Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 25, 2014.
Olee otú Levitikọs 18:3 ga-esi enyere anyị aka ịna-ele ihe dị mma anya ọma ma na-ele ihe dị njọ anya ọjọọ? (Efe. 4:17-19) [Julaị 7, w02 2/1 p. 29 para. 4]
Gịnị ka anyị mụtara n’iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel nke dị na Levitikọs 19:2? Gịnịkwa mere anyị ga-eji gbalịa na-erube isi na ya? [Julaị 7, w09 7/1 p. 9 para. 5]
Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha ghara ịna-atụtụkọrọ ihe ha wefọrọ n’ubi. Gịnị ka anyị mụtara n’iwu ahụ? (Lev. 19:9, 10) [Julaị 7, w06 6/15 p. 22-23 para. 13]
Olee otú o si bụrụ na iwu ‘anya laara anya’ anaghị akwado mmadụ imegwara ihe e mere ya? (Lev. 24:19, 20) [Julaị 14, w09 9/1 p. 22 para. 3-4]
Olee mgbe onye Izrel na-ekwesịghị ịnara ọmụrụ nwa n’ego o binyere mmadụ? Oleekwa mgbe o nwere ike ịnara ọmụrụ nwa? (Lev. 25:35-37) [Julaị 21, w04 5/15 p. 24 para. 3]
Gịnị mere Baịbụl ji ekwukarị banyere ebo iri na abụọ nke Izrel ebe ọ bụ na ọ dị iri na atọ? (Ọnụ Ọgụ. 1:49, 50) [Julaị 28, w08 7/1 p. 21]
N’Ọnụ Ọgụgụ 8:25, 26, Jehova kwuru na onye Livaị ọ bụla ruru iri afọ ise ga-ala ezumike nká. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe a Jehova kwuru gbasara ndị katarala ahụ́? [Ọgọ. 11, w04 8/1 p. 25 para. 1]
Olee ihe mere ụmụ Izrel ji malite ịtamu ntamu mgbe Jehova napụtachara ha n’ala Ijipt? Oleekwa ihe anyị mụtara n’ihe ahụ ha mere? (Ọnụ Ọgụ. 11:4-6) [Ọgọ. 18, w95 3/1 p. 16 para. 10]
Olee ihe anyị mụtara n’ihe Mozis mere mgbe Eldad na Midad malitere ime ka ndị amụma? (Ọnụ Ọgụ. 11:27-29) [Ọgọ. 18, w04 8/1 p. 26 para. 4]
N’Ọnụ Ọgụgụ 15:37-39, Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha na-adụnye “ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha,” gịnị ka anyị mụtara n’ihe ahụ ọ gwara ha? [Ọgọ. 25, w04 8/1 p. 26 para. 7]