Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 11/1 p. 10-11
  • Echekwa M na M Na-ekpori Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echekwa M na M Na-ekpori Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • M Na-ewebu Iwe Ọkụ, Na-alụkwa Ọgụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 11/1 p. 10-11
Ebe Pawel na Esther Pyzara na di na nwunye ọzọ nọ na-atụrụ ndụ

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Echekwa M na M Na-ekpori Ndụ

Akụkọ Pawel Pyzara kọrọ

  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1982

  • ABỤ M ONYE: POLAND

  • NDỤ M BIRI: M NA-EME IHE IKE, NA-AṄỤ ỌGWỤ IKE, CHỌỌKWA ỊBỤ ONYE A MA AMA

Foto Pawel Pyzara mgbe ọ na-eto eto

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’otu obere obodo dị́ na Poland. Obodo a na Jamanị gbara agbata obi. Oké ọhịa gbara ebe anyị bi gburugburu. A na-akọkwa ugbo ebe ahụ. Otú ebe niile na-esi adị jụụ na-atọ m ụtọ. Ndị mụrụ m gbara m ume ka m bụrụ ezigbo mmadụ, na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma nweta ezigbo ọrụ.

Nsogbu m bidoro mgbe m gara ịgụkwu akwụkwọ na mahadum dị́ n’obodo a na-akpọ Rọtslọf iji bụrụ onye ọkàiwu. Ebe mụ na ndị mụrụ m na-ebighịzi, mụ na ndị ọjọọ bidoro kpawa. Kemgbe ụwa, m na-enwe mmasị na bọl. Mgbe m metere ndị enyi bọl na-amasịkwa, ihe gbasara bọl bịaziri na-agba mụ ara. Òtù egwuregwu bọl m na-enwe mmasị na ya bụ Wọọsọọ. Ná ngwụcha izu ọ bụla, m na-eso ha aga ebe ọ bụla ha ga-anọ akụ bọl, ebe ọ sọkwara ya ya bụrụ. N’ebe ọ bụla anyị gara, anyị na-aṅụ oké mmanya, na-aṅụ ọgwụ ike, mgbe ụfọdụkwa, anyị na ndị na-akwado òtù egwuregwu bọl ọzọ alụọ ọgụ. M weere ihe ndị a ka ihe ga-enyere m aka inwetatụ onwe m ma m dọgachaa n’ụlọ akwụkwọ n’izu, n’agbanyeghị na m ma na aka ndị uwe ojii kpara m, o nwere ike ime ka ọkàiwu m chọrọ ịbụ gharazie inwe isi.

Mụ na ndị enyi m na-agakarị ebe a na-eme oriri na nkwari na ebe a na-agba disko. Anyị gaa ebe ahụ, ọ naghị ara ahụ́ anyị na ndị mmadụ alụwa ọgụ. Ndị uwe ojii jidere m ugboro ugboro. Ma m na-agbalị ka ha ghara ịkpụpụ m n’ụlọikpe, mgbe ụfọdụ, m na-enye ha aka azụ. Echere m na m na-ekpori ndụ. Ma n’ime ime obi m, ama m na ihe m na-eme adịghị mma. Na Sọnde ọ bụla, m na-aga chọọchị ka m lee ma obi m ọ̀ ga-akwụsịtụ ịma m ikpe.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

N’afọ 2004, Ndịàmà Jehova abụọ bịara na nke m, gwa m ka mụ na ha mụwa Baịbụl, mụ ekweta. Ka m nọ na-amụta ihe mmadụ ga-eme iji bụrụ ezigbo Onye Kraịst, akọnuche m bidoro ịpịa m ụtarị. Ama m na m kwesịrị ịkwụsị ịṅụ oké mmanya, ịṅụ ọgwụ ike, na iso ndị na-anaghị eme ihe Baịbụl kwuru akpa. M mụtakwara na m kwesịrị ịkwụsị iwe iwe ọkụ na ime ihe ike. Ọ bụ eziokwu na m ma na m kwesịrị ịgbanwe, ma, agbanwelighị m.

Ma, o nwere ihe mere otu ụbọchị nke gbanwere ndụ m. Mụ na ụmụ nwoke asatọ malitere ịlụ ọgụ. M ka na-echeta otú ha si kụọ m isi aba okpu, hapụ m mụ atọgbọrọ n’ụzọ. Echere m na m ga-anwụ. Ebidoro m ịrịọ Jehova, sị: “Jehova, biko ewela iwe na ejighị m Okwu gị kpọrọ ihe. I mee ka m ghara ịnwụ, m na-ekwe gị nkwa na mụ na Ndịàmà Jehova ga na-amụ Baịbụl, m ga-agbanwekwa ndụ m.” O juru m anya na anwụghị m. M gakwara soro Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl dị ka m kwere Jehova ná nkwa.

Foto Pawel Pyzara ugbu a

N’afọ 2006, m kwagara Ịngland ka m kpata ego m ga-eji gụkwuo akwụkwọ na Poland ma nwetakwuo akara ugo mmụta. Ma, ka m nọ na-amụ Baịbụl, otu ihe m gụtara Pọl onyeozi kwuru metụrụ m n’obi. Ọ sịrị: “Ana m agụ ihe niile n’ezie dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m bara. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe niile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu, ka m wee rite uru n’ime Kraịst.” (Ndị Filipaị 3:8) O nwere otú ndụ mụ na Pọl onyeozi si yie. Ọ bụbu onye ọkàiwu na onye na-eme ihe ike ka mụnwa. (Ọrụ Ndịozi 8:3) Mana ọ bịara chọpụta na o nwere otú ka mma ọ ga-esi na-ebi ndụ, ya bụ, iji ndụ ya na-efe Chineke ma na-agbalị ike ya iṅomi Jizọs. Mgbe m chebachaara ihe Pọl mere echiche, m ghọtara na ime ihe ike na ịrụ ọrụ a na-akwụ m ezigbo ụgwọ abụghị ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ọ bịara doo m anya na ebe Pọl gbanwere, m ga-agbanwelikwa. M kpebiziri ịnọrọ na Ịngland hapụzie ịgụkwu akwụkwọ.

Ka m na-amụtakwu gbasara Jehova, mụ na ya bịara na-adịkwu ná mma. O metụrụ m n’ahụ́ mgbe m mụtara na Chineke kwere nkwa ịgbaghara ndị mmehie ji obi ha dum chegharịa. (Ọrụ Ndịozi 2:38) Mgbe m gụrụ 1 Jọn 4:16, bụ́ ebe sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya,” ma chebara ihe a m gụrụ echiche, m bịara ghọta ihe mere Chineke ji kpọọ ime ihe ike asị.

M chọrọ iso Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ

Otú Ndịàmà Jehova si akpa àgwà masịkwara m. O doro m anya na ha na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru. M chọrọ iso ha na-enwe obi ụtọ. M mechara gbanwee, ọ bụ eziokwu na ọ dịghịrị m mfe. E mekwara m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova n’afọ 2008.

Ebe Pawel na Esther Pyzara guzo n’akụkụ ihe a na-akwagharị akwagharị e ji etinye akwụkwọ anyị na-ezi otu nwoke ozi ọma

Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị na-eji asụsụ Polish akụziri ndị na-asụ Polish Baịbụl

URU NDỊ M RITERELA:

Ihe ndị m mụtara na Baịbụl agbanweela ndụ m. Anaghịzi m eme ihe ike, achọ ịbụ onye a ma ama, aṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ oké mmanya. Ara bọl anaghịzikwa agba m. Abụzi m ohu Chineke, m na-enwekwa obi ụtọ na m na-akụziri ndị ọzọ Baịbụl. M ka na-elekwa bọl, ma anaghịzi m ekwe ka ọ na-egbochi m ime ihe ndị ka mkpa.

Alụọla m nwaanyị. Aha nwunye ọma m bụ Esther. Mụ na ya na-efekọkwa Jehova ọnụ. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị na-eji asụsụ Polish akụziri ndị na-asụ Polish bí n’Ịngland ebe a Baịbụl. Ọ bụ ugbu a ka ndụ tọwara m ụtọ. Akọnuche m anaghịzi apịa m ụtarị, m na-ebikwa ndụ bara uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya