Abụ olu ụtọ e ji enye ekele.+
100 Tikuonụ Jehova mkpu mmeri, unu ndị niile bi n’ụwa.+
2 Jirinụ ọṅụ jeere Jehova ozi.+
Jirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.+
3 Maranụ na Jehova bụ Chineke.+
Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị.+
Anyị bụ ndị ya, bụrụkwa atụrụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya.+
4 Jirinụ ekele bata n’ọnụ ụzọ ámá ya,+
Jirikwanụ otuto bata n’ogige ya.+
Keleenụ ya, gọzienụ aha ya.+
5 N’ihi na Jehova dị mma;+
Obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi,+
Ikwesị ntụkwasị obi ya na-adịkwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+