Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w21 Disemba p. 14
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Levitikọs Ga-esi Enyere Anyị Aka Ịna-emeso Ndị Ọzọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Enyela Ekwensu Ohere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Unu Ga-adị Nsọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • “Ka E Doo Aha Gị Nsọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
w21 Disemba p. 14
Ebe otu nwanna nwaanyị na-akatọ nwanna ọzọ nọ n’ọgbakọ ha.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere e ji nye iwu ahụ dị na Levitikọs 19:16 nke sịrị: “Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị”? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta na ya?

Jehova gwara ndị Izrel ka ha dịrị nsọ. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha, sị: “Agala na-ekwutọsị onye ọzọ n’ihu ụmụnna gị. Agbala mbọ ka i gbuo mmadụ ibe gị. Abụ m Jehova.”​—Lev. 19:​2, 16.

Olee otú anyị kwesịrị isi aghọta okwu a bụ́ “agbala mbọ ka i gbuo” mmadụ ibe gị? Otu akwụkwọ Hibru kọwara akwụkwọ Levitikọs kwuru gbasara ihe a, sị: “Ihe e kwuru n’amaokwu a . . . siri ike ịsụgharị n’ihi na o siri ike ịghọta ihe akpaala okwu Hibru ahụ pụtara. A sụgharịa okwu ndị ahụ, ọ pụtara ‘eguzola n’akụkụ ihe ma ọ bụ n’ebe dị ya nso.’”

Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl chere na o nwere ihe jikọrọ okwu ahụ na ihe e kwuru n’amaokwu bu ya ụzọ nke sịrị: “Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi. Unu emerela ogbenye ebere maka na ọ bụ ogbenye. Unu emenyekwarala ọgaranya maka na ọ bụ ọgaranya. Na-ekpenụ mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.” (Lev. 19:15) Ọ bụrụ otú ahụ, iwu ahụ dị n’amaokwu nke iri na isii nke kwuru ka mmadụ ghara iguzo n’akụkụ onye ọzọ ma ọ bụ ịnọ ya nso nwere ike ịpụta na ndị Chineke ekwesịghị imegide mmadụ ibe ha n’ụlọ ikpe, n’azụmahịa ma ọ bụkwanụ n’ezinụlọ. Onye ahụ ekwesịghị ịghọgbu onye ọzọ ka ọ baara ya uru. Ọ bụ eziokwu na anyị ekwesịghị ime ihe ndị a, ma, e nwere otú ka mma anyị nwere ike isi ghọta amaokwu nke iri na isii a.

Chegodị ihe e kwuru ná mmalite amaokwu nke iri na isii ahụ. Chineke nyere ndị ya iwu ka ha ghara ịna-akatọ ndị ọzọ. Cheta na nkatọ dị njọ karịa ịgba asịrị, ọ bụ eziokwu na asịrị nwekwara ike ịkpata nsogbu. (Ilu 10:19; Ekli. 10:​12-14; 1 Tim. 5:​11-15; Jems 3:6) Nkatọ na-abụkarị ụgha mmadụ kpachaara anya ghagide mmadụ ibe ya iji mebie aha onye ahụ. Onye na-akatọ mmadụ nwere ike gbaa akaebe ụgha iji megide mmadụ, ọ bụrụgodị na ime otú ahụ nwere ike ịkpata ọnwụ onye ahụ. Cheta na ọ bụ ndị nkatọ gbara akaebe ụgha megide Nebọt nke mere ka e jiri nkume tụgbuo ya. (1 Eze 21:​8-13) N’eziokwu, e nwere ike ikwu na onye na-akatọ mmadụ na-agba mbọ ka o gbuo ya, dị ka e kwuru ná ngwụcha Levitikọs 19:16.

Ihe ọzọkwa bụ na mmadụ nwere ike ịkatọ mmadụ ibe ya n’ihi na ọ kpọrọ ya asị. 1 Jọn 3:​15, sịrị: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwa na e nweghị ogbu mmadụ ga-enweta ndụ ebighị ebi.” Ọ dị mkpa ịmara na mgbe Chineke kwuchara ihe dị n’amaokwu nke iri na isii, ọ sịrị: “Akpọla nwanna gị asị n’obi gị.”​—Levitikọs 19:17.

N’ihi ya, ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 19:16 na-akụziri Ndị Kraịst ihe dị ezigbo mkpa. Anyị ekwesịghị ịna-echere mmadụ echiche ọjọọ ma ọ bụ na-akatọ mmadụ. Ọ bụrụ na anyị akatọọ mmadụ n’ihi na anyị na-emere ya anyaụfụ, o nwere ike igosi na anyị kpọrọ ya asị. Ndị Kraịst kwesịkwara izere ịkpọ mmadụ asị chaa chaa.​—Matiu 12:​36, 37.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya