Job
38 Jehova wee si n’oké ifufe+ zaa Job, sị:
2 “Ònye bụ onye a nke na-ekpuchi ihe e zubeworo
Site n’ikwu okwu amamihe na-adịghị na ya?+
5 Ònye kpebiri otú ọ ga-aha, ma ọ bụrụ na ị maara,
Ka ọ̀ bụ onye setịrị eriri e ji atụ̀ ihe n’elu ya?
7 Mgbe kpakpando ụtụtụ+ tikọrọ mkpu ọṅụ ọnụ,
Ụmụ Chineke+ niile amalitekwa iti mkpu otuto?
8 Ọ̀ bụkwa onye ji ibo ụzọ gbochie oké osimiri,+
Bụ́ nke malitere ịsọpụta dị ka à ga-asị na o si n’akpa nwa pụta n’ike;
9 Mgbe m yiwere ya ígwé ojii dị ka uwe,
Waakwa ya oké ọchịchịrị dị ka ákwà,
10 M wee kpaara ya ókè,
Tinyekwa ihe ntụchi na ibo ụzọ,+
11 M wee sị: ‘Ebe a ka ị ga-erute, ị gaghịkwa agabiga ya;+
Ebe a kwa ka ebili mmiri gị nke dị nganga ga-ejedebe’?+
12 Ọ̀ bụ malite n’ụbọchị gị ka i nyere ụtụtụ iwu?+
Ọ̀ bụ gị mere ka chi ọbụbọ mara ọnọdụ ya,
13 Ka o wee bọọ n’ebe niile ụwa sọtụrụ,
Ka e wee yọgharịa ụwa, ndị ajọ omume ewee si n’ime ya dapụsịa?+
18 Ì jirila amamihe chebara ebe ndị sara mbara n’ụwa+ echiche?
Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe a niile.
19 Olee ụzọ e si aga n’ebe ìhè bi?+
Oleekwa ebe bụ́ ụlọ ọchịchịrị,
20 Nke na ị ga-akpọrọ ya gaa n’ókè ya,
Nke na ị ga-aghọtakwa okporo ụzọ e si aga n’ụlọ ya?
22 Ị̀ banyetụla n’ụlọ a kwakọbara snoo,+
Ka ị̀ na-ahụ ọbụna ụlọ a kwakọbara akụ́ mmiri ígwé,+
23 Bụ́ nke m debere maka oge ahụhụ,
Maka ụbọchị ịlụ ọgụ na ibu agha?+
25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,
Waakwara oké mmiri ozuzo na égbè eluigwe ụzọ,+
26 Ime ka mmiri zoo n’ala mmadụ na-ebighị,+
N’ala ịkpa mmadụ na-ebighị,
27 Iji mee ka afọ ju ebe oké mmiri ozuzo mebisịrị nakwa ebe tọgbọrọ n’efu,
Meekwa ka ahịhịa pulite n’ala?+
31 Ị̀ pụrụ ikesi ihe kekọtara ìgwè kpakpando Kaịma ike,
Ka ị̀ pụrụ ịtọghe ụdọ kekọtara ìgwè kpakpando Kisịl?+
32 Ị̀ pụrụ ime ka ìgwè kpakpando Mazarọt pụta n’oge ya?
Ị̀ pụrụ iduzi ìgwè kpakpando Ash na ụmụ ya?
35 Ị̀ pụrụ izipụ àmụ̀mà ka ha gawa
Wee sị gị, ‘Lee anyị!’?
36 Ònye tinyere amamihe+ n’ígwé ojii,
Ka ọ̀ bụ onye mere ka ihe ndị na-eme na mbara igwe nwee nghọta?+
37 Ònye pụrụ iji amamihe ya kwuo ole ígwé ojii dị kpọmkwem,
Ma ọ bụ ite mmiri nke eluigwe—ònye pụrụ ikpu ha ihu,+
38 Mgbe uzuzu na-awụpụ dị ka ihe gbazere agbaze,
Ájá ụrọ ana-anyakọtakwa ọnụ?