Aịzaya
34 Mba dị iche iche, bịanụ nso ka unu nụ ihe m ga-ekwu.
Mmadụ niile, geenụ ntị.
Ụwa na ihe niile dị na ya,
Elu ala na ndị niile bi na ya, geenụ ntị.
2 Jehova na-ewesa mba niile iwe.+
Ọ na-ewesa ndị agha ha niile iwe.+
Ọ ga-ebibi ha.
Ọ ga-egbu ha.+
3 A gaghị eli ndị ha e gburu egbu eli.
Ozu ha ga na-esi ísì.+
4 Ihe niile dị n’eluigwe ga-erekasị.
A ga-apịakọta eluigwe otú e si apịakọta akwụkwọ mpịakọta.
Ihe niile dị na ya ga-akpọnwụ,
Otú akwụkwọ osisi vaịn si akpọnwụ ma dapụ
Nakwa otú mkpụrụ osisi fig si ahịkpọ ma dapụ.
5 “N’ihi na ọbara ga-ekpuchi mma agha m n’eluigwe.+
M ga-ekpe ndị Ịdọm ikpe, jiri mma agha m sụọ ha akwụ,+
N’ihi na ekpebiela m ibibi ha.
6 Mụnwa bụ́ Jehova nwere mma agha. Ọ ga-abụ ọbara ọbara.
N’ihi na Jehova ga-achụ àjà na Bọzra,
Ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’Ịdọm.+
7 A ga-egbu atụ́ otú e gburu anụ ndị ọzọ,
Gbuokwa ma obere oké ehi ma nnukwu oké ehi.
Ọbara ga-ede ala ndị Ịdọm,
Ájá dị n’ala ha ga-abụkwa abụba abụba.”
8 N’ihi na Jehova ahọrọla ụbọchị ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.+
Ọ họrọkwala afọ ọ ga-akwụ ndị mere Zayọn ihe ọjọọ ụgwọ ihe ha mere.+
Otú ọkụ si agba korota ka ala ya ga-esi na-agba ọkụ.
10 A gaghị emenyụ ya emenyụ ma n’ehihie ma n’abalị.
Anwụrụ ọkụ ya ga na-akwụgo elu ruo mgbe ebighị ebi.
Otú ọ dị mgbe e bibiri ya ka ọ ga-adịgide si n’otu ọgbọ ruokwa n’ọgbọ ọzọ.
O nweghị onye ga-esi na ya gafee ruo mgbe niile ebighị ebi.+
11 Okwolo na ebi ogwu ga-ebichi ya.
Ikwiikwii* na ugoloọma ga-ebikwa na ya.
Chineke ga-eji eriri e ji atụ̀ ihe na nke e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ* tụọ ala a
Iji gosi na a ga-ebibi ya ya atọgbọrọ nkịtị.
12 E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya a ma ama a ga-echi eze.
Ndị isi ya niile agaghịzi adị.
13 Ogwu ga-eto n’ụlọ elu ndị dị n’ime ya,
Ahịhịa akụwa na ahịhịa ogwu ga-etokwa n’ebe ya ndị a rụsiri ike.
Ọ ga-aghọkwa ụlọ nkịta ọhịa+
Na ogige enyí nnụnụ.
14 Anụ ọhịa ndị bi n’ọzara ga-ezute anụ ndị na-agbọ ụja.
Ewu ọhịa* ga-akpọkwa ibe ya òkù.
N’eziokwu, nnụnụ na-efe n’abalị* ga-atụsara ahụ́ ebe ahụ, hụkwa ebe ọ ga-ezu ike.
15 Agwọ ga-akpa akwụ́, yiekwa àkwá ebe ahụ.
Ọ ga-abụ àkwá ndị ahụ, chịkọtakwa ụmụ ya n’okpuru ya.
N’eziokwu, égbé ga-ezukọtakwa ebe ahụ, oké na nne, oké na nne.
16 Chọọnụ n’akwụkwọ Jehova ma gụpụta ya.
E nweghị otu n’ime ha a ga-achọ achọ.
O nweghịkwa nke na-agaghị enwe oké na nne,
N’ihi na ọ bụ Jehova ji ọnụ ya nye iwu ka ọ dịrị otú ahụ.
Ọ bụkwa mmụọ ya chịkọtara ha.
17 Ọ bụ ya feere ha nza.
Ọ bụkwa ya na-ekwu ebe nke ọ bụla n’ime ha ga-anọ.*
Ha ga-ebichi ebe ndị ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ha ga-ebikwa na ha n’ọgbọ niile.