Job
13 “N’eziokwu, anya m ahụla ihe a niile.
Ntị m anụla ya ma ghọta ya.
2 Ama m ihe unu ma.
Unu akaghị m.
3 Ma, ọ ga-akara m mma ka m gwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu.
M chọrọ ịzara ọnụ m n’ihu Chineke.+
4 Ma unu na-aghagide m ụgha.
Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru.+
6 Biko, geenụ ntị n’ihe m na-ekwu,
Ṅaakwanụ ntị n’arịrịọ m na-arịọ.
7 Ùnu ga-ekwu ihe na-ezighị ezi ka unu wee gbachitere Chineke?
Ùnu ga-ekwukwa okwu aghụghọ ka unu wee kwuchitere ya?
Ùnu ga-ekpechitere ezi Chineke ọnụ ya?
9 Ọ bụrụ na o leruo unu anya, ihe ọ ga-ahụ ọ̀ ga-adị ya mma?+
Ùnu ga-aghọ ya aghụghọ otú unu ga-aghọ mmadụ efu aghụghọ?
10 E nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịbara unu mba
Ma ọ bụrụ na unu na-eme ka à ga-asị na unu na-adụnyere ya úkwù.+
11 Ọ̀ bụ na ebube ya agaghị emenye unu ụjọ,
Ụjọ ya ejidekwa unu?
12 Okwu amamihe unu na-ekwu enweghị isi na ọdụ.*
Ihe ndị unu na-ekwu abaghị uru otú ọta e ji ájá kpụọ na-abaghị uru.
13 Gbachienụ nkịtị ka m kwuo okwu.
Ka ihe ọ bụla ga-eme m mee m.
14 Gịnị mere m ji etinye onwe m ná nsogbu,*
Na-emekwa ihe nwere ike ịta isi m?
15 M ga-echere n’agbanyeghị na o nwere ike igbu m.+
M ga-azara ọnụ m n’ihu ya.
17 Geenụ ntị nke ọma n’okwu m.
Tinyekwanụ uche n’ihe m na-ekwu.
18 Lee, akwadebela m ihe m ga-ekwu iji zara ọnụ m.
Ama m na aka m dị ọcha.
19 Ònye ga-agbagha ihe m na-ekwu?
M ga-anwụ ma m gbachi nkịtị.*
22 Kpọọ m ka m za
Ma ọ bụkwanụ ka m kwuo okwu ka ị za m.
23 Olee ihe ọjọọ m mere, oleekwa mmehie m mere?
Mee ka m mara iwu m dara na mmehie m mere.
25 Ị̀ ga-agbalị ka i menye ahịhịa ifufe na-ebugharị ụjọ,
Ka ị̀ ga na-achụ ahịhịa ọka kpọrọ nkụ ọsọ?
26 N’ihi na ị nọ na-ede ihe ndị i ji ebo m ebubo dị iche iche,
Ị na-emekwa ka m taa ahụhụ maka mmehie ndị m mere mgbe m bụ okorobịa.
27 I tinyela ụkwụ m n’ọtọsị.
Ị na-enyocha ụzọ m niile,
Ị na-enyochakwa ebe ọ bụla m zọnyere ụkwụ.