Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchichị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Disemba 27, 2010. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Nọvemba 1 ruo Disemba 27, 2010.
1. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’abụ ahụ ndị Livaị bụrụ e dere ná 1 Ihe E Mere 16:34? [w02 1/15 p. 11 para. 6-7]
2. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’otú Devid si mesapụ aka? (1 Ihe 22:5, 9) [w05 10/1 p. 11 para. 7]
3. Olee otú Eze Devid si chọọ ka Sọlọmọn nwa ya si na-ele Chineke anya? (1 Ihe 28:9) [w08 10/15 p. 7 para. 18]
4. Gịnị mere o ji daba adaba na ọ bụ oké ehi ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka e dewere n’ala oké osimiri ahụ a wụrụ awụ? (2 Ihe 4:2-4) [w05 12/1 p. 19 para. 3; w98 6/15 p. 16 para. 17]
5. Ọ̀ bụ naanị mbadamba nkume abụọ ahụ dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ka è nwere ihe ndị ọzọ dị n’ime ya? (2 Ihe 5:10) [w06 1/15 p. 31]
6. Olee otú ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn wuru na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị anyị nwere taa si yie? (2 Ihe 6:18-21) [w05 12/1 p. 19 para. 8]
7. Eze Esa ò wepụrụ “ebe ndị dị elu” niile? (2 Ihe 14:2-5; 15:17) [w05 12/1 p. 20 para. 3]
8. Olee otú 2 Ihe E Mere 17:9, 10 nwere ike isi gbasa ozi ọma anyị? [w09 6/15 p. 12 para. 7]
9. Olee otú ndị Chineke taa na-esi eme ihe e kwuru ná 2 Ihe E Mere 20:17? [w03 6/1 p. 21-22 para. 14-17]
10. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’àgwà mpako ahụ Eze Ọzaya kpara? (2 Ihe 26:15-21) [w99 12/1 p. 26 para. 1-2]