15 E mesịa, Mozis tụgharịrị si n’ugwu ahụ gbadata,+ o bukwa mbadamba nkume abụọ nke Ihe Àmà ahụ,+ bụ́ mbadamba nkume ndị e dere ihe ihu na azụ. E dere ha ihe ihu na azụ.
3 N’ihi na e gosiwo na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi dere,+ nke a na-ejighị ink dee, kama e ji mmụọ+ nke Chineke dị ndụ dee ya, ọ bụghị ná mbadamba nkume,+ kama ná mbadamba anụ ahụ́, ya bụ, n’obi.+
4 Ihe dị n’ebe a bụ ihe e ji etinye ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, nke e ji ọlaedo mee,+ na igbe ọgbụgba ndụ+ nke e ji ọlaedo machie gburugburu ya,+ nke ite ọlaedo mana dị n’ime ya,+ tinyere mkpanaka Erọn nke wara okooko+ na mbadamba nkume+ nke ọgbụgba ndụ ahụ;