16 ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+
12 Jehova wee sị m, ‘Bilie, si n’ebe a gbadaa ọsọ ọsọ, n’ihi na ndị gị bụ́ ndị ị kpọpụtara n’Ijipt emewo omume na-eweta mbibi.+ Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha iwu ka ha soro. Ha emeworo onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ.’+
19 Ọ na-erukwa na mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-atụgharị mewe omume na-eweta mbibi karịa otú ndị nna ha mere site n’isoro chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na àgwà isi ike ha.+