Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yb16 p. 82-p. 85 para. 5
  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Indoneshia

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Indoneshia
  • Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016
yb16 p. 82-p. 85 para. 5

INDONESHIA

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Indoneshia

Otú Ala Ya Dị Indoneshia dị n’agbata Ọstrelia na kọntinent a na-akpọ Eshia. Ọ bụ obodo kacha nwee agwaetiti n’ụwa niile. E nwere ihe karịrị puku agwaetiti iri na asaa na narị ise na ya. Ọtụtụ n’ime ha nwere ugwu ndị elu ha na-adịghị larịị na oké ọhịa. Indoneshia bụkwa obodo kacha nwee ugwu na-agbọpụ ọkụ n’ụwa. E nwere ihe karịrị otu narị ugwu na-agbọpụ ọkụ na ya.

Ebe otu nwaanyị Indoneshia na-eke ihe ụmụ nwaanyị ndị obodo ha na-eke n’isi

Ndị Bi na Ya Indoneshia bụ obodo nke anọ ndị mmadụ kacha biri n’ụwa. Atọ ndị mbụ bụ Chaịna, India, na Amerịka. E nwere ihe karịrị narị agbụrụ atọ n’Indoneshia. E kee ndị bi na ya ụzọ iri, ihe dị ka ụzọ isii bụ ndị Javan na ndị Sudan.

Okpukpe Ha Ihe dị ka mmadụ itoolu n’ime ndị Indoneshia iri ọ bụla bụ ndị Alakụba. Ndị ọzọ bụ ndị Hindu, ndị Buda, na ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst. Ọtụtụ na-ekpe okpukpe ọdịnala.

Asụsụ Ha E nwere ihe karịrị narị asụsụ asaa a na-asụ n’Indoneshia. Ma, ọ bụ Indoneshian ka a kacha asụ. Ebe e si nweta ya bụ n’asụsụ Malei. Ọtụtụ na-asụkwa asụsụ obodo ha n’ụlọ ha.

Ndị na-amị anụ

Ihe Ha Na-arụ Ọtụtụ na-arụ ọrụ ugbo ma ọ bụ na-azụ ahịa. Ha nwekwara osisi na mmanụ nakwa akụ̀ ndị ọzọ dị n’ime ala. Indoneshia so n’obodo ndị kacha nwee rọba na mmanụ nri.

Nri Ha Na-eri Nri ndị Indoneshia na-erikarị bụ osikapa. Nri ndị ọzọ bụ osikapa e ji àkwá na akwụkwọ nri sie, anụ a mịrị amị, na salad a na-etinye ahụekere a kwọrọ akwọ.

Otú Ebe ahụ Na-adị Ọ na-ekpokarị ọkụ. Ifufe a na-akpọ Monsoon, nke na-esi n’oké osimiri, na-eme ka e nwee udu mmiri na ọkọchị. Égbè eluigwe na-agbakarịkwa n’Indoneshia.

OTÚ ALA HA HÀ (na kilomita)

737,815 (1,910,931 sq km)

MMADỤ OLE BI NA YA

256,000,000

NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA N’AFỌ 2015

26,246

MMADỤ OLE OTU ONYE NKWUSA KETARA IZI OZI ỌMA

9,754

NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AFỌ 2015

55,864

Map Indoneshia
    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya