Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Eprel 28, 2014.
Gịnị nyeere Josef aka ka o nwee ike ịgbapụ mgbe nwunye Pọtịfa chọrọ ka ha dinaa? (Jen. 39:7-12) [Mach 3, w13 2/15 p. 4 para. 6; w07 10/15 p. 23 para. 16]
Olee ihe ndị a na-emegbu emegbu ga-amụta n’aka Josef? (Jen. 41:14, 39, 40) [Mach 10, w04 1/15 p. 29 para. 6; w04 6/1 p. 20 para. 4]
Gịnị ka Josef chọpụtara nke mere o ji gbaghara ụmụnne ya? [Mach 17, w99 1/1 p. 30 para. 6-7]
Olee otú ebo Benjamin si mezuo amụma dị na Jenesis 49:27? [Mach 24, w12 1/1 p. 29, igbe]
Gịnị ka Ọpụpụ 3:7-10 na-akụziri anyị banyere Jehova? [Mach 31, w09 3/1 p. 15 para. 3-6]
Olee otú Jehova si gosi na ya ruru eru ịza aha ya n’oge ahụ Mozis dị ndụ? (Ọpụ. 3:14, 15) [Mach 31, w13 3/15 p. 25 para. 5-6]
Olee otú Mozis si “bụụrụ Fero Chineke” dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 7:1? [Epr. 7, w04 3/15 p. 25 para. 7]
N’agbanyeghị na ndị Izrel hụrụ otú Jehova si napụta ha n’Ijipt, gịnị ka ha mechara mee? Gịnị ka anyị mụtara na ya? (Ọpụ. 14:30, 31) [Epr. 14, w12 3/15 p. 26-27 para. 8-10]
Jehova kwuru n’Ọpụpụ 19:4 na ya buuru ụmụ Izrel “na nku ugo.” Olee otú ihe a o kwuru si gosi otú o si nyere ụmụ Izrel aka mgbe ha si n’Ijipt pụta? [Epr. 28, w96 6/15 p. 10 para. 5–p. 11 para. 2]
Olee otú o si bụrụ na Jehova “na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie nna ha”? (Ọpụ. 20:5) [Epr. 28, w04 3/15 p. 27 para. 1]