Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 30, 2010. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Julaị 5 ruo izu Ọgọst 30, 2010.
1. Olee otú ịtụgharị uche n’ekpere Sọlọmọn kpere mgbe a na-arara ụlọ nsọ ahụ nye Chineke ga-esi eme ka anyị ghọtakwuo àgwà Jehova? (1 Eze 8:22-53) [w05 7/1 p. 30 para. 3; it-2-E p. 989 para. 4]
2. Gịnị mere e ji kwuo na Devid ji ‘obi na-eguzosi ike n’ihe’ jeere Jehova ozi n’agbanyeghị na o mere ọtụtụ mmehie? (1 Eze 9:4) [w97 5/1 p. 5 para. 1-2]
3. Gịnị mere eze nwaanyị Shiba ji gwa Sọlọmọn sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị gị; obi ụtọ na-adịrị ndị a na-ejere gị ozi bụ́ ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe niile, na-ege ntị n’amamihe gị!”? (1 Eze 10:4-8) [w99 11/1 p. 20 para. 5-7]
4. Gịnị ka anyị na-aghọta n’iwu ahụ Jehova nyere ka e lie Abaịja? (1 Eze 14:13) [cl p. 244 para. 11]
5. Olee ihe pụrụ iche ma a bịa n’ihe banyere oge mbụ Ịlaịja gara na nke Ehab? (1 Eze 17:1) [w08 4/1 p. 19, igbe]
6. Gịnị ka Ịlaịja bu n’obi kwuo na ụmụ Izrel “na-enwe echiche abụọ dị iche”? (1 Eze 18:21) [w08 1/1 p. 19 para. 3-4]
7. Olee otú akụkọ gbasara Ịlaịja si gosi ihe mere Jehova ji egosi ike ya n’ebe ndị ohu ya nọ? (1 Eze 19:1-12) [cl p. 42-43 para. 15-16]
8. Olee ihe mere Nebọt ekweghị eresị Ehab ubi vaịn ya, oleekwa ihe akụkọ ahụ na-akụziri anyị? (1 Eze 21:3) [w97 8/1 p. 13 para. 18-20]
9. Olee otú o si bụrụ na nwaanyị Shunem ‘sogburu onwe ya’ n’ihi Ịlaịsha? (2 Eze 4:13) [w97 10/1 p. 30 para. 6-8]
10. Gịnị mere Ịlaịsha ekweghị anara onyinye Neeman nyere ya? (2 Eze 5:15, 16) [w05 8/1 p. 9 para. 2]