Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Eze 16
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ

      • Jehova kwuru ihe ga-eme Beasha (1-7)

      • Ịla malitere ịchị Izrel (8-14)

      • Zimraị malitere ịchị Izrel (15-20)

      • Ọmraị malitere ịchị Izrel (21-28)

      • Ehab malitere ịchị Izrel (29-33)

      • Hayel rụsiri Jeriko ike (34)

1 Ndị Eze 16:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 19:2; 20:34
  • +2Ih 16:7

1 Ndị Eze 16:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Sa 2:8
  • +1Ez 13:33

1 Ndị Eze 16:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 14:10, 11; 15:29

1 Ndị Eze 16:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:21, 33

1 Ndị Eze 16:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, nwa Jeroboam.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:25-29

1 Ndị Eze 16:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 9:31

1 Ndị Eze 16:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, nwoke ọ bụla, bụ́ onye ikwu Beasha, nke kwesịrị ịbọrọ ya ọbọ.

1 Ndị Eze 16:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:1-3

1 Ndị Eze 16:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 32:21; 1Sa 12:21; 2Ez 17:15; Aịz 41:29

1 Ndị Eze 16:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 19:44, 48; 21:20, 23; 1Ez 15:27

1 Ndị Eze 16:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 8:26; Maị 6:16

1 Ndị Eze 16:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ikp 9:53, 54; 1Sa 31:4; 2Sa 17:23

1 Ndị Eze 16:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 14:7, 9

1 Ndị Eze 16:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

  • *

    Sameria pụtara “Nke Ndị Agbụrụ Shima.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 20:1; 2Ez 17:24; Em 6:1; Ọrụ 8:5

1 Ndị Eze 16:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Maị 6:16

1 Ndị Eze 16:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 13:33

1 Ndị Eze 16:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:33; 21:4, 20-22; 2Ez 10:1

1 Ndị Eze 16:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:23, 24; Aịz 7:9

1 Ndị Eze 16:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 16:25; 21:25; 2Ez 3:1, 2

1 Ndị Eze 16:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30
  • +1Ez 18:4, 19; 21:7; 2Ez 9:30; Mkp 2:20
  • +Je 10:15
  • +Ikp 2:11; 10:6; 2Ez 10:19; 17:16

1 Ndị Eze 16:32

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’ụlọ arụsị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 10:21, 27

1 Ndị Eze 16:33

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 34:13; 2Ez 10:26, 28; 13:6

1 Ndị Eze 16:34

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 6:26

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/1998, p. 21-22

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Eze 16:12Ih 19:2; 20:34
1 Eze 16:12Ih 16:7
1 Eze 16:21Sa 2:8
1 Eze 16:21Ez 13:33
1 Eze 16:31Ez 14:10, 11; 15:29
1 Eze 16:61Ez 15:21, 33
1 Eze 16:71Ez 15:25-29
1 Eze 16:102Ez 9:31
1 Eze 16:121Ez 16:1-3
1 Eze 16:13Di 32:21; 1Sa 12:21; 2Ez 17:15; Aịz 41:29
1 Eze 16:15Jos 19:44, 48; 21:20, 23; 1Ez 15:27
1 Eze 16:162Ez 8:26; Maị 6:16
1 Eze 16:18Ikp 9:53, 54; 1Sa 31:4; 2Sa 17:23
1 Eze 16:191Ez 12:28-30; 14:7, 9
1 Eze 16:241Ez 20:1; 2Ez 17:24; Em 6:1; Ọrụ 8:5
1 Eze 16:25Maị 6:16
1 Eze 16:261Ez 12:28-30; 13:33
1 Eze 16:281Ez 16:33; 21:4, 20-22; 2Ez 10:1
1 Eze 16:291Ez 16:23, 24; Aịz 7:9
1 Eze 16:301Ez 16:25; 21:25; 2Ez 3:1, 2
1 Eze 16:311Ez 12:28-30
1 Eze 16:311Ez 18:4, 19; 21:7; 2Ez 9:30; Mkp 2:20
1 Eze 16:31Je 10:15
1 Eze 16:31Ikp 2:11; 10:6; 2Ez 10:19; 17:16
1 Eze 16:322Ez 10:21, 27
1 Eze 16:33Ọp 34:13; 2Ez 10:26, 28; 13:6
1 Eze 16:34Jos 6:26
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Eze 16:1-34

Ndị Eze nke Mbụ

16 Jehova si n’ọnụ Jihu+ nwa Hanenaị+ kwuo ihe ga-eme Beasha. O kwuru, sị: 2 “M si n’ájá kpọlite gị ma mee gị onye ndú ndị Izrel bụ́ ndị m.+ Ma i bidoro na-akpa àgwà ka Jeroboam, meekwa ka ndị Izrel bụ́ ndị m mehie, mmehie ha akpasuokwa m iwe.+ 3 N’ihi ya, m ga-ebibi Beasha na ezinụlọ ya, m ga-emekwa ka ezinụlọ ya dịrị ka ezinụlọ Jeroboam+ nwa Nibat. 4 Onye ezinụlọ Beasha ọ bụla nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ozu ya. Onye nke nwụrụ n’ọhịa, nnụnụ ga-eri ozu ya.”

5 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Beasha, ihe ndị o mere, na ike ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 6 N’ikpeazụ, Beasha nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya na Teza,+ Ịla nwa ya nọchikwara ya, malite ịchị. 7 Jehova sikwa n’ọnụ Jihu onye amụma, nwa Hanenaị, kwuo ihe ga-eme Beasha na ezinụlọ ya. Ihe mere Jehova ji kwuo ihe a bụ n’ihi ihe ọjọọ niile o mere, nke kpasuru ya iwe, otú ndị ezinụlọ Jeroboam mere, nakwa n’ihi na o gburu Nedab.*+

8 N’afọ nke iri abụọ na isii n’ọchịchị Esa eze Juda, Ịla nwa Beasha malitere ịchị Izrel. Ọ nọ na Teza chịa afọ abụọ. 9 Mgbe ọ nọ na Teza, n’ụlọ Aza, ṅụgide mmanya, ṅụrọọ anya, Zimraị gbaara ya izu. Zimraị a bụ onyeisi ọkara ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya ya, bụrụkwa onye na-ejere ya ozi na onye na-elekọta ezinụlọ ya. 10 Zimraị batara ebe ahụ ọ nọ gbuo ya+ n’afọ nke iri abụọ na asaa n’ọchịchị Esa eze Juda. Ọ nọchikwara ya, malite ịchị. 11 Ozugbo Zimraị nọdụrụ n’ocheeze ya, malite ịchị, o gburu ndị ezinụlọ Beasha niile. O nweghị nwoke ọ bụla ọ hapụrụ ndụ, ma onye ikwu* ya ma enyi ya. 12 Zimraị si otú a laa ndị niile nọ n’ezinụlọ Beasha n’iyi, otú Jehova si n’ọnụ Jihu onye amụma kwuo na a ga-eme Beasha.+ 13 Ihe a merenụ bụ n’ihi mmehie niile Beasha na Ịla nwa ya mere, nakwa n’ihi otú ha si mee ka ndị Izrel mehie, fewe arụsị ndị na-abaghị uru, si otú ahụ kpasuo Jehova bụ́ Chineke Izrel iwe.+ 14 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ịla, na ihe niile o mere, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.

15 N’afọ nke iri abụọ na asaa n’ọchịchị Esa eze Juda, Zimraị bidoro ịchị ma chịa abalị asaa na Teza. N’oge a, ndị agha Izrel mara ụlọikwuu ka ha lụso Gibetọn,+ bụ́ obodo ndị Filistia, agha. 16 Ndị agha ahụ mechara nụ na Zimraị agbaarala eze izu, gbuokwa ya. N’ihi ya, ndị Izrel niile chiri Ọmraị,+ bụ́ onyeisi ndị agha, eze Izrel n’ụbọchị ahụ n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu. 17 Ọmraị na ndị Izrel niile sikwa Gibetọn gaa nọchibido Teza. 18 Mgbe Zimraị hụrụ na ha anọchibidola obodo ahụ, ọ banyere ebe a rụsiri ike n’ụlọ* eze, gbakọta onwe ya na ụlọ ahụ ọkụ.+ 19 Ihe a mere ya maka mmehie ndị o mere. O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, kpaa àgwà ka Jeroboam, meekwa ka ndị Izrel mehie.+ 20 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Zimraị, na izu ọjọọ ọ gbara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel.

21 Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Izrel kere abụọ. Otu ndị nọ na-akwado Tibnaị nwa Gaịnat, na-achọ ichi ya eze, ndị nke ọzọ ana-akwado Ọmraị. 22 Ma ndị na-akwado Ọmraị meriri ndị na-akwado Tibnaị nwa Gaịnat. Tibnai mechakwara nwụọ, Ọmraị amalite ịchị.

23 N’afọ nke iri atọ na otu n’ọchịchị Esa eze Juda, Ọmraị malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na abụọ. Ọ nọ na Teza chịa afọ isii. 24 O ji talent* ọlaọcha abụọ zụrụ ugwu Sameria n’aka Shima, rụọkwa obodo na ya. Ọ gụrụ obodo ahụ ọ rụrụ Sameria.*+ O si n’aha Shima, onye nwebu ugwu ahụ, nweta aha ahụ. 25 Ọmraị nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Ọ ka ndị niile bu ya ụzọ njọ.+ 26 Ọ kpara nnọọ àgwà ka Jeroboam nwa Nibat, onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie, ha efewe arụsị ndị na-abaghị uru, si otú ahụ kpasuo Jehova bụ́ Chineke Izrel iwe.+ 27 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ọmraị, ma ihe o mere ma ike ọ kpara, n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 28 Ọmraị mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya na Sameria. Ehab nwa ya+ anọchie ya, malite ịchị.

29 N’afọ nke iri atọ na asatọ n’ọchịchị Esa eze Juda, Ehab nwa Ọmraị malitere ịchị Izrel. Ehab nwa Ọmraị nọ na Sameria chịa Izrel+ afọ iri abụọ na abụọ. 30 Ehab nwa Ọmraị mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova karịa ndị niile bu ya ụzọ.+ 31 Ọ kpara àgwà ka à ga-asị na mmehie Jeroboam+ nwa Nibat mere enweghị ihe ọ bụ, nke na ọ gara lụọ Jezibel+ nwa Etbel, eze ndị Saịdọn,+ malite ife Bel,+ na-akpọkwara ya isiala. 32 Ọ rụkwara ebe a ga-anọ na-achụrụ Bel àjà n’ụlọ* ọ rụụrụ Bel+ na Sameria. 33 Ehab rụkwara ogwe osisi arụsị.*+ Ihe niile o mere, nke kpasuru Jehova bụ́ Chineke Izrel iwe, karịrị ihe ndị eze niile bu ya ụzọ chịa Izrel mere.

34 N’oge Ehab na-achị, Hayel, onye Betel, rụsiri Jeriko ike. Ịtọ ntọala obodo ahụ tara isi Abaịram bụ́ ọkpara ya, itinye ibo ụzọ ya takwara isi Sigọb bụ́ ọdụdụ nwa ya, otú Jehova si n’ọnụ Joshụa nwa Nọn kwuo.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya