4 Ma, lee! Jehova gwara ya okwu ndị a, sị: “Nwoke a agaghị anọchi gị dị ka onye nketa, kama ọ bụ onye ga-esi n’ahụ́ gị pụta ga-anọchi gị dị ka onye nketa.”+
30 Otú o sina dị, gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? “Chụpụ nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi na nwa ya, n’ihi na nwa nke nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi agaghị eso nwa nke nwaanyị ahụ nweere onwe ya bụrụ onye nketa ma ọlị.”+