19 Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị.+ N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.”+
5 N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ;+ ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị,+ ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ, n’ihi na e chefuwo ihe niile a pụrụ icheta banyere ha.+
4 Lee! Mkpụrụ obi niile, ọ bụ m nwe ha.+ Ma mkpụrụ obi+ nke nna ma mkpụrụ obi nke nwa, ọ bụ m nwe ha.+ Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie,+ ọ bụ ya ga-anwụ.+