Ilu
9 Ezi amamihe+ ewuwo ụlọ ya;+ ọ wapụtawo ogidi asaa ya. 2 Ọ haziwo ogbugbu anụ ya; ọ gwawo mmanya ya agwa; o dowokwa tebụl ya n’usoro.+ 3 O zipụwo ndị inyom na-ejere ya ozi, ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu nke obodo kpọọ òkù, sị: 4 “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”+ Ọ gwawo onye ọ bụla nke na-enweghị uche,+ sị: 5 “Bịa rie nri m, sorokwa m ṅụọ mmanya m gwara agwa.+ 6 Hapụ ndị na-amaghị ihe ka i wee dịrị ndụ,+ na-eje ije n’ụzọ nghọta.”+
7 Onye ọ bụla nke na-agbazi onye na-akwa emo na-akparị onwe ya,+ onye ọ bụla nke na-abara onye ajọ omume mba—ọ bụụrụ ya ihe ihere.+ 8 Abarala onye na-akwa emo mba, ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+ Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+ 9 Kụziere onye maara ihe ihe, ọ ga-amakwa ihe karị.+ Nye onye ezi omume ihe ọmụma, ọ ga-atụkwasị ihe n’ihe ọ mụtara.
10 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite amamihe,+ ịmara Onye Kasị Nsọ ka nghọta bụkwa.+ 11 N’ihi na ọ bụ m ga-eme ka ụbọchị gị dị ọtụtụ,+ a ga-atụkwasịkwara gị ọtụtụ afọ ndụ.+ 12 Ọ bụrụ na ị maara ihe, ọ bụ onwe gị ka ị maara ya;+ ọ bụrụkwa na ị kwawo emo, ị ga-eburu ya, naanị gị.+
13 Nwaanyị nzuzu na-eme mkpọtụ.+ O nweghị uche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla.+ 14 Ọ nọrọwo ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ya, n’oche, n’ebe ndị dị elu nke obodo,+ 15 ịkpọ ndị na-agafe n’ụzọ òkù, bụ́ ndị na-aga n’ihu n’ihu n’ụzọ ha,+ sị: 16 “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”+ Ọ gwawokwa onye ọ bụla na-enweghị uche,+ sị: 17 “Mmiri e zutere ezute na-atọ ụtọ,+ achịcha a na-ata na nzuzo na-adị ụtọ.”+ 18 Ma ọ maghị na ndị na-adịghị ndụ nọ n’ebe ahụ, na ndị ọ kpọbatara nọkwa n’ime ime Shiol.+