Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 22
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Eziokwu Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Oge Na-adịghị Anya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Alaeze Chineke
    Teta!—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 22
Ebe Jizọs Kraịst nọ n’ocheeze na-achị n’eluigwe

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

Alaeze Chineke bụ ọchịchị Jehova hiwere. Ọ dị n’eluigwe, ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “alaeze eluigwe.” (Mak 1:14, 15; Matiu 4:17) Ọ bụ eziokwu na Alaeze Chineke na ọchịchị ụmụ mmadụ yitụrụ, ọ ka ya mma okpukpu iri.

  • Ole Ndị Na-achị na Ya? Chineke chiri Jizọs Kraịst Eze n’Alaeze ya. O nyekwara ya ikike karịrị ikike ndị ọchịchị ụwa a nwere. (Matiu 28:18) Jizọs anaghị eji ikike a Chineke nyere ya echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala. Otú anyị si mara bụ na mgbe ọ bịara n’ụwa, o nweghị onye o megburu, kama o ji obi ebere mesoo ụmụ mmadụ ihe. (Matiu 4:23; Mak 1:40, 41; 6:31-34; Luk 7:11-17) Chineke nyere Jizọs ikike ka ọ họta ụmụ mmadụ ndị ha na ya ga-eso chịa ụwa, ndị ọ họtara esighịkwa n’otu mba.—Mkpughe 5:9, 10.

  • Afọ Ole Ka Ọ Ga-achịru? Ọchịchị ụmụ mmadụ na-agbanwe agbanwe, a ga-emechakwa bibie ha niile. Ma, Alaeze Chineke ga-achị ruo mgbe ebighị ebi, a gaghịkwa ebibi ya ebibi.—Daniel 2:44.

  • Ole Ndị Ọ Na-achị? Ọ na-achị onye ọ bụla na-eme uche Chineke n’agbanyeghị obodo onye ahụ bi, na agbụrụ o si.—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  • Olee Iwu Chineke Nyere Ndị Alaeze Ya Na-achị? Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya na-achị kwuru ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Iwu ahụ na-enyekwara ha aka ka ha na-akpa ezigbo àgwà. Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” (Matiu 22:37-39) Ihe mere ndị Alaeze Chineke na-achị ji na-emere ndị ọzọ ihe ọma bụ maka na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya.

  • Gịnị Ka Ọ Na-akụziri Ndị Ọ Na-achị? Ọ bụ eziokwu na Alaeze Chineke achọghị ka ndị ọ na-achị na-eme otú masịrị ha, ọ na-akụziri ha otú ha ga-esi na-eme ihe Chineke chọrọ ka ha mee.—Aịzaya 48:17, 18.

  • Gịnị Ka Ọ Ga-emere Ndị Ọ Na-achị? Alaeze Chineke abụghị ọchịchị fọọ fọjuo akpa. Kama, ọ ga-emere ụmụ mmadụ ihe niile Chineke bu n’obi imere ha. Ọ ga-emekwa ka ndị hụrụ Chineke n’anya dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa a mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.—Aịzaya 35:1, 5, 6; Matiu 6:10; Mkpughe 21:1-4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya