Job
33 “Ma ugbu a, Job, nụrụ okwu m,
Ṅaakwa ntị n’ihe niile m na-ekwu.
5 Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike,
Doo okwu n’usoro n’ihu m; jikere ejikere.
7 Lee! Ọ dịghị ihe ụjọ dị n’ebe m nọ nke ga-emenye gị ụjọ,
Ọ dịghịkwa nsogbu m na-enye gị nke+ ga-adị arọ n’ahụ́ gị.
8 Ọ bụ naanị na i kwuwo ná ntị m,
Anọwokwa m na-anụ ka ị na-ekwu, sị,
9 ‘Adị m ọcha, enweghịkwa m njehie;+
Adị m ọcha, adịghịkwa m emejọ ihe.+
14 N’ihi na Chineke na-ekwu okwu otu ugboro,
Nakwa ugboro abụọ+—ọ bụ ezie na mmadụ adịghị eji ya akpọrọ ihe—
15 Ná nrọ,+ bụ́ ọhụụ+ nke abalị,
Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ,
Mgbe ụra na-atụ ha n’elu ihe ndina.+
16 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ụmụ mmadụ,+
Ọ na-emekwa ka okwu ịdọ aka ná ntị ya bamie ha n’obi,
17 Iji mee ka mmadụ si n’omume ya chigharịa,+
Nakwa ka o wee napụta mmadụ n’aka nganga.+
19 A na-ejikwa ihe mgbu adọ ya aka ná ntị n’elu ihe ndina ya,
Ihe mgbu ọ na-enwe n’ọkpụkpụ ya adịghịkwa akwụsị akwụsị.
20 Ndụ ya na-eme ka nri ghọọ ihe na-asọ oyi,+
Mkpụrụ obi ya na-emekwa ka nri dị mma ghọọ ihe na-asọ oyi.
21 Ọ taala ahụ́,
Ọkpụkpụ ya ndị a na-adịbughị ahụ anya apụtawo ìhè.
23 Ọ bụrụ na o nwere onye ozi,
Ọnụ na-ekwuchitere ya, otu n’ime otu puku mmadụ,
Onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi ọ ga-eme,
24 O wee meere ya amara, sị,
‘Napụta ya ka ọ ghara ịgbada n’olulu!+
Enwetawo m ihe mgbapụta!+
25 Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata;+
Ka ọ laghachi otú ọ dị n’oge o nwere ike okorobịa.’+
26 Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nwee mmasị n’ebe ọ nọ,+
Ọ ga-ejikwa iti mkpu ọṅụ hụ ihu ya,
Ọ ga-enyeghachi mmadụ efu ezi omume Ya.
27 Ọ ga-abụrụ ụmụ mmadụ abụ wee sị,
‘Emehiewo m;+ emewokwa m ka ihe kwụ ọtọ gbagọọ agbagọ,
Ọ bụghịkwa ihe m kwesịrị ime ma ọlị.
29 Lee! Chineke na-eme ihe a niile,
ọ na-emere ya mmadụ, ugboro abụọ, ugboro atọ
30 Iji gbochie mkpụrụ obi ya ịba n’olulu,+
Ka ìhè nke ndị dị ndụ wee nye ya ìhè.+
31 Ṅaa ntị, Job! Gee m ntị!
Dere duu, mụ onwe m ga na-ekwukwa ihe m na-ekwu.
32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ọ bụla ị ga-asa m, saa m ya;
Kwuo okwu, n’ihi na ezi omume gị na-atọ m ụtọ.