Job
17 “Obi agbawaala m. Anwụọla m anwụọ.
Ili na-echere m.+
3 Biko, kwe m nkwa na ị ga-akwado m.
È nwere onye ọzọ ga-enyere m aka?+
4 N’ihi na i meela ka ha ghara ịna-aghọta ihe.+
Ọ bụ ya mere na ị naghị ebuli ha elu.
5 Ha nwere ike ịgwa ndị enyi ha ka ha na ha kee ihe ndị ha nwere,
Ma agụụ ana-eme ka ụmụ ha ghara ịhụcha ụzọ.
7 Uju m na-eru emeela ka anya m na-ahụzi inyoghi inyoghi.+
Aka m abụọ na ụkwụ m abụọ adịghịzi otú ha dịbu.
8 Ndị ezi omume kporopụrụ anya na-ele ihe a na-emenụ,
Obi na-ajọkwa onye aka ya dị ọcha njọ n’ihi ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke.*
9 Onye ezi omume anaghị akwụsị ime ezi omume.+
Onye aka ya dị ọcha na-esikwu ike.+
A kụghasịala ihe ndị dị m n’obi m chọrọ ime.+
12 Ha na-agbanwe abalị ka ọ bụrụ ehihie,
Na-asị, ‘Ebe ọ bụ na ọchịchịrị agbaala, chi abọwala.’
13 Ọ bụrụ na mụ echere, m ga-agazi biri n’ili.*+
M ga-agbasa ihe ndina m* n’ọchịchịrị.+
14 M ga-eji oké olu gwa olulu,*+ sị, ‘Ị bụ nna m!’
Gwakwa ikpuru, sị, ‘Ị bụ nne m na nwanne m nwaanyị!’
15 Oleezi ebe olileanya m dị?+
Ònye chere na m nwere olileanya?