27 Ụmụ okoro ahụ wee too, Isọ wee bụrụ nwoke maara otú e si achụ nta,+ nwoke na-aga n’ọhịa, ma Jekọb bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+ onye bi n’ụlọikwuu.+
9 O ji okwukwe biri dị ka ọbịa n’ala nkwa ahụ dị ka à ga-asị na o bi n’ala ọzọ,+ biekwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik+ na Jekọb,+ bụ́ ndị ha na ya na-eketa otu nkwa ahụ.+