Jenesis
5 Ihe a bụ akwụkwọ kọrọ akụkọ Adam. N’ụbọchị Chineke kere Adam, o kere ya ka ọ dị ka ya.+ 2 Chineke kere ha nwoke na nwaanyị.+ N’ụbọchị o kere ha,+ ọ gọziri ha ma kpọọ ha Mmadụ.*
3 Adam nọrọ ndụ otu narị afọ na iri atọ (130), o wee mụọ nwa nwoke yiri ya, onye dị ka ya. Ọ gụrụ ya Set.+ 4 Mgbe Adam mụchara Set, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 5 Ụbọchị niile Adam dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri atọ (930), o wee nwụọ.+
6 Set nọrọ ndụ otu narị afọ na ise (105), o wee mụọ Ịnọsh.+ 7 Mgbe Set mụchara Ịnọsh, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na asaa (807). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 8 Ụbọchị niile Set dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri na abụọ (912), o wee nwụọ.
9 Ịnọsh nọrọ ndụ afọ iri itoolu, o wee mụọ Kinan. 10 Mgbe Ịnọsh mụchara Kinan, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri na ise (815). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 11 Ụbọchị niile Ịnọsh dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na ise (905), o wee nwụọ.
12 Kinan nọrọ ndụ afọ iri asaa, o wee mụọ Mahalalel.+ 13 Mgbe Kinan mụchara Mahalalel, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri anọ (840). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 14 Ụbọchị niile Kinan dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri (910), o wee nwụọ.
15 Mahalalel nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Jered.+ 16 Mgbe Mahalalel mụchara Jered, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ na iri atọ (830). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 17 Ụbọchị niile Mahalalel dịrị ndụ bụ narị afọ asatọ na iri itoolu na ise (895), o wee nwụọ.
18 Jered nọrọ ndụ otu narị afọ na iri isii na abụọ (162), o wee mụọ Ịnọk.+ 19 Mgbe Jered mụchara Ịnọk, ọ nọrọ ndụ narị afọ asatọ (800). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 20 Ụbọchị niile Jered dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na abụọ (962), o wee nwụọ.
21 Ịnọk nọrọ ndụ afọ iri isii na ise, o wee mụọ Metusela.+ 22 Mgbe Ịnọk mụchara Metusela, o so ezi Chineke* na-eje ije ruo narị afọ atọ (300). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 23 Ụbọchị niile Ịnọk dịrị ndụ bụ narị afọ atọ na iri isii na ise (365). 24 Ịnọk so ezi Chineke na-eje ije.+ E mechaa, a hụghịzi ya, n’ihi na Chineke kpọpụrụ ya.+
25 Metusela nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na asaa (187), o wee mụọ Lemek.+ 26 Mgbe Metusela mụchara Lemek, ọ nọrọ ndụ narị afọ asaa na iri asatọ na abụọ (782). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 27 Ụbọchị niile Metusela dịrị ndụ bụ narị afọ itoolu na iri isii na itoolu (969), o wee nwụọ.
28 Lemek nọrọ ndụ otu narị afọ na iri asatọ na abụọ (182), o wee mụọ nwa nwoke. 29 Ọ gụrụ ya Noa,*+ sị: “Onye a ga-eme ka anyị zuo ike* n’ọrụ ike anyị na-arụ nakwa n’ọrụ anyị na-arụgbu onwe anyị maka na Jehova bụrụ ala ọnụ.”+ 30 Mgbe Lemek mụchara Noa, ọ nọrọ ndụ narị afọ ise na iri itoolu na ise (595). Ọ mụrụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. 31 Ụbọchị niile Lemek dịrị ndụ bụ narị afọ asaa na iri asaa na asaa (777), o wee nwụọ.
32 Mgbe Noa ruru narị afọ ise (500), ọ malitere ịmụ ụmụ. Aha ha bụ Shem,+ Ham,+ na Jefet.+