3Mozis wee ghọọ onye na-azụ ìgwè ewu na atụrụ Jetro,+ onye nchụàjà Midian, bụ́ nna nwunye ya.+ Ka o du ìgwè ewu na atụrụ ahụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa ahụ, o mesịrị bịarute n’ugwu nke ezi Chineke,+ na Horeb.+
18 Mmadụ niile nọ na-anụ ụda égbè eluigwe na ụda opi ahụ, na-ahụkwa àmụ̀mà na-egbunụ nakwa ka ugwu ahụ na-akwụ anwụrụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha mara jijiji ma guzoro n’ebe dịtụ anya.+
8 O wee bilie rie ihe, ṅụọkwa mmiri, o wee jiri ike ihe ahụ o riri na-aga ruo ụbọchị iri anọ,+ ehihie na abalị, ruo n’ugwu nke ezi Chineke, bụ́ Horeb.+