Isi nke Anọ
“Unu Onwe Unu Bụ Ndị Àmà M”!
1. Olee otú Jehova si eji amụma eme ihe, oleekwa otú ndị ya ga-esi meghachi omume n’amụma mezurunụ?
IKIKE ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu bụ otu ihe nke na-eme ka ezi Chineke ahụ dị iche na chi ụgha dị iche iche. Ma mgbe ọ bụla Jehova buru amụma, ọ na-ebu ihe karịrị igosipụta ịbụ Chineke ya n’uche. Dị ka e gosiri n’Aịsaịa isi 43, Jehova na-eme ka amụma bụrụ ma ihe àmà nke ịbụ Chineke ya ma nke ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ nọ. N’aka nke ọzọ, ndị ya agajeghị ịhụ amụma mezurunụ ma mechie ọnụ ha; ha ga-agba akaebe ihe ha hụworo. Ee, ha ga-abụ ndị àmà Jehova!
2. (a) Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke Israel n’oge Aịsaịa? (b) Olee otú Jehova si meghee anya ndị ya?
2 N’ụzọ dị mwute, ka ọ na-erule n’oge Aịsaịa, Israel nọ n’ọnọdụ dị oké njọ nke na Jehova weere ndị ahụ dị ka ndị ọrụsị n’ụzọ ime mmụọ. “Mee ka ndị kpuru ìsì nwere anya abụọ pụta, ha na ndị ntị chiri ma ha nwere ntị.” (Aịsaịa 43:8) Olee otú ndị kpuru ìsì na ndị ntị chiri n’ụzọ ime mmụọ pụrụ isi jeere Jehova ozi dị ka ndị àmà ya dị ndụ? Ọ bụ nanị n’otu ụzọ. A ghaghị imeghe anya ha na ntị ha n’ụzọ ọrụ ebube. Jehova meghekwara ha! N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, Jehova nyere ha ahụhụ siri ike—ndị bi n’alaeze ebe ugwu nke Israel gara biri n’ala ọzọ na 740 T.O.A., ndị bikwa na Juda, gara na 607 T.O.A. Jehova jiziri ike mee ihe n’ihi ndị ya site n’ịtọhapụ ha na iweghachi ihe fọdụrụnụ, bụ́ ndị chegharịrịnụ e mere ka ha nweghachi ume n’ụzọ ime mmụọ, n’ala nna ha na 537 T.O.A. N’ezie, Jehova nwere nnọọ obi ike na a pụghị igbochi nzube ya n’ihe banyere nke a nke na afọ 200 tupu o mee, o kwuru banyere ntọhapụ nke Israel dị ka a ga-asị na o meelarị emee.
3. Agbamume dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị ga-eje biri n’ala ọzọ n’ọdịnihu?
3 “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye keworo gị, Jekọb, Nke kpụwokwara gị, Israel: Atụla egwu, n’ihi na agbapụtawo m gị; akpọwo m gị n’aha gị, nke m ka ị bụ. Mgbe ị na-agabiga n’ime mmiri, gị ka M ga-anọnyere; mgbe ị na-agabiga n’ime osimiri, ha agaghị eruchapụ gị: mgbe ị na-eje ije n’ọkụ, ọkụ agaghị ahụ gị; ire ọkụ agaghị erekwa gị ọkụ. N’ihi na Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke gị, na Onye Nsọ nke Israel, na onye nzọpụta gị.”—Aịsaịa 43:1-3a.
4. Olee otú Jehova si bụrụ Onye Okike nke Israel, mmesi obi ike dịkwa aṅaa ka o nyere ndị ya banyere nlaghachi ha n’ala nna ha?
4 Jehova nwere mmasị pụrụ iche n’ebe Israel nọ n’ihi na mba ahụ bụ nke ya. Ọ bụ ihe o kere n’onwe ya iji mezuo ọgbụgba ndụ Abraham. (Jenesis 12:1-3) Ya mere, Abụ Ọma 100:3 na-ekwu, sị: “Maranụ na Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke: Ya onwe ya emewo anyị, ọ bụkwa Ya nwe anyị; anyị bụ ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” Dị ka Onye Okike na Onye Mgbapụta nke Israel, Jehova ga-akpọlata ndị ya n’ala nna ha n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ihe mgbochi, ndị dị ka mmiri, osimiri na-ekwo ekwo, na ọzara na-ere ọkụ, agaghị egbochi ha ma ọ bụ merụọ ha ahụ, dịkwa ka ihe ndị yiri ha na-adọghachighị ndị nna nna ha azụ otu puku afọ tupu mgbe ahụ n’oge ha na-aga Ala Nkwa ahụ.
5. (a) Olee otú ihe Jehova kwuru si akasi Israel ime mmụọ obi? (b) Olee ndị bụ ndị enyi nke Israel ime mmụọ, oleekwa ndị sere onyinyo ndị a?
5 Ihe Jehova kwuru na-enyekwa ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ n’oge a nkasi obi, bụ́ nke ndị so n’ime ha bụ ihe “e kere ọhụrụ” e ji mmụọ nsọ mụta. (2 Ndị Kọrint 5:17) Ebe ha jiworo anyaike pụta n’ihu “mmiri” nke ihe a kpọrọ mmadụ, ha enwetawo nchebe ịhụnanya nke Chineke gafere idei ihe atụ dị iche iche. Ọkụ na-esi n’ebe ndị iro ha nọ apụta emerụbeghị ha ahụ, kama nke ahụ, o nyewo aka nụchaa ha. (Zekaraịa 13:9; Mkpughe 12:15-17) Nlekọta Jehova agụnyewokwa “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị sonyewooro mba ime mmụọ nke Chineke. (Mkpughe 7:9; Jọn 10:16) “Ọtụtụ ndị gwara ọgwa,” bụ́ ndị so ndị Israel pụta n’Ijipt nakwa ndị na-abụghị ndị Juu bụ́ ndị so ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ a tọhapụrụ atọhapụ lọta site na Babilọn, sere onyinyo ndị a.—Ọpụpụ 12:38; Ezra 2:1, 43, 55, 58.
6. Olee otú Jehova si gosi na ya bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi n’ihe banyere ịgbapụta (a) Israel anụ ahụ? (b) Israel ime mmụọ?
6 Jehova kwere nkwa ịnapụta ndị ya na Babilọn site n’iji ndị agha Midia na Peasia mee ihe. (Aịsaịa 13:17-19; 21:2, 9; 44:28; Daniel 5:28) Dị ka Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi, Jehova ga-enye “ndị o were n’ọrụ,” bụ́ ndị Midia na Peasia, ihe mgbapụta kwesịrị ekwesị maka Israel. “Enyewom Ijipt ka ọ bụrụ ihe mgbapụta gị, enyewo m Etiopịa na Seba n’ọnọdụ gị. Ebe ị ghọworo ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya m, ebe a sọpụrụwokwaara gị, ebe Mụ onwe m hụwokwara gị n’anya; ya mere M ga-enye mmadụ n’ọnọdụ gị, nyekwa ndị dị iche iche n’ọnọdụ ndụ gị.” (Aịsaịa 43:3b, 4) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụ eziokwu na Alaeze Ukwu Peasia meriri Ijipt, Etiopịa, nakwa Seba dị ha nso, dị nnọọ ka Chineke buru n’amụma. (Ilu 21:18) Na 1919, site n’aka Jisọs Kraịst, Jehova, n’otu aka ahụ, tọhapụrụ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ n’ojiji e ji ha. Otú ọ dị, Jisọs achọghị ụgwọ ọrụ maka ozi ndị o jere. Ọ bụghị onye ọchịchị na-ekpere arụsị. Ọ bụkwa ụmụnna ya n’ụzọ ime mmụọ ka ọ na-atọhapụ. E wezụga nke ahụ, na 1914, Jehova enyeworịị ya “mba nile ka ha bụrụ ihe nketa [ya], na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe [ya].”—Abụ Ọma 2:8.
7. Mmetụta dị aṅaa ka Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ, ma n’oge ochie ma n’oge a?
7 Rịba ama otú Jehova si kwupụta hoo haa mmetụta ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị a gbapụtara agbapụta nọ. Ọ gwara ha na n’anya ya, ha dị “oké ọnụ ahịa,” bụrụkwa ndị ‘kwesịrị nsọpụrụ’ nakwa na ya ‘hụrụ ha n’anya.’ (Jeremaịa 31:3) O nwere ụdị mmetụta ahụ—ọbụna karị—n’ebe ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe taa nọ. E mewo ka ndị Kraịst e tere mmanụ na Chineke nwee mmekọrịta, ọ bụghị site n’ọmụmụ, kama site n’ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ Chineke mgbe ha rarasịịrị onwe ha nye Onye Okike ha. Jehova adọtawo ndị a n’ebe Ọkpara ya nọ na n’ebe ya onwe ya nọ ma dee iwu na ụkpụrụ ya n’obi ha nke na-anabata ihe.—Jeremaịa 31:31-34; Jọn 6:44.
8. Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova na-enye ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, oleekwa otú mgbapụta ha ga-adị ha n’obi?
8 N’inyekwu ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ mmesi obi ike, Jehova na-ekwukwasị: “Atụla egwu; n’ihi na gị ka M nọnyeere: M ga-eme ka mkpụrụ gị si n’Ọwụwa anyanwụ bịa, M ga-esikwa n’Ọdịda anyanwụ chịkọta gị; M ga-asị Ugwu, Nye; sịkwa Ndịda, Egbochila: mee ka ụmụ m ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, gị meekwa ka ụmụ m ndị inyom si ná nsọtụ ụwa bịa; onye ọ bụla nke a na-akpọ n’aha m, nke M kewokwara nye nsọpụrụ m; akpụwo m ya; ee, emewo m ya.” (Aịsaịa 43:5-7) Ọbụna akụkụ kasị dịrị n’ime n’ụwa abụghị ebe Jehova na-agaghị eru mgbe oge ruru ịtọhapụ ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom na ịkpọghachi ha n’ala nna ha ha hụrụ n’anya. (Jeremaịa 30:10, 11) O doro anya na n’anya ha, ntọhapụ a ga-akarị mgbapụta a gbapụtara mba ahụ n’Ijipt tupu mgbe ahụ.—Jeremaịa 16:14, 15.
9. N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka Jehova si jikọta ọrụ mgbapụta ya na aha ya?
9 Site n’ichetara ndị ya na a kpọkwasịrị ha aha ya, Jehova kwupụtaghachiri nkwa o kwere ịgbapụta Israel. (Aịsaịa 54:5, 6) Ọzọkwa, Jehova jikọtara aha ya na nkwa ya maka ntọhapụ. N’ime otú ahụ, o jidere n’aka na ya ga-enweta otuto mgbe okwu amụma ya mezuru. Ọbụnadị onye meriri Babilọn agaghị eru eru inweta nsọpụrụ nke ruuru nanị otu Chineke ahụ dị ndụ.
Chi Dị Iche Iche Abaa n’Ikpe
10. Olee ihe ịma aka Jehova chere n’ihu mba dị iche iche na chi ha?
10 Ugbu a Jehova mere ka nkwa o kwere ime ka Israel nwere onwe ya bụrụ ihe ndabere maka okwu ikpe metụtara eluigwe na ụwa bụ́ nke ọ nọ na ya mee ka chi nke mba dị iche iche baa n’ikpe. Anyị na-agụ, sị: “A chịkọtawo mba nile n’otu, kpọkọtakwa ndị nile dị iche iche: ònye n’etiti [chi] ha ga-egosi nke a, mee ka anyị nụrụ ihe mbụ nile? Ka ha [chi ha] wepụta ndị àmà ha, ka e wee gụọ ha ná ndị ezi omume: ma ọ bụ ka ha nụrụ, sị, Eziokwu.” (Aịsaịa 43:9) Jehova na-eche nnukwute ihe ịma aka n’ihu mba dị iche iche nke ụwa. Ihe okwu ya pụtara bụ: ‘Ka chi unu gosi na ha bụ chi site n’ikwu n’ụzọ ziri ezi ihe ga-eme n’ọdịnihu.’ Ebe ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ pụrụ ibu amụma n’ehieghị ụzọ, ule a ga-ekpughe ndị nile na-azọrọ ihe ha na-abụghị. (Aịsaịa 48:5) Ma Onye Pụrụ Ime Ihe Nile gbakwụnyekwara ihe ọzọ a chọrọ n’ụzọ iwu: Ndị nile na-azọrọ na ha bụ ezi chi aghaghị iwepụta ndị àmà, ma ndị àmà nke amụma ha ma nke mmezu nke amụma ndị a. Dị ka o kwesịrị ịdị, Jehova adịghị agụpụ onwe ya n’ihe a a chọrọ n’ụzọ iwu.
11. Ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyere ohu ya, gịnịkwa ka Jehova kpughere banyere ịbụ Chineke ya?
11 N’ịbụ ndị na-adịghị ike, chi ụgha dị iche iche apụghị iwepụta ndị àmà ọ bụla. N’ihi ya, n’ụzọ na-emenye ihere, ebe ndị akaebe na-eguzo tọgbọrọ chakoo. Ma oge eruwo ugbu a ka Jehova nwapụta ịbụ Chineke ya. N’ilega anya n’ebe ndị ya nọ, ọ na-ekwu, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, . . . na ohu m nke M họpụtara: ka unu wee mara, kwere m, ghọta na Mụ onwe m bụ Onye ahụ: ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ bụghị nanị m. Mụ onwe m egosiwo, zọpụtakwa, meekwa ka a nụrụ, ọ dịghịkwa chi ala ọzọ dị n’etiti unu: unu onwe unu bụkwa ndị àmà m, . . . Mụ onwe m bụkwa Chineke. Ọzọ, site n’ụbọchị taa Mụ onwe m bụ Ya; ọ dịghịkwa onye na-anapụta n’aka m: ana m arụ ọrụ, ònye ga-emekwa ka [aka m] laghachi azụ?”—Aịsaịa 43:10-13.
12, 13. (a) Ọtụtụ ihe akaebe ndị dị aṅaa ka ndị Jehova nwere igosi? (b) Olee otú aha Jehova siworo pụta ìhè n’oge a?
12 N’ịzaghachi ihe Jehova kwuru, n’oge na-adịghị anya ebe ndị akaebe na-eguzo jupụtara n’ìgwè ndị àmà na-aṅụrị ọṅụ. Akaebe ha doro anya ma bụrụ nke na-enweghị mgbagha. Dị ka Joshua, ha na-agba àmà na ‘ihe nile Jehova kwuru emezuwo. Ọ dịghị otu okwu nke dapụrụ.’ (Joshua 23:14) Ndị Jehova ka na-echeta ihe Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel na ndị amụma ndị ọzọ kwuru, bụ́ ndị dị ka ha ji otu olu, buru amụma banyere Juda ije biri n’ala ọzọ na mgbapụta ọrụ ebube a ga-agbapụta ha site n’ala ọzọ. (Jeremaịa 25:11, 12) A kpọrọ ọbụna onye ga-agbapụta Juda, bụ́ Saịrọs, aha ogologo oge ọbụna tupu a mụọ ya!—Aịsaịa 44:26–45:1.
13 N’ihi oké ihe àmà a, ònye pụrụ ịgbagha ya na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ? N’adịghị ka chi dị iche iche nke ndị na-ekpere arụsị, ọ bụ nanị Jehova ka a na-ekeghị eke; nanị ya bụ ezi Chineke ahụ.a N’ihi ya, ndị na-aza aha Jehova nwere ihe ùgwù pụrụ iche ma na-enye obi ụtọ nke ịkọrọ ọgbọ ndị dị n’ihu na ndị ọzọ na-ajụ ajụjụ banyere ya, oké ọrụ ya nile. (Abụ Ọma 78:5-7) N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndịàmà Jehova nke oge a nwere ihe ùgwù nke ịkpọsa aha Jehova n’ụwa nile. N’afọ ndị 1920, Ndị Mmụta Bible matawanyere ihe dị ukwuu aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara. Mgbe o ruziri na July 26, 1931, n’otu mgbakọ e nwere na Columbus, Ohio, onyeisi oche Society, bụ́ Joseph F. Rutherford, gụpụtara mkpebi a kpọrọ “Aha Ọhụrụ.” Okwu bụ́ “Anyị chọrọ ka a mara anyị dị ka ma na-akpọ anyị aha, bụ́ ndịàmà Jehova,” tọrọ ndị bịara mgbakọ ahụ ụtọ, bụ́ ndị ji “Ee!” dara ụda kwado mkpebi ahụ. Kemgbe ahụ, a matawo aha Jehova n’ụwa nile.—Abụ Ọma 83:18.
14. Gịnị ka Jehova chetaara ndị Israel, n’ihi gịnịkwa ka ihe ncheta a ji bịa n’ezi oge?
14 Jehova na-elekọta ndị ji nsọpụrụ na-aza aha ya, na-ewere ha dị ka “nwantanta anya Ya.” Ọ na-echetara ndị Israel nke a, na-agwa ha otú o si gbapụta ha n’Ijipt ma duru ha gafere ọzara n’enweghị nsogbu ọ bụla. (Deuterọnọmi 32:10, 12) N’oge ahụ o nweghị chi ala ọzọ dị n’etiti ha, n’ihi na ha ji anya ha hụ mweda n’ala e wedara chi nile nke Ijipt kpam kpam. Ee, chi nile nke Ijipt apụghị ichebe Ijipt ma ọ bụkwanụ gbochie ọpụpụ nke ndị Israel. (Ọpụpụ 12:12) N’otu aka ahụ, Babilọn dị ike, nke obodo ya ndị mepere emepe nwere ma ọ dịkarịa ala, ụlọ nsọ 50 e wuuru chi ụgha dị iche iche, agaghị enwe ike igbochi aka nke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile mgbe ọ ga-eme ka ndị ya nwere onwe ha. N’ụzọ doro anya, “ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị” ma e wezụga Jehova.
Ịnyịnya Agha Adaa, Ụlọ Mkpọrọ Emepee
15. Gịnị ka Jehova buru n’amụma banyere Babilọn?
15 “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ onye mgbapụta unu na Onye Nsọ nke Israel: n’ihi unu ka M zigaworo ozi na Babilọn, M ga-emekwa ka ha rịdaa dị ka ndị ọsọ, ha nile, ọbụna ndị Kaldea, n’ụgbọ nile nke iti mkpu ọṅụ ha. Mụ onwe m bụ Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye keworo Israel, na Eze unu. Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye ahụ Nke na-akwa ụzọ n’oké osimiri na okporo ụzọ n’ime mmiri dị ike; nke na-eme ka ụgbọala na ịnyịnya na usuu ndị agha na dimkpa pụta; n’otu ka ha na-edinakọta, ha agaghị ebili; ha anyụwo anyụ, dị ka ogho oriọna ka e menyụworo ha emenyụ.”—Aịsaịa 43:14-17.
16. Gịnị ga-adakwasị Babilọn, ndị ahịa Kaldea, na ndị ọ bụla gaara echebe Babilọn?
16 Babilọn yiri ụlọ mkpọrọ nye ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ n’ihi na o gbochiri ha ịlaghachi na Jerusalem. Ma ihe nchebe Babilọn abụghị ihe mgbochi nye Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Onye, tupu mgbe ahụ, kwara “ụzọ [n’Oké Osimiri Uhie] na okporo ụzọ n’ime mmiri dị ike”—nke yiri ka ọ bụ Jọdan. (Ọpụpụ 14:16; Joshua 3:13) N’otu aka ahụ, onye ọrụ Jehova, bụ́ Saịrọs, ga-eme ka nnukwute Yufretis ahụ talata, na-enye ndị agha ya ohere ịbanye n’obodo ahụ. Ndị ahịa nke Kaldea bụ́ ndị na-esi n’ọwa mmiri Babilọn na-aga—ụzọ mmiri nke ọtụtụ puku ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa na nnukwute ụgbọ mmiri ndị na-ebu chi dị iche iche nke Babilọn na-esi agafe—ga-eru újú mgbe isi obodo ha dị ike dara. Dị ka ụgbọ ịnyịnya Fero n’ime Oké Osimiri Uhie, ụgbọ ịnyịnya na-awụ ọsọ nke Babilọn agaghị emeli ihe ọ bụla. Ha agaghị azọpụta ya. Dị ka mmadụ si emenyụ ọkụ ogho oriọna n’ụzọ dị mfe, onye mwakpo ahụ ga-egbu ndị ọ bụla gaara echebe ya.
Jehova Edulaa Ndị Ya n’Enweghị Nsogbu
17, 18. (a) Olee “ihe ọhụrụ” Jehova buru n’amụma? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ahụ na-agaghị esi cheta ihe mbụ, n’ihi gịnịkwa?
17 N’iji ọrụ mgbapụta ndị ọ rụrụ na mbụ atụnyere ihe ọ na-aga ime, Jehova na-ekwu, sị: “Unu echetala ihe mbụ nile, unu atụgharịkwala ihe nile nke mgbe ochie n’obi. Lee, ana m eme ihe ọhụrụ; ugbu a ka ọ ga-epu; ùnu agaghị ama ya? ee, M ga-eme ka ụzọ dị n’ọzara, meekwa ka osimiri dị iche iche dị n’ala tọgbọrọ n’efu. Anụ ọhịa ga-asọpụrụ m, bụ́ nkịta ọhịa na enyí nnụnụ: n’ihi na enyewo m mmiri n’ọzara na osimiri dị iche iche n’ala tọgbọrọ n’efu, ime ka ndị m ṅụọ, bụ́ ndị M họpụtara: ndị M kpụworo nye Onwe m, akụkọ otuto m ka ha ga-akọ.”—Aịsaịa 43:18-21.
18 N’ikwu sị, “unu echetala ihe mbụ nile,” Jehova adịghị ekwu ka ndị ohu ya chefuo ọrụ nzọpụta ndị ọ rụrụ n’oge ndị gara aga. N’ezie, ọtụtụ n’ime ọrụ ndị a so n’akụkọ ihe mere eme nke Israel, bụ́ nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, Jehova nyekwara iwu ka a na-echeta kwa afọ, n’oge Ememe Ngabiga, mgbapụ ahụ ha si n’Ijipt gbapụ. (Levitikọs 23:5; Deuterọnọmi 16:1-4) Otú ọ dị, ugbu a, Jehova chọrọ ka ndị ya na-eto ya n’ihi “ihe ọhụrụ”—ihe ha ga-ahụ n’onwe ha. Nke a na-agụnye ọ bụghị nanị mgbapụta a ga-agbapụta ha site na Babilọn kama ụla ha n’ụzọ ọrụ ebube, ikekwe na-esi n’ụzọ ahụ ka mkpụmkpụ nke si n’ọzara gafere. N’ala ahụ nke na-adịghị emepụta ihe, Jehova ga-akwara ha “ụzọ,” ọ ga-arụkwa ọrụ ndị dị ike ga-eme ka e cheta ihe o meere ndị Israel n’oge Mosis—n’ezie, ọ ga-enye ndị ahụ na-alaghachinụ ihe oriri n’ọzara, jirikwa osimiri n’ezie mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ ha. Ndokwa Jehova ga-aba nnọọ ụba nke na ọbụna anụ ọhịa ga-eto Chineke ma ghara ịwakpo ndị ahụ.
19. Olee otú ihe ahụ fọdụrụ n’Israel ime mmụọ na ndị enyi ha si eje ije ‘n’Ụzọ nke ịdị nsọ’?
19 N’otu aka ahụ, na 1919, a tọhapụrụ ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ n’ojiji e ji ha na Babilọn, ha malitekwara ịga ije n’okporo ụzọ Jehova kwadebeere ha, “Ụzọ nke ịdị nsọ.” (Aịsaịa 35:8) N’adịghị ka ndị Israel, ọ dịghị mkpa na ha ga-agafe ọzara na-ere ọkụ site n’otu ebe gaa n’ọzọ, njem ha agwụsịghịkwa n’ime ọnwa ole na ole mgbe ha bịarutere Jerusalem. Otú ọ dị, “Ụzọ nke ịdị nsọ” ahụ duuru ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ banye na paradaịs ime mmụọ. Na nke ha, ha na-anọgide ‘n’Ụzọ ahụ nke ịdị nsọ,’ ebe ha ka ga-eme njem gafere usoro ihe a. Ọ bụrụhaala na ha anọgide n’ụzọ ahụ—ọ bụrụhaala na ha anọgide na-edebe ụkpụrụ ịdị ọcha na nke ịdị nsọ nke Chineke—ha ga-anọgide na paradaịs ime mmụọ ahụ. Leekwa ihe ọṅụ ọ bụụrụ ha ịbụ ndị oké ìgwè ndị enyi “na-abụghị ndị Israel” sonyeere! N’ụzọ dị nnọọ iche ná ndị na-elekwasị anya n’usoro ihe Setan, ma ihe ahụ fọdụrụnụ ma ndị enyi ha nọgidere na-anụ ụtọ oké oriri ime mmụọ nke Jehova na-akpọ. (Aịsaịa 25:6; 65:13, 14) N’ịhụ ngọzi Jehova na-agọzi ndị ya, ọtụtụ ndị yiri anụ ọhịa agbanwewo ụzọ ha ma too ezi Chineke ahụ.—Aịsaịa 11:6-9.
Jehova Ekpughee Mwute Ya
20. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Israel nke oge Aịsaịa siworo mechuo Jehova ihu?
20 N’oge ochie, ihe ahụ fọdụrụ n’Israel, bụ́ ndị e weghachiri eweghachi, bụ ndị mere mgbanwe ma e jiri ha tụnyere ọgbọ ajọ omume nke oge Aịsaịa. Banyere ndị nke ikpeazụ a, Jehova na-ekwu, sị: “Ọ bụghị Mụ ka ị kpọkuworo, Jekọb; kama ike m agwụwo gị, Israel. Ị kpụghị atụrụ nke àjà nsure ọkụ gị nile bịakwute m; i jighịkwa àjà gị nile sọpụrụ m. Ejighị m onyinye ịnata ihu ọma mee ka i fee ofufe, ejighịkwa m frankincense mee ka ike gwụ gị. I jighị ego zụtara m ụdà calamus, i jighịkwa abụba nke àjà gị nile mee ka afọ jubiga m ókè: kama i jiwo mmehie gị nile mee ka M fee ofufe, i jiwo ajọ omume gị nile mee ka ike gwụ m.”—Aịsaịa 43:22-24.
21, 22. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ihe Jehova chọrọ abụghị ibu arọ? (b) Olee otú ndị ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, si eme ka Jehova jeere ha ozi?
21 N’ikwu sị, “Ejighị m onyinye ịnata ihu ọma mee ka i fee ofufe, ejighịkwa m frankincense mee ka ike gwụ gị,” Jehova adịghị ekwu na a chọghị àjà na frankincense (nke so n’ihe e ji eme ihe nsure ọkụ dị nsọ na-esi ísì ụtọ). N’ezie, ihe ndị a bụ ihe ndị dị mkpa n’ezi ofufe n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa “calamus” na-esi ísì ụtọ, bụ́ ihe na-esi ísì ụtọ nke so n’ihe ndị e ji eme mmanụ otite dị nsọ. Ndị Israel anọwo na-eleghara iji ihe ndị a eme ihe n’ụlọukwu ahụ anya. Ma ihe ndị dị otú ahụ a chọrọ hà bụ ibu arọ? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe Jehova chọrọ dị mfe ma e jiri ha tụnyere ndị nke chi ụgha dị iche iche na-achọ. Dị ka ihe atụ, chi ụgha bụ́ Mọlek na-achọ iji ụmụaka achụ àjà—ihe Jehova na-achọtụbeghị!—Deuterọnọmi 30:11; Maịka 6:3, 4, 8.
22 A sị nnọọ na ndị Israel nwere nghọta ime mmụọ, mgbe ahụ ‘ike Jehova agaraghị agwụ ha’ ma ọlị. Site n’inyoba anya n’Iwu ya, ha ga-ahụ ịhụnanya dị omimi o nwere n’ebe ha nọ ma jiri ọṅụ nye ya “abụba,” bụ́ akụkụ kasị mma nke àjà ha. Kama nke ahụ, ha ji anyaukwu na-edebere onwe ha abụba ahụ. (Levitikọs 3:9-11, 16) Lee ka mba ajọ omume a si eji oké mmehie ha akpasu Jehova iwe—ya bụ, na-eme ka o jeere ha ozi!—Nehemaịa 9:28-30.
Ịdọ Aka ná Ntị Amịpụta Mkpụrụ
23. (a) N’ihi gịnị ka ịdọ aka ná ntị Jehova ji bụrụ nnọọ ihe kwesịrị ha? (b) Gịnị ka ịdọ aka ná ntị Chineke dọrọ Israel gụnyere?
23 Ọ bụ ezie na o siri ike, ọ bụkwa ihe kwesịrị ha, ịdọ aka ná ntị Jehova rụpụtara ihe ndị a chọrọ, na-eme ka o kwe mee imere ha ebere. “Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Onye ahụ Nke na-echichapụ njehie gị nile n’ihi Mụ onwe m; M gaghị echetakwa mmehie gị nile. Chetara m; ka anyị kpekọọ ikpe: gị onwe gị kọọ akụkọ gị, ka e wee gụọ gị n’onye ezi omume. Nna gị mbụ mehiere, ndị nsụgharị gị [“ndị na-ekwuchitere gị,” NW] ejehiewokwa megide m. M ga-emekwa ndị isi [nke ebe nsọ, NW] ka ha ghara ịdị nsọ, nyekwa Jekọb ka ọ bụrụ ihe e wezụgara ka e bibie ya, nyekwa Israel ka ọ bụrụ ihe nkwulu.” (Aịsaịa 43:25-28) Dị ka mba nile nke ụwa, Israel si n’eriri Adam, bụ́ onye “mbụ.” N’ihi ya, ọ dịghị onye Israel pụrụ ikwu na ya bụ ‘onye ezi omume.’ Ọbụna “ndị na-ekwuchitere” Israel—ndị nkụzi ya, ma ọ bụ ndị nkọwa, nke Iwu ahụ—emehiewo megide Jehova ma kụzie okwu ụgha. N’aka nke ya, Jehova ga-enyefe mba ya ka “e bibie ya” nakwa “ka ọ bụrụ ihe nkwulu.” Ọ ga-emekwa ka ndị nile na-eje ozi ‘n’ebe nsọ’ ya, ghara ịdị nsọ.
24. N’ihi ihe dị aṅaa bụ́ isi ka Jehova ga-eji gbaghara ndị ya—ma ndị nke oge ochie ma ndị nke oge a—ma, gịnị bụ mmetụta ya n’ebe ha nọ?
24 Otú ọ dị, rịba ama na ebere Chineke nke ọ ga-arụpụta agaghị abụ nanị n’ihi nchegharị nke Israel; ọ ga-abụ n’ihi Jehova. Ee, o metụtara aha ya. Ọ bụrụ na ọ gbahapụ Israel n’ala ọzọ ruo mgbe ebighị ebi, ndị na-ahụ ihe na-emenụ ga-akọcha aha ya. (Abụ Ọma 79:9; Ezikiel 20:8-10) N’otu aka ahụ taa, nzọpụta nke ụmụ mmadụ adịrughị mkpa ka ido aha Jehova nsọ na iwepụ ọbụbụeze ya n’ụta. Ka o sina dị, Jehova hụrụ ndị ji obi ha nile anakwere ịdọ aka ná ntị ya nakwa ndị na-efe ya n’ime mmụọ na eziokwu, n’anya. Ọ na-egosipụta ịhụnanya ya n’ebe ndị a nọ—ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma hà bụ atụrụ ọzọ—site n’ihichapụ mmehie ha na-adabere n’àjà Jisọs Kraịst.—Jọn 3:16; 4:23, 24.
25. Olee ihe ndị dị egwu Jehova ga-eme n’ọdịnihu dị nso, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị ugbu a?
25 Ọzọkwa, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe oké ìgwè mmadụ nke ndị ji iguzosi ike n’ihe na-efe ya ofufe nọ mgbe o mere ihe ọhụrụ n’ihi ha site n’ịgbapụta ha ‘n’oké mkpagbu ahụ’ baa n’ime “ụwa ọhụrụ” e mere ka ọ dị ọcha. (Mkpughe 7:14; 2 Pita 3:13) Ha ga-ahụ ngosipụta kasị egwu nke ike Jehova nke ụmụ mmadụ hụtụworo. Atụmanya e ji n’aka nke ihe omume ahụ na-eme ka ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị nile ga-emejupụta oké ìgwè mmadụ ahụ na-aṅụrị ọṅụ ma na-ebi ndụ kwa ụbọchị n’ụzọ kwekọrọ n’oké ọrụ ahụ e nyere ha: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m”!—Aịsaịa 43:10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke mba dị iche iche, a “na-amụ” ọtụtụ chi amụ, ha na-amụkwa “ụmụ.”
[Foto dị na peeji nke 48, 49]
Jehova ga-enyere ndị Juu ahụ aka n’ụzọ ụla gaa Jerusalem
[Foto ndị dị na peeji nke 52]
Jehova na-ama mba dị iche iche aka iwepụta ndị àmà maka chi ha dị iche iche
1. Ihe oyiyi Beal nke e ji ọla nchara kpụọ 2. Ihe oyiyi Ashtọret ndị e ji ụrọ kpụọ 3. Chi atọ n’ime otu nke Ijipt bụ́ Horus, Osiris na Isis 4. Chi ndị Gris bụ́ Athena (n’aka ekpe) na Aphrodite
[Foto ndị dị na peeji nke 58]
“Unu onwe unu bụ ndị àmà m.”—Aịsaịa 43:10