Abụ ọma Devid.
א [Alef]
25 Jehova, ọ bụ gị ka m na-enye mkpụrụ obi m.+
ב [Bet]
2 Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi;+
Ekwela ka ihere mee m.
Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
ג [Gimel]
3 Ọ dịghịkwa onye nwere olileanya n’ebe ị nọ ihere ga-eme.+
Ihere ga-eme ndị na-aghọ aghụghọ n’efu.+
ד [Dalet]
4 Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị;+
Zi m ụzọ gị.+
ה [Hee]
5 Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe,+
N’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m.+
ו [Wọọ]
Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.+
ז [Zayin]
6 Jehova, biko, cheta ebere gị+ na obiọma gị,+
N’ihi na ha dị malite na mgbe ebighị ebi.+
ח [Het]
7 Biko, echetala mmehie m mere n’oge m bụ nwata nakwa nnupụisi m.+
Cheta m dị ka obiọma gị si dị,+
N’ihi ịdị mma gị, Jehova.+
ט [Tet]
8 Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume.+
Ọ bụ ya mere o ji ezi ndị mmehie ụzọ.+
י [Yod]
9 Ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi na-eje ije ná mkpebi ikpe ya,+
Ọ ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.+
כ [Kaf]
10 Ụzọ Jehova niile bụ obiọma na eziokwu
Nye ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ya+ na ihe ncheta ya.+
ל [Lamed]
11 N’ihi aha gị, Jehova,+
Biko, gbaghara njehie m, n’ihi na ọ dị ukwuu.+
מ [Mem]
12 Olee onye na-atụ egwu Jehova?+
Ọ ga-ezi ya ụzọ ọ ga-ahọrọ.+
נ [Nun]
13 Mkpụrụ obi ya ga-ebi n’ịdị mma,+
Ụmụ ya ga-enweta ụwa.+
ס [Samek]
14 Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya,+
Ọ bụkwa ya na ha na-agba ndụ, iji mee ka ha mara ọgbụgba ndụ ya.+
ע [Ayin]
15 Anya m dị n’ebe Jehova nọ mgbe niile,+
N’ihi na ọ bụ ya na-adọpụta ụkwụ m n’ụgbụ.+
פ [Pee]
16 Chee ihu n’ebe m nọ, meere m amara;+
N’ihi na anọ m naanị m, anọkwa m n’ahụhụ.+
צ [Sadee]
17 Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ;+
Mee ka m si ná nsogbu m nọ na ya pụta.+
ר [Resh]
18 Hụrụ ahụhụ m na nsogbu m,+
Gbagharakwa m mmehie m niile.+
19 Lee ka ndị iro m si dị ọtụtụ,+
Ha kpọkwara m asị nke ukwuu.+
ש [Shin]
20 Chee mkpụrụ obi m nche ma napụta m.+
Ekwela ka ihere mee m, n’ihi na agbabawo m n’ime gị.+
ת [Tọọ]
21 Ka iguzosi ike n’ezi ihe na ezi omume chebe m,+
N’ihi na enwere m olileanya n’ebe ị nọ.+
22 Chineke, biko, napụta Izrel n’ahụhụ ya niile.+