Ezikiel
12 Jehova gwara m ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ gị na ndị na-enupụ isi bi. Ha nwere anya e ji ahụ ụzọ ma ha anaghị ahụ ụzọ. Ha nwere ntị e ji anụ ihe ma ha anaghị anụ ihe,+ n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi.+ 3 Ma gịnwa, bụ́ nwa nke mmadụ, kwakọta ngwongwo ị ga-ebu pụọ ka onye a dọọrọ n’agha. Ị kwakọtachaa ya, ka ha na-ele ihe ị na-eme, buru ya pụọ n’ehihie ka onye a dọọrọ n’agha. Ka ha nọkwa na-ele ihe ị na-eme, si n’obodo gị kwapụ kwaga obodo ọzọ ka onye a dọọrọ n’agha. Ha nwere ike ịghọta ihe ị na-eme, ọ bụ eziokwu na ha bụ ndị nnupụisi. 4 Ka ha na-ele ihe ị na-eme, kwapụta ngwongwo gị n’ehihie ka onye a dọọrọ n’agha. Ka ha na-elekwa ihe ị na-eme, pụọ n’uhuruchi ka onye a dọọrọ n’agha.+
5 “Ka ha na-ele ihe ị na-eme, kpọpuo ahụ́ ụlọ gị, ma si ebe ahụ bufee ngwongwo gị.+ 6 Ka ha na-ele gị, buru ngwongwo ndị ahụ n’ubu gị pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Kpuchie ihu gị ka ị ghara ịhụ ala anya, n’ihi na m chọrọ iji gị gosi ndị Izrel ihe na-aga ime.”+
7 M mere nnọọ ihe a gwara m. M bupụtara ngwongwo m n’ehihie ka onye a dọọrọ n’agha. M ji aka gwupuo mgbidi n’anyasị, burukwa ngwongwo m pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Ebu m ya n’ubu m pụọ n’ihu ha.
8 N’ụtụtụ, Jehova gwara m ọzọ, sị: 9 “Nwa nke mmadụ, ọ̀ bụ na ndị Izrel, bụ́ ndị nnupụisi, ajụghị gị, sị, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 10 Gwa ha, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Ihe a e kwuru bụ gbasara otu onyeisi+ nọ na Jeruselem na ndị Izrel niile nọ n’obodo a.”’
11 “Kwuo na ha ga-eji gị mara ihe ga-eme ha.+ Gwakwa ha na ihe a i mere ka a ga-eme ha. A ga-adọrọ ha n’agha, ha agaa biri n’ala ọzọ.+ 12 Onyeisi ha ga-eburu ngwongwo ya n’ubu pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Ọ ga-akpọpu ahụ́ ụlọ ya ma si na ya buru ngwongwo ya pụọ.+ Ọ ga-ekpuchi ihu ya ka ọ ghara ịhụ ala. 13 M ga-eji ụgbụ m ji achụ nta kpuchie ya, jirikwa ya jide ya.+ M ga-akpụrụ ya bịa Babịlọn, bụ́ ala ndị Kaldia, ma ọ gaghị ahụ ala ahụ. Ọ ga-anwụkwa ebe ahụ.+ 14 M ga-achụsasị ndị niile na-anọ ya nso, ma ndị na-enyere ya aka ma ndị agha ya.+ M ga-amịrị mma agha chụọ ha ọsọ.+ 15 M chụgachaa ha ná mba dị iche iche, meekwa ka ha gbasasịa n’ala dị iche iche, ha ga-amara na m bụ Jehova. 16 Ma m ga-eme ka mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ghara igbu ụfọdụ n’ime ha, ka ha wee kọọrọ mba dị iche iche ha ga-aga biri arụ ndị ha kpara. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.”
17 Jehova gwakwara m, sị: 18 “Nwa nke mmadụ, ị ga na-ama jijiji mgbe ị na-eri nri. Ụjọ ga na-atụ gị, obi ekorokwa gị n’elu mgbe ị na-aṅụ mmiri.+ 19 Ị ga-asịkwa ndị obodo a, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru gbasara ndị bi na Jeruselem, n’ala Izrel, sị: “Obi agaghị na-eru ha ala ka ha na-eri nri ha, ụjọ ga na-atụkwa ha ka ha na-aṅụ mmiri ha, n’ihi na ala ha ga-atọgbọrọ nkịtị+ maka tigbuo zọgbuo ndị niile bi na ya na-eme.+ 20 A ga-ala obodo ndị e bi ebi n’iyi. Ala a ga-atọgbọrọkwa nkịtị.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.”’”+
21 Jehova gwara m ọzọ, sị: 22 “Nwa nke mmadụ, gịnị ka ihe a unu na-ekwu n’ala Izrel pụtara?* Unu na-asị, ‘Oge agawala. E nweghịkwa uru ọhụụ niile bara.’+ 23 N’ihi ya, gwa ha, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “M ga-eme ka ha kwụsị ihe a ha na-ekwu. Ha agaghịzi na-ekwu ihe a n’Izrel.”’ Gwakwa ha, sị, ‘Oge eruola,+ ihe niile a hụrụ n’ọhụụ ga-emezucha.’ 24 N’ihi na a gaghịzi enwe ndị na-ahụ ọhụụ ụgha na ndị na-agba afa, bụ́ ndị na-eduhie ndị mmadụ,* n’Izrel.+ 25 ‘“Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-ekwu okwu. Ihe ọ bụla m kwuru ga-emekwa n’egbughị oge ọ bụla ọzọ.+ N’oge ununwa bụ́ ndị nnupụisi nọ ndụ,+ m ga-ekwu ihe m ga-eme, meekwa ya.”’”
26 Jehova gwakwara m ọzọ, sị: 27 “Nwa nke mmadụ, ndị* Izrel na-asị, ‘Ọhụụ ọ na-ahụ ka ga-anọ ọdụ tupu ya emezuo. Mgbe amụma ọ na-ebu ga-emezu ka dịkwa anya.’+ 28 N’ihi ya, sị ha, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: “‘Ihe ọ bụla m kwuru ga-emezu n’egbughị oge. M ga-eme ihe ọ bụla m kwuru.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”’”