2 Jehova wee gwa Mozis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ákwà mgbochi ahụ,+ n’ihu ihe mkpuchi e ji kpuchie Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ;+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu ihe mkpuchi ahụ.+
14 “Ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi+ ahụ ma jiri mkpịsị aka ya fesa ya n’ihu ihe mkpuchi ahụ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ, ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa+ ọbara ahụ ugboro asaa n’ihu ihe mkpuchi ahụ.+
11 Devid wee nye Sọlọmọn nwa ya ụkpụrụ+ nke ihe owuwu ụzọ mbata+ na nke ụlọ ya dị iche iche nakwa ụlọ nkwakọba ihe ya+ na ọnụ ụlọ ya ndị ga-adị n’elu*+ na ọnụ ụlọ ime ya ndị ga-agba ọchịchịrị na ụlọ a ga-adọba ihe mkpuchi mmehie;+