Ọpụpụ 13:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga,+ iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.+ Ọnụ Ọgụgụ 16:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Mgbe Kora kpọkọtara nzukọ+ ahụ dum imegide ha n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebube Jehova pụtara ìhè n’ihu nzukọ ahụ dum.+ 1 Ndị Eze 8:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ndị nchụàjà+ enweghịkwa ike iguzo jee ozi+ ha n’ihi ígwé ojii ahụ, n’ihi na ebube+ Jehova jupụtara n’ụlọ Jehova.+ Matiu 17:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, lee! otu olu si n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m;+ geenụ ya ntị.”+
21 Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga,+ iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.+
19 Mgbe Kora kpọkọtara nzukọ+ ahụ dum imegide ha n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebube Jehova pụtara ìhè n’ihu nzukọ ahụ dum.+
11 Ndị nchụàjà+ enweghịkwa ike iguzo jee ozi+ ha n’ihi ígwé ojii ahụ, n’ihi na ebube+ Jehova jupụtara n’ụlọ Jehova.+
5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, lee! otu olu si n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m;+ geenụ ya ntị.”+