Ndị Hibru
11 Okwukwe+ bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha+ ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya+ dị adị n’ezie. 2 N’ihi na e si na nke a gbaa àmà banyere ndị oge gboo.+
3 Ọ bụ okwukwe ka anyị ji ghọta na e doro usoro ihe dị iche iche+ n’usoro site n’okwu Chineke,+ nke mere na ihe a na-ahụ anya si n’ihe na-apụtaghị ìhè.+
4 Ọ bụ okwukwe ka Ebel ji chụọrọ Chineke àjà ka nke Ken mma,+ e sitere n’okwukwe ahụ gbaa àmà banyere ya na ọ bụ onye ezi omume, ebe Chineke na-agba àmà+ banyere onyinye ya; o sitekwara na ya na-ekwu okwu,+ ọ bụ ezie na ọ nwụrụ anwụ.
5 Ọ bụ okwukwe Inọk+ mere e ji wega ya ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ, ọ dịghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke wegara ya ebe ọzọ;+ n’ihi na tupu e wega ya ebe ọzọ, a gbara àmà banyere ya na o mere ihe dị Chineke ezi mma.+ 6 Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị,+ ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma,+ n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị,+ na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike+ ụgwọ ọrụ.+
7 Mgbe Chineke dọsịrị Noa+ aka ná ntị banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya,+ ọ bụ okwukwe ka o ji gosi egwu Chineke ma rụọ ụgbọ+ maka ịzọpụta ezinụlọ ya; o sitekwara n’okwukwe a maa ụwa ikpe,+ o wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ+ nke dị dị ka okwukwe si dị.
8 Mgbe a kpọrọ Ebreham,+ o ji okwukwe rube isi wee jee n’ebe a kara aka na ọ ga-enweta dị ka ihe nketa; o wee pụọ, ọ bụ ezie na ọ maghị ebe ọ na-eje.+ 9 O ji okwukwe biri dị ka ọbịa n’ala nkwa ahụ dị ka à ga-asị na o bi n’ala ọzọ,+ biekwa n’ụlọikwuu,+ ya na Aịzik+ na Jekọb,+ bụ́ ndị ha na ya na-eketa otu nkwa ahụ.+ 10 N’ihi na ọ nọ na-echere obodo ahụ+ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.+
11 Ọ bụkwa okwukwe ka Sera+ ji nweta ike ịtụrụ ime mkpụrụ nke afọ, ọbụna mgbe ọ gafere oge ịmụ nwa,+ ebe o weere onye ahụ nke kwere nkwa n’onye kwesịrị ntụkwasị obi.+ 12 N’ihi ya, sitekwa n’aka otu nwoke,+ onye dị ka onye nwụrụ anwụ,+ a mụtara ụmụ dị nnọọ ọtụtụ ka kpakpando dị n’eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.+
13 Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe,+ ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ,+ ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya+ ma nabata ha ma kwusaa n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.+ 14 N’ihi na ndị na-ekwu ihe ndị dị otú ahụ na-agba akaebe na ha na-achọsi ebe bụ́ nke ha ike.+ 15 Ma a sị na ha nọ na-echeta ebe ahụ ha si pụọ,+ ha gaara enwe ohere ịlaghachi.+ 16 Ma, ugbu a, ha na-achụso ebe ka mma, ya bụ, nke eluigwe.+ N’ihi ya, ihere ha adịghị eme Chineke, ka ha kpọkuo ya dị ka Chineke ha,+ n’ihi na ọ kwadebeworo ha otu obodo.+
17 Mgbe e lere Ebreham ule,+ ọ bụ okwukwe ka o ji chọọ ịchụ Aịzik n’àjà, nwoke ahụ nke jikwa ọṅụ nata nkwa ndị ahụ nwara ịchụ ọkpara ọ mụrụ naanị ya+ n’àjà, 18 ọ bụ ezie na a gwara ya, sị: “Ihe a ga-akpọ ‘mkpụrụ gị’ ga-esi n’Aịzik.”+ 19 Ma o weere ya na Chineke nwere ike ịkpọlite ya ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ;+ sitekwa n’ebe ahụ ọ natakwara ya n’ụzọ ihe atụ.+
20 Ọ bụ okwukwe ka Aịzik ji gọzie Jekọb+ na Isọ+ banyere ihe ndị gaje ịbịa.
21 Mgbe Jekọb na-aga ịnwụ,+ ọ bụ okwukwe ka o ji gọzie nke ọ bụla n’ime ụmụ ndị ikom Josef+ ma dabere n’isi mkpara ya kpọọ isiala.+
22 Mgbe ọnwụ Josef na-eru nso, ọ bụ okwukwe ka o ji kwuo banyere ọpụpụ+ nke ụmụ Izrel; o nyekwara iwu banyere ọkpụkpụ ya.+
23 Ọ bụ okwukwe ka ndị mụrụ Mozis ji zoo ya ruo ọnwa atọ mgbe a mụsịrị ya,+ n’ihi na ha hụrụ na nwatakịrị ahụ mara mma,+ ha atụghịkwa iwu+ eze nyere egwu. 24 Mgbe Mozis tolitere,+ ọ bụ okwukwe ka o ji jụ ka a kpọọ ya nwa ada Fero,+ 25 ọ họọrọ ka e megbukọta ya na ndị Chineke kama ịnụ ụtọ mmehie ruo nwa oge, 26 n’ihi na o weere nkọcha+ nke Kraịst dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt; n’ihi na o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.+ 27 Ọ bụ okwukwe ka o ji hapụ Ijipt,+ ma ọ tụghị iwe eze egwu,+ n’ihi na o guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.+ 28 Ọ bụ okwukwe ka o ji mee ememme ngabiga,+ fesakwa ọbara n’awara ụzọ,+ ka onye mbibi ahụ wee ghara ibitụ ndị ha e bu ụzọ mụọ aka.+
29 Ọ bụ okwukwe ka ha ji gafee Oké Osimiri Uhie dị ka à ga-asị na ọ bụ n’ala akọrọ,+ ma mgbe ndị Ijipt nwara ịgafe ya, mmiri riri ha.+
30 Ọ bụ okwukwe ka e ji mee ka mgbidi Jeriko daa mgbe a gbasịrị ya gburugburu ruo ụbọchị asaa.+ 31 Ọ bụ okwukwe Rehab+ bụ́ nwaanyị akwụna mere ka ọ ghara iso ndị nupụrụ isi laa n’iyi, n’ihi na ọ nabatara ndị nledo ahụ n’udo.+
32 Gịnị ọzọkwa ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ,+ 33 bụ́ ndị sitere n’okwukwe merie alaeze dị iche iche n’agha,+ mezuo ezi omume,+ nweta nkwa dị iche iche,+ mechie ọnụ ọdụm,+ 34 bụrụ ndị ọkụ na-emeghị ihe ọ bụla,+ gbanahụ ihu mma agha,+ bụrụ ndị e mere ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike,+ bụrụ ndị dike n’agha,+ mee ka ụsụụ ndị agha ndị mba ọzọ gbaa ọsọ.+ 35 Ndị inyom nwetaghachiri ndị ha nwụrụ anwụ site ná mbilite n’ọnwụ;+ ma e mekpọrọ ndị ọzọ ọnụ n’ihi na ha ekweghị ka e jiri ihe mgbapụta ọ bụla tọhapụ ha, ka ha wee nweta mbilite n’ọnwụ ka mma. 36 Ee, ndị ọzọ natara ọnwụnwa nke ha site n’ịkwa emo na ịpịa ihe, ọbụna site n’agbụ+ na ụlọ mkpọrọ.+ 37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa,+ a kwọbiri ha akwọbi, e ji mma agha gbuo ha,+ ha yi akpụkpọ atụrụ+ na akpụkpọ ewu na-agagharị, ka ha nọ n’ụkọ,+ ná mkpagbu,+ ka a na-emeso ha mmeso ọjọọ;+ 38 ha ekwesịghịkwa ụwa. Ha wagharịrị n’ọzara na n’ugwu na n’ọgba+ nakwa n’ọnụ ndị dị n’elu ala.
39 Ma ndị a niile, ọ bụ ezie na a gbara àmà banyere ha site n’okwukwe ha, ha enwetaghị mmezu nke nkwa ahụ,+ 40 ebe ọ bụ na Chineke bu ụzọ hụ ihe ka mma+ maka anyị,+ ka e wee ghara ime ka ha+ zuo okè+ n’agụnyeghị anyị.+