Abụ Mgbago.
120 M kpọkuru Jehova n’oge m na-ata ahụhụ,+
Ya aza m.+
2 Jehova, biko, napụta m n’aka ndị ụgha
Nakwa n’aka ndị ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.
3 Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ,+
Gịnị ka Chineke ga-eme gị? Oleekwa ụdị ahụhụ ọ ga-ata gị?
4 Ọ ga-eji akụ́ pịrị ọnụ+ nke onye agha
Nakwa icheku ọkụ+ nke si n’osisi brum taa gị ahụhụ.
5 Efuola m n’ihi na m biela na Mishek ka onye mbịarambịa!+
M bi n’ụlọikwuu ndị Kida kemgbe.+
6 Mụ na ndị na-achọghị udo+
Ebiteela aka.
7 Achọrọ m udo, ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu,
Ha na-ejikere ịlụso m agha.