgbọ mmiri. O kwuru ya na Jenesis 6:14. Ọ ga-abụ na okwu Hibru a sụgharịrị “korota” pụtara bitumen. Bitumen na-esi n’ime ala apụta.

E nwere ụdị bitumen abụọ na-esi n’ala apụta. Otu na-adị mmiri mmiri, nke ọzọ na-akpụkọ akpụkọ. Ndị na-arụ ụgbọ mmiri n’oge ochie na-eji nke ahụ na-adị mmiri mmiri etechi ụgbọ ha. Ozugbo e tere ya n’ụgbọ, ọ na-akpọ ma sie ike, mee ka mmiri ghara ịba n’ụgbọ.

Bitumen juru eju n’ebe dị iche iche a kpọrọ aha na Baịbụl. Ndagwurugwu Sidim, nke dị nso n’osimiri a na-akpọ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ, “jupụtara n’olulu bitumen.”—Jenesis 14:10.

Olee ihe ndị mmadụ na-eme azụ̀ ha n’oge ochie ka ọ ghara imebi?

Ndị mmadụ ejighị azụ̀ egwu egwu, o teekwala ha tawara ya. Ụfọdụ n’ime ndịozi Jizọs na-akụ azụ̀ n’Osimiri Galili tupu ha amalite iso Jizọs. (Matiu 4:18-22) Ma ó nweghị ihe ọzọ, a na-eburu ụfọdụ azụ̀ e gbutere n’osimiri ahụ gaa n’ebe a na-amịkpọ azụ̀ ka ọ ghara imebi. Ebe ndị a na-anọ amịkpọ azụ̀ dị nso n’osimiri ahụ.

Ebe ndị na-akụ azụ̀ n’oge ochie bu azụ̀ ha gbutere

Ndị na-akụ azụ̀ n’oge ochie n’Ijipt. A pịrị ha n’osisi

Otú e si amịkpọ azụ̀ n’ebe ụfọdụ taa nwere ike ịbụ otú e si amịkpọ ya na Galili n’oge ochie. Ọ na-abụ e gbutechaa azụ̀, ihe mbụ a na-eme bụ ịbọwa ya afọ ma wepụsịa ihe ndị dị n’ime ya, jirikwa mmiri saa ya. Otu akwụkwọ sịrị na “a na-emepe isi azụ̀ tee ya nnu, teekwa ya nnu n’ọnụ nakwa n’ahụ́. E techaa azụ̀ ndị ahụ nnu, a na-edosa ha n’ahịrị n’ahịrị ma jiri ute e tere nnu sachie ha. A na-edosakwa azụ̀ ndị ọzọ n’elu ya ma werekwa ute e tere nnu sachie ha. A na-ahapụzi azụ̀ ndị ahụ ka ha nọọ abalị atọ ma ọ bụ abalị anọ ma ọ bụkwanụ abalị ise. Abalị ole ahụ gachaa, a na-atụgharị azụ̀ ndị ahụ ma hapụ ha ka ha nọọkwa abalị ole ha nọburu. N’oge ahụ a hapụrụ ha, mmiri niile dị ha n’ahụ́ na-ata, nnu na-abanyekwa ha n’ahụ́. Ọ na-abụ azụ̀ ndị ahụ kpọọ, ha esie ezigbo ike.”

A maghị mgbe azụ̀ e si otú a mịkpọọ na-anọru tupu ya emebie. Ma, ebe ọ bụ na ndị Ijipt oge ochie na-eburu azụ̀ ndị e si otú a mịkpọọ gaa ree na Siria, ọ pụtara na azụ̀ ndị e si otú a mịkpọọ anaghị emebi ngwa ngwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya