26“‘Unu emerela onwe unu chi na-abaghị uru,+ unu eguzobekwarala onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị+ ma ọ bụ ogidi nsọ, unu edebela nkume a tụrụ ihe oyiyi na ya+ n’ala unu ka unu na-akpọ isiala n’ihu ya;+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.
16 ka unu wee ghara ime omume na-eweta mbibi,+ gharakwa imere onwe unu ihe oyiyi a pịrị apị, ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla, ihe yiri nwoke ma ọ bụ nwaanyị,+
8 “‘Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị,+ ọdịdị+ ọ bụla nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa.
29 “Ya mere, ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Chineke mụrụ,+ anyị ekwesịghị iche na Chineke+ yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ.+
20 Ma ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ a na-ejighị ihe otiti ndị a gbuo echegharịghị n’ihe ha ji aka ha na-arụ,+ ka ha wee ghara ife ndị mmụọ ọjọọ+ na arụsị e ji ọlaedo na ọlaọcha+ na ọla kọpa na nkume na osisi mee, bụ́ ndị na-apụghị ịhụ ụzọ ma ọ bụ ịnụ ihe ma ọ bụ ije ije;+