Ọpụpụ 14:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Mmụọ ozi+ nke ezi Chineke, bụ́ onye na-ebutere ndị Izrel ụzọ, pụrụ gaa n’azụ ha, ogidi ígwé ojii ahụ sikwa n’ihu ha pụọ wee guzoro n’azụ ha.+ Ọnụ Ọgụgụ 9:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 N’ụbọchị e wuru ụlọikwuu ahụ,+ ígwé ojii kpuchiri ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu Ihe Àmà,+ ma n’anyasị ihe yiri ọkụ+ na-akwụrụ n’elu ụlọikwuu ahụ ruo ụtụtụ. Diuterọnọmi 1:33 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 33 bụ́ onye na-ebutere unu ụzọ iji ledooro unu ebe unu ga-ama ụlọikwuu,+ onye ji ọkụ na-ebutere unu ụzọ iji mee ka unu na-ahụ ụzọ unu kwesịrị iso n’abalị, jirikwa ígwé ojii na-ebutere unu ụzọ n’ehihie.+ Nehemaya 9:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ọ bụkwa ogidi ígwé ojii ka i ji duo ha n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị,+ inye ha ìhè+ n’ụzọ ha kwesịrị iso. Abụ Ọma 99:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ọ nọ na-agwa ha okwu n’ogidi ígwé ojii.+Ha debere ihe ncheta ya nakwa ụkpụrụ o nyere ha.+
19 Mmụọ ozi+ nke ezi Chineke, bụ́ onye na-ebutere ndị Izrel ụzọ, pụrụ gaa n’azụ ha, ogidi ígwé ojii ahụ sikwa n’ihu ha pụọ wee guzoro n’azụ ha.+
15 N’ụbọchị e wuru ụlọikwuu ahụ,+ ígwé ojii kpuchiri ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu Ihe Àmà,+ ma n’anyasị ihe yiri ọkụ+ na-akwụrụ n’elu ụlọikwuu ahụ ruo ụtụtụ.
33 bụ́ onye na-ebutere unu ụzọ iji ledooro unu ebe unu ga-ama ụlọikwuu,+ onye ji ọkụ na-ebutere unu ụzọ iji mee ka unu na-ahụ ụzọ unu kwesịrị iso n’abalị, jirikwa ígwé ojii na-ebutere unu ụzọ n’ehihie.+
12 Ọ bụkwa ogidi ígwé ojii ka i ji duo ha n’ehihie,+ jirikwa ogidi ọkụ duo ha n’abalị,+ inye ha ìhè+ n’ụzọ ha kwesịrị iso.