6 Jehova wee gwa ya ọzọ, sị: “Biko, tinye aka gị n’obi uwe gị.” O wee tinye aka ya n’obi uwe ya. Mgbe o wepụtara ya, lee, e tiri ya ekpenta n’aka, o wee na-acha ezigbo ọcha!+
9 Ma ọ ga-eru na ọ bụrụ na ha ekwereghị ọbụna ihe ịrịba ama abụọ ndị a wee ghara ige ntị n’olu gị,+ mgbe ahụ ị ga-aga kute mmiri n’Osimiri Naịl ma wụsa ya n’ala akọrọ; mmiri ahụ ị ga-ekute n’Osimiri Naịl ga-aghọ ọbara, ee, ọ ga-aghọ ọbara n’ala akọrọ.”+